< Jenesis 32 >
1 Jekọb nʼonwe ya hapụrụ gawa nʼihu nʼije ya. Ndị mmụọ ozi Chineke zutere ya nʼụzọ.
雅各仍舊行路,上帝的使者遇見他。
2 Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim.
雅各看見他們就說:「這是上帝的軍兵」,於是給那地方起名叫瑪哈念。
3 Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm.
雅各打發人先往西珥地去,就是以東地,見他哥哥以掃,
4 O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a.
吩咐他們說:「你們對我主以掃說:『你的僕人雅各這樣說:我在拉班那裏寄居,直到如今。
5 Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’”
我有牛、驢、羊群、僕婢,現在打發人來報告我主,為要在你眼前蒙恩。』」
6 Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.”
所打發的人回到雅各那裏,說:「我們到了你哥哥以掃那裏,他帶着四百人,正迎着你來。」
7 Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya.
雅各就甚懼怕,而且愁煩,便把那與他同在的人口和羊群、牛群、駱駝分做兩隊,
8 O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.”
說:「以掃若來擊殺這一隊,剩下的那一隊還可以逃避。」
9 Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, Onyenwe anyị, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’
雅各說:「耶和華-我祖亞伯拉罕的上帝,我父親以撒的上帝啊,你曾對我說:『回你本地本族去,我要厚待你。』
10 Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ.
你向僕人所施的一切慈愛和誠實,我一點也不配得;我先前只拿着我的杖過這約旦河,如今我卻成了兩隊了。
11 Zọpụta m, arịọ m gị, site nʼaka nwanne m Ịsọ, nʼihi na egwu na-atụ m na ọ ga-abịa lụso m agha, lụsokwa ndị nne a na ụmụntakịrị ha agha.
求你救我脫離我哥哥以掃的手;因為我怕他來殺我,連妻子帶兒女一同殺了。
12 Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’”
你曾說:『我必定厚待你,使你的後裔如同海邊的沙,多得不可勝數。』」
13 Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ.
當夜,雅各在那裏住宿,就從他所有的物中拿禮物要送給他哥哥以掃:
14 Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ, iri mkpi abụọ, narị nne atụrụ abụọ, iri ebule abụọ
母山羊二百隻,公山羊二十隻,母綿羊二百隻,公綿羊二十隻,
15 Iri nne ịnyịnya kamel atọ na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ, oke ehi iri, iri nne ịnyịnya ibu abụọ, oke ịnyịnya ibu iri.
奶崽子的駱駝三十隻-各帶着崽子,母牛四十隻,公牛十隻,母驢二十匹,驢駒十匹;
16 O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.”
每樣各分一群,交在僕人手下,就對僕人說:「你們要在我前頭過去,使群群相離,有空閒的地方」;
17 O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’
又吩咐儘先走的說:「我哥哥以掃遇見你的時候,問你說:『你是哪家的人?要往哪裏去?你前頭這些是誰的?』
18 Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’”
你就說:『是你僕人雅各的,是送給我主以掃的禮物;他自己也在我們後邊。』」
19 Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya.
又吩咐第二、第三,和一切趕群畜的人說:「你們遇見以掃的時候也要這樣對他說;
20 Hụkwanụ na unu gwara ya sị, ‘Ohu gị Jekọb nọ nʼazụ anyị.’” Echiche ya bụ, “Aga m eji onyinye ndị a niile m na-ezipụrụ ya mee ka obi ya dajụọ, nke ọ ga-abụ mgbe mụ na ya zutere, ma eleghị anya, ọ ga-anabata m.”
並且你們要說:『你僕人雅各在我們後邊。』」因雅各心裏說:「我藉着在我前頭去的禮物解他的恨,然後再見他的面,或者他容納我。」
21 Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ.
於是禮物先過去了;那夜,雅各在隊中住宿。
22 Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha.
他夜間起來,帶着兩個妻子,兩個使女,並十一個兒子,都過了雅博渡口,
23 Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere.
先打發他們過河,又打發所有的都過去,
24 Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ.
只剩下雅各一人。有一個人來和他摔跤,直到黎明。
25 Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya.
那人見自己勝不過他,就將他的大腿窩摸了一把,雅各的大腿窩正在摔跤的時候就扭了。
26 Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.” Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.”
那人說:「天黎明了,容我去吧!」雅各說:「你不給我祝福,我就不容你去。」
27 Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ Jekọb ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Aha m bụ Jekọb.”
那人說:「你名叫甚麼?」他說:「我名叫雅各。」
28 Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.”
那人說:「你的名不要再叫雅各,要叫以色列;因為你與上帝與人較力,都得了勝。」
29 Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.” Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ.
雅各問他說:「請將你的名告訴我。」那人說:「何必問我的名?」於是在那裏給雅各祝福。
30 Jekọb kpọrọ aha ebe ahụ Peniel, nʼihi na ọ sịrị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma e chebere ndụ m.”
雅各便給那地方起名叫毗努伊勒,意思說:「我面對面見了上帝,我的性命仍得保全。」
31 Anyanwụ awaala mgbe Jekọb si Peniel gafee. Ma nʼihi ihe mere ya nʼọkpụ, ọ naghị agazikwa ije.
日頭剛出來的時候,雅各經過毗努伊勒,他的大腿就瘸了。
32 Ọ bụ ihe a mere ụmụ Izrel adịghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa. Nʼihi na ihe ahụ mere Jekọb metụtara akwara ukwu ya.
故此,以色列人不吃大腿窩的筋,直到今日,因為那人摸了雅各大腿窩的筋。