< Hosiya 2 >
1 “Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’
あなたがたの兄弟に向かっては「アンミ(わが民)」と言い、あなたがたの姉妹に向かっては「ルハマ(あわれまれる者)」と言え。
2 “Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya, nʼihi na ọ bụghị nwunye m, mụ onwe m abụkwaghị di ya. Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya, ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.
「あなたがたの母とあげつらえ、あげつらえ彼女はわたしの妻ではない、わたしは彼女の夫ではないそして彼女にその顔から淫行を除かせ、その乳ぶさの間から姦淫を除かせよ。
3 Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.
そうでなければ、わたしは彼女の着物をはいで裸にし、その生れ出た日のようにし、また荒野のようにし、かわききった地のようにし、かわきによって彼女を殺す。
4 Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.
わたしはその子らをあわれまない、彼らは淫行の子らだからである。
5 Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, ndị na-enye m nri na mmiri, ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’
彼らの母は淫行をなし、彼らをはらんだ彼女は恥ずべきことを行った。彼女は言った、『わたしはわが恋人たちについて行こう。彼らはパンと水と羊の毛と麻と油と飲み物とを、わたしに与える者である』と。
6 Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu; aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.
それゆえ、わたしはいばらで彼女の道をふさぎ、かきをたてて、彼女にはその道がわからないようにする。
7 Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha. Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha. Mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m, nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’
彼女はその恋人たちのあとを慕って行く、しかし彼らに追いつくことはない。彼らを尋ねる、しかし見いだすことはない。そこで彼女は言う、『わたしは行って、さきの夫に帰ろう。あの時は今よりもわたしによかったから』と。
8 Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m, na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv, na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile nke o ji na-efe Baal.
彼女に穀物と酒と油とを与えた者、またバアルのために用いた銀と金とを多く彼女に与えた者は、わたしであったことを彼女は知らなかった。
9 “Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara, na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru. Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m, nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.
それゆえ、わたしは穀物をその時になって奪い、ぶどう酒をその季節になって奪い、また彼女の裸をおおうために用いる羊の毛と麻とを奪い取る。
10 Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya, ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.
わたしは今、彼女のみだらなことをその恋人たちの目の前にあらわす。だれも彼女をわたしの手から救う者はない。
11 Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị; ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ, nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.
わたしは彼女のすべての楽しみ、すなわち祝、新月、安息日、すべての祭をやめさせる。
12 Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi, nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya; aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa, anụ ọhịa ga-eripịa ha.
わたしはまた彼女が先に『これはわたしの恋人らが、わたしに与えた報酬だ』と言った彼女のぶどうの木と、いちじくの木とを荒し、これを林とし、野の獣にこれを食わせる。
13 Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile, ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya, pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
また彼女が耳輪と宝石で身を飾り、その恋人たちを慕って行って、わたしを忘れ、香をたいて仕えたバアルの祭の日のために、わたしは彼女を罰すると主は言われる。
14 “Nʼihi nke a, aga m arara ya, duba ya nʼime ọzara, jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.
それゆえ、見よ、わたしは彼女をいざなって、荒野に導いて行き、ねんごろに彼女に語ろう。
15 Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya, gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya. Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa, nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.
その所でわたしは彼女にそのぶどう畑を与え、アコルの谷を望みの門として与える。その所で彼女は若かった日のように、エジプトの国からのぼって来た時のように、答えるであろう。
16 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.
主は言われる、その日には、あなたはわたしを『わが夫』と呼び、もはや『わがバアル』とは呼ばない。
17 Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya, ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.
わたしはもろもろのバアルの名を彼女の口から取り除き、重ねてその名をとなえることのないようにする。
18 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ, meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ, na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ. Aga m emebi ngwa agha niile, agha niile ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.
その日には、わたしはまたあなたのために野の獣、空の鳥および地の這うものと契約を結び、また弓と、つるぎと、戦争とを地から断って、あなたを安らかに伏させる。
19 Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi; aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi, nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.
またわたしは永遠にあなたとちぎりを結ぶ。すなわち正義と、公平と、いつくしみと、あわれみとをもってちぎりを結ぶ。
20 Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị. Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.
わたしは真実をもって、あなたとちぎりを結ぶ。そしてあなたは主を知るであろう。
21 “Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-azaghachi eluigwe, ha ga-azaghachi ala.
主は言われる、その日わたしは天に答え、天は地に答える。
22 Ala ga-azaghachi ọka na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv, mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril.
地は穀物と酒と油とに答え、またこれらのものはエズレルに答える。
23 Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ. Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’ M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,’ ‘Unu bụ ndị nke m,’ Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’”
わたしはわたしのために彼を地にまき、あわれまれぬ者をあわれみ、わたしの民でない者に向かって、『あなたはわたしの民である』と言い、彼は『あなたはわたしの神である』と言う」。