< Izikiel 8 >

1 Nʼafọ nke isii, nʼọnwa nke isii, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, mgbe mụ onwe m nọdụ ala nʼụlọ m, ndị okenye Juda na-anọdụkwa ala nʼihu m, aka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ nʼebe ahụ.
And it came to pass in the sixth year, in the sixth [month], on the fifth of the month, that [as] I sat in my house, and the elders of Judah sat before me, the hand of the Lord Jehovah fell there upon me.
2 Ahụrụ m oyiyi yiri mmadụ. Akụkụ oyiyi a nke dị site nʼụkwụ ya ruo nʼala ya na-acha dịka ọkụ, sitekwanụ nʼụkwụ ya rigoo, ọ na-egbu nnọọ amụma dịka nkume amba dị oke ọnụahịa.
And I looked, and behold, a likeness as the appearance of fire; from the appearance of his loins and downward, fire; and from his loins and upward, as the appearance of brightness, as the look of glowing brass.
3 Oyiyi a setịpụrụ ihe dịka aka mmadụ, jiri ya jide m nʼagịrị isi m. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu nʼetiti ala na mbara eluigwe. Nʼime ọhụ nke Chineke, o buuru m jee Jerusalem, nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼugwu, nʼime ogige ya, ebe arụsị ahụ na-akpasu ekworo guzo.
And he stretched forth the form of a hand, and took me by a lock of my head; and the Spirit lifted me up between the earth and the heavens, and brought me in the visions of God to Jerusalem, to the entry of the inner gate that looketh toward the north, where was the seat of the image of jealousy, which provoketh to jealousy.
4 Ma, lee, ebube Chineke Izrel jupụtara nʼebe ahụ, dị ka m si hụ ya na mbụ na ndagwurugwu.
And behold, the glory of the God of Israel was there, according to the appearance that I saw in the valley.
5 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, welie anya gị lee nʼụzọ nke ugwu.” Eweliri m anya m lee nʼụzọ ugwu, ma lee, nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ebe ịchụ aja, ahụrụ m oyiyi arụsị ekworo ka o guzo nʼakụkụ ugwu ya.
And he said unto me, Son of man, lift up now thine eyes toward the north. And I lifted up mine eyes toward the north, and behold, northward of the gate of the altar, this image of jealousy in the entry.
6 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị na-ahụ ihe ha na-eme, arụ dị egwu nke ụlọ Izrel na-eme nʼebe a, ihe ndị ga-achụpụ m nʼebe dị anya site nʼebe nsọ m? Ma ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.”
And he said unto me, Son of man, seest thou what they do? the great abominations that the house of Israel commit here, to cause [me] to go far off from my sanctuary? And yet again thou shalt see great abominations.
7 O mere ka m guzo nʼọnụ ụzọ ogige ahụ, mgbe m lere anya, ahụrụ m oghere dị nʼaja ụlọ ahụ.
And he brought me to the entry of the court, and I looked, and behold, a hole in the wall.
8 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ugbu a gwupuo aja ụlọ a.” Mgbe m gwupuru ya, ahụrụ m ọnụ ụzọ e si aba nʼebe ahụ.
And he said unto me, Son of man, dig now through the wall; and I digged through the wall, and behold, a door.
9 Ọ sịrị m, “Banye nʼime ka ị hụ ihe arụ ọjọọ niile nke ha na-eme nʼebe a.”
And he said unto me, Go in, and behold the wicked abominations that they do here.
10 Abanyere m hụ na ihe jupụtara nʼahụ ụlọ ahụ bụ naanị oyiyi e sere ese, nke ihe na-akpụ akpụ dịka agwọ dị iche iche, ngwere na anụmanụ rụrụ arụ dị iche iche, tinyekwara arụsị niile nke ụlọ Izrel na-efe.
And I went in and looked, and behold, every form of creeping thing and abominable beast, and all the idols of the house of Israel, portrayed upon the wall round about.
11 Nʼihu ihe ndị a, ka iri ndị okenye asaa nke ụlọ Izrel, ha na Jaazanaya nwa Shefan guzo nʼebe ahụ. Onye ọbụla nʼime ha ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼaka ya, anwụrụ ọkụ si nʼihe nsure ọkụ ndị a na-agbagokwa elu.
And there stood before them seventy men of the elders of the house of Israel, and in the midst of them stood Jaazaniah the son of Shaphan, with every man his censer in his hand; and a thick cloud of incense went up.
12 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụla ihe ndị okenye ụlọ Izrel na-eme nʼọchịchịrị, onye ọbụla nʼime ụlọ ya nʼihu arụsị ya? Ma ha na-asị, ‘Onyenwe anyị adịghị ahụ anyị, O sitela nʼala anyị wezuga onwe ya.’”
And he said unto me, Hast thou seen, son of man, what the elders of the house of Israel do in the dark, every one in his chambers of imagery? for they say, Jehovah seeth us not; Jehovah hath forsaken the land.
13 Ọzọ, ọ sịrị m, “Ị ga-ahụkwa oke ihe arụ karịrị ndị a ha na-eme!”
And he said unto me, Yet again thou shalt see great abominations which they do.
14 O mere ka m bịakwa nʼọnụ ụzọ ahụ dị nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ndị inyom nọ na-akwa akwa nʼihi Tamuz, chi ha.
And he brought me to the entry of the gate of Jehovah's house that was toward the north; and behold, there sat women weeping for Tammuz.
15 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ị hụla ihe ndị a, nwa nke mmadụ? Ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.”
And he said unto me, Seest thou, son of man? Thou shalt yet again see greater abominations than these.
16 O mere ka m baa nʼime ogige dị nʼime ụlọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼebe ahụ, nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼagbata ebe ịchụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, ka ihe ruru iri mmadụ abụọ na ise guzo, chee ihu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-efe anyanwụ. Ha gbakụtara ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị azụ mgbe ha na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ na-akpọ isiala nye anyanwụ.
And he brought me into the inner court of Jehovah's house, and behold, at the entry of the temple of Jehovah, between the porch and the altar, were about five and twenty men, with their backs toward the temple of Jehovah and their faces toward the east; and they worshipped the sun toward the east.
17 Ọ sịrị m, “Ị hụla nke a, nwa nke mmadụ? Ọ bụ ihe dị nta nye ụlọ Juda, bụ ime ihe arụ niile ndị a ha na-eme nʼebe a? Ha ga-ejikwa ihe ike mejupụta ala, siri otu a na-akpasu m iwe mgbe niile? Lee ka ha si nọgide na-akparị m, na-etinye alaka nʼimi ha.
And he said unto me, Seest thou, son of man? Is it a light thing to the house of Judah to commit the abominations which they commit here, that they yet fill the land with violence, and keep provoking me afresh to anger? And behold, they put the branch to their nose.
18 Nʼihi ya, aga m eme ka ha nụrụ ụfụ iwe m, ọ dịkwaghị onye m ga-ahapụ. Ọ bụrụkwa na ha anọgide na-ebe akwa nʼoke olu, agaghị m aṅa ha ntị.”
And I also will deal in fury: mine eye shall not spare, neither will I have pity; and though they cry in mine ears with a loud voice, I will not hear them.

< Izikiel 8 >