< Aịzaya 5 >

1 Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya, abụ banyere ubi vaịnị ya. Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala.
אשירה נא לידידי שירת דודי לכרמו כרם היה לידידי בקרן בן שמן׃
2 O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya, werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya. O wuru ụlọ nche nʼetiti ya, sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya. Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi. Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị.
ויעזקהו ויסקלהו ויטעהו שרק ויבן מגדל בתוכו וגם יקב חצב בו ויקו לעשות ענבים ויעש באשים׃
3 “Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere. Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m.
ועתה יושב ירושלם ואיש יהודה שפטו נא ביני ובין כרמי׃
4 Olee ihe ọzọ m gaara emere ya karịa ihe m mere? Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ?
מה לעשות עוד לכרמי ולא עשיתי בו מדוע קויתי לעשות ענבים ויעש באשים׃
5 Ugbu a, lee, ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a. Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya, hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri. Aga m etida mgbidi ya hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ.
ועתה אודיעה נא אתכם את אשר אני עשה לכרמי הסר משוכתו והיה לבער פרץ גדרו והיה למרמס׃
6 Agaghị m akwachakwa ya ọzọ. Agakwaghị m egwuru ya ala, aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya. Aga m enyekwa igwe ojii iwu ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.”
ואשיתהו בתה לא יזמר ולא יעדר ועלה שמיר ושית ועל העבים אצוה מהמטיר עליו מטר׃
7 Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ mba Izrel na ndị Juda, ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ. Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara. O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu.
כי כרם יהוה צבאות בית ישראל ואיש יהודה נטע שעשועיו ויקו למשפט והנה משפח לצדקה והנה צעקה׃
8 Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi, unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu, ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa.
הוי מגיעי בית בבית שדה בשדה יקריבו עד אפס מקום והושבתם לבדכם בקרב הארץ׃
9 Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị, “Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu, ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa.
באזני יהוה צבאות אם לא בתים רבים לשמה יהיו גדלים וטובים מאין יושב׃
10 Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii, ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”
כי עשרת צמדי כרם יעשו בת אחת וזרע חמר יעשה איפה׃
11 Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke.
הוי משכימי בבקר שכר ירדפו מאחרי בנשף יין ידליקם׃
12 Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.
והיה כנור ונבל תף וחליל ויין משתיהם ואת פעל יהוה לא יביטו ומעשה ידיו לא ראו׃
13 Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.
לכן גלה עמי מבלי דעת וכבודו מתי רעב והמונו צחה צמא׃
14 Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. (Sheol h7585)
לכן הרחיבה שאול נפשה ופערה פיה לבלי חק וירד הדרה והמונה ושאונה ועלז בה׃ (Sheol h7585)
15 Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu, na ndị dị ala, ndị mpako ka a ga-eweda nʼala.
וישח אדם וישפל איש ועיני גבהים תשפלנה׃
16 Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya, Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.
ויגבה יהוה צבאות במשפט והאל הקדוש נקדש בצדקה׃
17 Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ, ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ.
ורעו כבשים כדברם וחרבות מחים גרים יאכלו׃
18 Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha; ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala.
הוי משכי העון בחבלי השוא וכעבות העגלה חטאה׃
19 Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa; ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ, ka anyị hụ ya. Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel, ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè, ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.”
האמרים ימהר יחישה מעשהו למען נראה ותקרב ותבואה עצת קדוש ישראל ונדעה׃
20 Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ, ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu.
הוי האמרים לרע טוב ולטוב רע שמים חשך לאור ואור לחשך שמים מר למתוק ומתוק למר׃
21 Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.
הוי חכמים בעיניהם ונגד פניהם נבנים׃
22 Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,
הוי גבורים לשתות יין ואנשי חיל למסך שכר׃
23 ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị, ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ.
מצדיקי רשע עקב שחד וצדקת צדיקים יסירו ממנו׃
24 Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka, na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu, otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu; nʼihi na ha ajụla iwu niile Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nyere, lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel.
לכן כאכל קש לשון אש וחשש להבה ירפה שרשם כמק יהיה ופרחם כאבק יעלה כי מאסו את תורת יהוה צבאות ואת אמרת קדוש ישראל נאצו׃
25 Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya; o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala. Ugwu niile ga-ama jijiji, ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
על כן חרה אף יהוה בעמו ויט ידו עליו ויכהו וירגזו ההרים ותהי נבלתם כסוחה בקרב חוצות בכל זאת לא שב אפו ועוד ידו נטויה׃
26 Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya, ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa. Ma lee, ka ha na-abịa, ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.
ונשא נס לגוים מרחוק ושרק לו מקצה הארץ והנה מהרה קל יבוא׃
27 Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha, ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra, ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.
אין עיף ואין כושל בו לא ינום ולא יישן ולא נפתח אזור חלציו ולא נתק שרוך נעליו׃
28 Àkụ ha niile dị nkọ, ekweela ụta ha niile, ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ, ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe.
אשר חציו שנונים וכל קשתתיו דרכות פרסות סוסיו כצר נחשבו וגלגליו כסופה׃
29 Ha na-ebigbọ dịka ọdụm, ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm; ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu. Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere.
שאגה לו כלביא ושאג ככפירים וינהם ויאחז טרף ויפליט ואין מציל׃
30 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu ya dịka mbigbọ nke oke osimiri. A sịkwa na mmadụ elegide ala ahụ anya, ọ ga-ahụ na ọchịchịrị na ihe mgbu, ọ bụladị anyanwụ ka igwe ojii ga-eme ka ọ gbaa ọchịchịrị.
וינהם עליו ביום ההוא כנהמת ים ונבט לארץ והנה חשך צר ואור חשך בעריפיה׃

< Aịzaya 5 >