< Aịzaya 23 >

1 Nke a bụ amụma megide Taịa: Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish nʼihi na e bibiela Taịa, ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata. Ozi erutela ha aka site nʼobodo Saiprọs.
Tamko kuhusu Tiro, Ombolezeni, enyi kondoo wa Tarishishi;
2 Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu. Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn, ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa.
maana hakuna nyumba wala bandari; kutoka katika nchi ya Kyprusi wamefunuliwa hilo.
3 Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu, ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa, owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa, ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche.
Na juu ya maji mengi ni nafaka za shiho, mazao ya Nile, na uzalishaji wao; mlikuwa wafanya biashara wa kimataifa.
4 Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri, nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu; “Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa; o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.”
Kuwa na aibu, Sidoni; maana bahari imenena, mkuu wa bahari. Amesema, ''Sijafanya kazi wala kuzaa wala kukuza vijana wadogo wala kuwalea mabinti.
5 Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt, ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa.
''Pale taarifa ilipofika Misri, watauzunika kuhusu Tire.
6 Gabiganụ ruo Tashish tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu.
Katiza juu ya Tarshishi; Ole wenu, enyi wakazi wa pwani.
7 Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile? Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga? Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ?
Je hili limeshawahi kuwatokea, mji wenye furaha, ambao kwa asili yake umetoka katika kipindi cha kale. Ambapo miguu yake imempeleka mbali kuishi kwenye maeneo ya ugenini?
8 Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa, bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze, mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze, nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa?
Ni nani aliyepanga haya dhidi ya Tire, mtoa mataji, ambao wafanyabiashara wake ni wakuu, ambao wafanyabiashara ni watu wa kuheshimika duniani?
9 Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya, nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile, na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị.
Yahwe wa majeshi amepanga kuharibu kiburi chake na utukufu wake, na kuwahaibisha waheshimiwa wote wa dunia.
10 Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl, unu ụmụada Tashish, nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri.
Lima katika shamba lako, kama mtu alimavyo Nile, ewe binti Tarishishi. Maana hakuna tena eneo la soko huko Tite.
11 Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri mee ka alaeze ha niile maa jijiji. O nyela iwu banyere Fonisia ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike.
Yahwe amenyoosha mkono wake juu ya bahari, na ametingisha falme; na amepewa amri juu ya Fonensia, kuziharibu ngome.
12 Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ, gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu. “Bilie, gafee garuo Saiprọs, ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.”
Amesema, ''Hamtofurahia tena, binti bikira wa Sidoni uliyenyanyasika; nyanyuka, pitia Kyprusi; lakini wala hapatakuwa na punziko.''
13 Lee anya nʼala ndị Kaldịa, ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ! Ndị Asịrịa mere ya ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara. Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike, mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe.
Tazama nchi ya Wakaldayo. Hawa watu wamesitisha kuishi pale; Waasiria wamelifanya jangwa la wanyama pori. Wameizingira minara; wameliharibu eneo lao; wamelifanya kuwa chungu cha uharibifu.
14 Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri, nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.
Omboleza ewe kondoo wa Tarishishi; maana kimbilio lako limeharibiwa.
15 A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a:
Katika siku hiyo, Tire itasaulika kwa miaka sabini, kama siku za mfalme. Baada ya miaka sabini kuisha huko Tire kutatokea kitu kama wimbo wa malaya.
16 “Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo, gị nwanyị akwụna e chefuru echefu; kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ, ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.”
Chukua kinubi, nenda zunguka mji, mmewasahau malaya; cheza kinubi vizuri, imba nyimbo nyingi, ili uweze kukumbuka.
17 E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile.
Itatokea baada ya miaka sabini, Yahwe ataisaidia Tire, na wataanza kututafuta pesa tena kwa kufanya kazi ya umalaya, na atafanya utumishi wake katika falme za dunia.
18 Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.
Faida yake na mapato yake yatatengwa kwa ajili ya Yahwe. Hayatahifadhiwa wala hayatakuwa na hazina, maana faida yao watapewa wale wanoishi mdhebauni mwa Yahwe na yatatumika kuwasambazia chakula cha kutosha na kupata mavazi yenye viwango bora.

< Aịzaya 23 >