< Jenesis 11 >

1 Nʼoge ahụ, ụwa niile nwere naanị otu asụsụ, okwu niile bụkwa otu.
And the whole earth had one language, and the same words.
2 Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ.
And it came to pass as they journeyed from the east, that they found a plain in the land of Shinar, and dwelt there.
3 Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik, kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ.
And they said one to another, Come on, let us make bricks, and burn [them] thoroughly. And they had brick for stone, and they had asphalt for mortar.
4 Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.”
And they said, Come on, let us build ourselves a city and a tower, the top of which [may reach] to the heavens; and let us make ourselves a name, lest we be scattered over the face of the whole earth.
5 Onyenwe anyị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu.
And Jehovah came down to see the city and the tower which the children of men built.
6 Onyenwe anyị sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime.
And Jehovah said, Behold, the people is one, and have all one language; and this have they begun to do. And now will they be hindered in nothing that they meditate doing.
7 Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya.”
Come, let us go down, and there confound their language, that they may not understand one another's speech.
8 Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ.
And Jehovah scattered them thence over the face of the whole earth. And they left off building the city.
9 Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.
Therefore was its name called Babel; because Jehovah there confounded the language of the whole earth. And Jehovah scattered them thence over the face of the whole earth.
10 Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem. Mgbe afọ abụọ gafechara site nʼoge uju mmiri ahụ, nʼoge Shem gbara narị afọ, ọ mụtara Apakshad.
These are the generations of Shem. Shem was a hundred years old, and begot Arphaxad two years after the flood.
11 Shem dịrị ndụ, mgbe ọ mụsịrị Apakshad, narị afọ ise ọzọ, mụtakwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
And Shem lived after he had begotten Arphaxad five hundred years, and begot sons and daughters.
12 Mgbe Apakshad gbara iri afọ atọ na ise, ọ mụtara Shela.
And Arphaxad lived thirty-five years, and begot Shelah.
13 Mgbe ọ mụchara Shela, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
And Arphaxad lived after he had begotten Shelah four hundred and three years, and begot sons and daughters.
14 Shela gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ nwa ya nwoke Eba.
And Shelah lived thirty years, and begot Eber.
15 Mgbe ọ ghọrọ nna Eba, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
And Shelah lived after he had begotten Eber four hundred and three years, and begot sons and daughters.
16 Eba gbara iri afọ atọ na anọ mgbe ọ mụrụ Peleg.
And Eber lived thirty-four years, and begot Peleg.
17 Mgbe ọ ghọrọ nna Peleg, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na iri atọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
And Eber lived after he had begotten Peleg four hundred and thirty years, and begot sons and daughters.
18 Peleg gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Reu.
And Peleg lived thirty years, and begot Reu.
19 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Reu, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na itoolu ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
And Peleg lived after he had begotten Reu two hundred and nine years, and begot sons and daughters.
20 Reu gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ mụrụ Serug.
And Reu lived thirty-two years, and begot Serug.
21 Emesịa, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na asaa ọzọ, mgbe ọ mụsịrị Serug, ọ mụtakwara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
And Reu lived after he had begotten Serug two hundred and seven years, and begot sons and daughters.
22 Serug gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Nahọ.
And Serug lived thirty years, and begot Nahor.
23 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Nahọ, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
And Serug lived after he had begotten Nahor two hundred years, and begot sons and daughters.
24 Nahọ gbara iri afọ abụọ na itoolu mgbe ọ mụrụ Tera.
And Nahor lived twenty-nine years, and begot Terah.
25 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Tera, ọ dịrị ndụ narị afọ na afọ iri na itoolu ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
And Nahor lived after he had begotten Terah a hundred and nineteen years, and begot sons and daughters.
26 Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran.
And Terah lived seventy years, and begot Abram, Nahor, and Haran.
27 Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera. Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt.
And these are the generations of Terah: Terah begot Abram, Nahor, and Haran; and Haran begot Lot.
28 Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa.
And Haran died before the face of his father Terah in the land of his nativity at Ur of the Chaldeans.
29 Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska.
And Abram and Nahor took wives: the name of Abram's wife was Sarai; and the name of Nahor's wife, Milcah, a daughter of Haran, the father of Milcah and the father of Iscah.
30 Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla.
And Sarai was barren: she had no child.
31 Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran, na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ.
And Terah took Abram his son, and Lot the son of Haran his son's son, and Sarai his daughter-in-law, his son Abram's wife; and they went forth together out of Ur of the Chaldeans, to go into the land of Canaan, and came as far as Haran, and dwelt there.
32 Ọ bụ nʼobodo Haran ka Tera nọ nwụọ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise.
And the days of Terah were two hundred and five years; and Terah died in Haran.

< Jenesis 11 >