< Izikiel 40 >

1 Nʼafọ nke iri abụọ na ise nke e mere ka anyị biri na mba ọzọ, na mbido afọ ahụ, nʼụbọchị nke iri, nke ọnwa ahụ nʼafọ nke iri na anọ site na mgbe obodo ahụ dara, nʼotu ụbọchị ahụ ka aka Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ. O mere ka m bịa nʼebe ahụ.
لە ساڵی بیست و پێنجەمی ڕاپێچکردنمان، لە سەرەتای ساڵ، لە دەی مانگی یەکی ساڵی چواردەیەم لەپاش لێدانی شارەکە، لە هەمان ڕۆژ ڕۆحی یەزدان هاتە سەرم و بۆ ئەوێی بردم.
2 Nʼọhụ dị iche iche Chineke mere ka m hụ, o buuru m gaa nʼala Izrel, debe m nʼelu ugwu dị elu nke ukwu, ebe m nọ hụ ihe dịka obodo a na-ewu ọhụrụ, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu ahụ.
خودا لە چەند بینینێکیدا منی هێنایە خاکی ئیسرائیل و لەسەر کێوێکی زۆر بڵند داینام، لەلای باشوورەوە چەند تەلارێک لە شێوەی شارێکدا بوو.
3 O mere ka m bịaruo nʼebe ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwoke nke ụdịdị ya na-enwu dịka bronz ka o guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ọ na-ejide eriri akwa ọcha, na osisi e ji atụ ihe nʼaka ya.
کاتێک منی هێنایە ئەوێ، ئەوەتا پیاوێک دیمەنی وەک بڕۆنز وابوو، پەتێکی کەتان و قامیشێکی پێوانەی بە دەستەوە بوو، لەبەر دەروازەکە وەستابوو.
4 Nwoke ahụ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, lezie anya nke ọma, gekwaa ntị tinyekwa ihe niile m gaje igosi gị nʼobi, nʼihi na-akpọtara m gị nʼebe a nʼihi ka ịhụ ihe ndị a. Gwakwa ụmụ Izrel ihe niile ị hụrụ.”
پیاوەکە پێی گوتم: «ئەی کوڕی مرۆڤ، بە چاوەکانت سەیر بکە و بە گوێیەکانت ببیستە و مێشکت بخەرە سەر هەموو ئەوەی پیشانی تۆی دەدەم، چونکە لەبەر ئەوەی پیشانت بدرێت تۆ بۆ ئێرە هێنراویت. هەموو ئەوەی دەیبینیت بە بنەماڵەی ئیسرائیلی ڕابگەیەنە.»
5 Mgbe ahụ, ahụrụ m mgbidi gbara ụlọnsọ ahụ gburugburu. Ịdị ogologo nke osisi ihe ọtụtụ nke dị nʼaka nwoke ahụ, ruru mita atọ na ụma abụọ, nke ọbụla nʼime ha ruru iri sentimita ise na atọ. Ọ tụrụ mgbidi ahụ, chọpụta na ịla elu ya dị mita atọ na ọkara. Ịsa mbara ya dịkwa mita atọ na ọkara.
شوورایەکم بینی کە دەوری تەواوی پەرستگاکەی دابوو. قامیشێکی پێوانەش کە درێژییەکەی شەش باڵی درێژ بوو کە هەر باڵێک، باڵێک و چوار پەنجە بوو. جا ئەستوورایی شووراکەی پێوا کە یەک قامیش بوو و بەرزاییەکەشی یەک قامیش.
6 Emesịa, ọ gara nʼọnụ ụzọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ, rigoro nʼihe nrigo elu, tụọ ala ala ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ahụ. Obosara ya dị mita atọ na ọkara.
ئینجا هاتە لای ئەو دەروازەیەی ڕووەو ڕۆژهەڵاتە. بەسەر پێپلیکانەکانیدا سەرکەوت و بەردەروازەکەی پێوا، درێژییەکەی یەک قامیش بوو.
7 Oghere dị nʼụlọ ahụ nke bụ ebe ndị nche na-anọ dị mita atọ nʼọkara nʼobosara. Mgbidi dị nʼetiti ha dị mita abụọ na ụma asaa nʼigbidi. Ebe e si abata na mpụta ọnụ ụzọ ama nke chere ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, dị mita atọ nʼọkara nʼomimi.
قوژبنەکانی پاسەوانیش یەک قامیش درێژی بوو، یەک قامیشیش پانی، ئەستوورایی دیواری نێوان قوژبنەکانیش پێنج باڵ بوو. بەردەروازەکەش لەلای هەیوانی دەروازەکە و لە ژوورەوە یەک قامیش بوو.
8 O jikwa ihe ọtụtụ tụọ ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama,
ئینجا هەیوانی دەروازەکەی پێوا،
9 ọ dị mita anọ na ụma abụọ nʼomimi. Ogidi dị nʼakụkụ ya dị otu mita nʼigbidi. Ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ụzọ ama ya chere ihu nʼụlọnsọ ukwu.
درێژییەکەی هەشت باڵ بوو، ئەستوورایی هەر دینگەیەکیشی دوو باڵ بوو، هەیوانی دەروازەکەش ڕووەو پەرستگاکە بوو.
10 Nʼime ọnụ ụzọ ama nke ọwụwa anyanwụ, e nwere oghere atọ dị nʼakụkụ ọbụla, oghere atọ ndị ahụ ha nʼotu. Ihu akụkụ aja ya niile nke chere ha ihu bụkwa otu nʼọtụtụ.
قوژبنەکانی دەروازەی لای ڕۆژهەڵاتیش، لە هەر لایەک سێ قوژبن هەبوون، هەرسێکیان هەمان پێوانە بوون. ڕووبەری دیوارەکانی نێوانیشیان لە هەر لایەک وەک یەک بوون.
11 Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara nke mbata ọnụ ụzọ ama ahụ, ọ dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, na mita isii na ụma itoolu nʼogologo.
ئینجا پانی داڵانی دەروازەکەی پێوا، دە باڵ بوو، درێژایی دەروازەکەش سێزدە باڵ بوو.
12 Nʼihu oghere niile nke ụlọ ahụ e nwere mgbidi dị otu ọkara mita nʼịdị elu ya. Akụkụ anọ nke oghere ndị a ha otu. Ha ruru mita atọ mita atọ.
لێواری بەردەم قوژبنەکانیش لە هەر لایەک یەک باڵ بوو، قوژبنەکانیش درێژی و پانییەکەی شەش باڵ بوون.
13 Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara ọnụ ụzọ ama ahụ, site nʼelu ụlọ nke otu ime ụlọ ruo nʼelu ụlọ nke ime ụlọ chere ya ihu; obosara ya dị mita iri na atọ, site nʼotu oghere ruo nʼoghere nke chere ya ihu.
ئینجا دەروازەکەی پێوا، لە بنمێچی قوژبنێکەوە بۆ بنمێچی قوژبنەکەی بەرامبەری. دووری لەنێوان دەلاقەی دیواری پشتی قوژبن و دەلاقەکەی بەرامبەری بیست و پێنج باڵ بوو.
14 Ọ tụrụ ogologo ogidi niile dị nʼakụkụ nʼime mgbidi ọnụ ụzọ ama ụlọ ahụ, chọpụta na ọ dị iri mita atọ na abụọ, ọ bụladị ruo nʼakụkụ mgbidi nke chere ihu nʼọnụ ụzọ ama ogige ahụ.
ڕووبەری ناوبڕەکانیشی هەتا هەیوانی بەرامبەر حەوشەی دەروازەکەی پێوا، درێژایی شەست باڵ بوو.
15 Site nʼihu ọnụ ụzọ ama mbata ahụ, ruo nʼebe ngwụcha nke ọnụ ụzọ dị na mpụta ọnụ ụlọ ya dị iri mita abụọ na asaa.
دووری نێوان داڵانی دەروازەکە و کۆتایی هەیوانەکەی پەنجا باڵ بوو.
16 Ọnụ ụlọ ndị ahụ niile nwere oghereikuku dị warawara nʼakụkụ aja ụlọ ha, dịka mpụta ọnụ ụlọ ahụ nwekwara; oghereikuku ndị a dị gburugburu dị nʼime, nʼetiti ọnụ ụlọ ndị a. Nʼaja ụlọ ndị a niile, e nwere oyiyi nkwụ dị iche iche e sere nʼelu ha.
ڕووی ناوەوەی ستارەی سەر قوژبن و ناوبڕە و هەیوانەکەش دەلاقەدار بوو، ڕووی ناوبڕەکانیش نەخشی دار خورما هەبوو.
17 Ọ kpọbatara m nʼogige dị nʼezi. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ụfọdụ ọnụụlọ dị na pevumentị e wunyere gburugburu ogige ahụ niile. Ha dị iri ọnụụlọ atọ dị nʼogologo pevumentị ahụ.
ئینجا منی هێنایە خانەکانی دەرەوە. بینیم چەند ژوورێک و شۆستەیەک بە چواردەوری حەوشەکەدا دروستکرابوون. بە درێژایی شۆستەکە سی ژوور هەبوو.
18 Ebe nzọkwasị ụkwụ a gara ogologo ruo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, ogologo ya na ọnụ ụzọ ama ahụ ha, nke a bụ pevumentị nke dịkarịrị ala.
شۆستەکە لەلای دەروازەکان بوو، بەرامبەر بە درێژایی دەروازەکانیش شۆستەکەی خوارەوە بوو.
19 Mgbe ahụ, ọ tụrụ ịdị ogologo ya, site nʼime ọnụ ụzọ ama nke dịkarịrị ala ruo nʼọnụ ụzọ nke ime ogige, o ruru iri mita ise na atọ nʼakụkụ ihu anyanwụ nakwa nʼakụkụ ugwu.
ئینجا ئەو دوورییەی پێوا، کە لەنێوان دیوی ناوەوەی دەروازەکەی خوارەوە و دیوی دەرەوەی حەوشەکەی ناوەوە بوو، سەد باڵ بوو بەلای ڕۆژهەڵات و بەلای باکوور.
20 Ọ tụrụ ogologo na obosara ọnụ ụzọ nke dị nʼugwu, nke e si abanye nʼogige dị nʼezi.
ئینجا درێژی و پانی دەروازەکەی ڕووەو باکووری پێوا، کە دەروازەیەک بوو بۆ خانەکانی دەرەوە.
21 Ime ụlọ ya dị ọnụ ụlọ atọ nʼakụkụ ya ọbụla. Akụkụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ya, bụ otu ọtụtụ dịka ọtụtụ nke ọnụ ụzọ ama mbụ. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.
قوژبنەکانیشی لە هەر لایەک سێ بوون، ناوبڕەکان و هەیوانەکەشی وەک پێوانەی دەروازەکەی یەکەم بوو، درێژییەکەی پەنجا باڵ و پانییەکەی بیست و پێنج باڵ بوو.
22 Oghereikuku ya, mpụta ọnụ ụzọ ya na osisi nkwụ e sere nʼahụ aja ụlọ ahụ niile, dịka e mere nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, bụ otu ọtụtụ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dị nke e si aga na mpụta ọnụ ụlọ ahụ na ncherita ihu ogige ezi.
دەلاقەکانی و هەیوانەکەی و نەخشە دار خورماکەی هەمان پێوانەی ئەو دەروازەیە بوو کە ڕووەو ڕۆژهەڵات بوو. بە حەوت پایە بۆی سەردەکەوتن و هەیوانەکەشی بەرامبەریان بوو.
23 Otu ọnụ ụzọ dị nke gara nʼogige dị nʼime, nke chere ihu ọnụ ụzọ mbata dị nʼugwu, dịka ọ dịkwa nʼakụkụ nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ.
دەروازەی حەوشەکەی ناوەوەش بەرامبەر دەروازەی باکوور بوو، هەروەک دەروازەی ڕۆژهەڵات، لە دەروازەیەکەوە بۆ دەروازەیەک پێوای، سەد باڵ بوو.
24 Mgbe ahụ, o duuru m gaa nʼakụkụ ndịda, a hụrụ m ọnụ ụzọ mbata ndịda. Ọ tụrụ tụọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ahụ na mpụta ọnụ ụlọ ya, chọpụta na ya na ndị ọzọ bụ otu ọtụtụ.
ئینجا منی بەرەو باشوور برد. بینیم دەروازەیەکی ڕووەو باشوور هەبوو، دینگەکان و هەیوانەکەی پێوا، هەمان پێوانە بوون.
25 Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghereikuku dị warawara gbaa gburugburu, dịka e nwere na ndị ọzọ niile. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ
دەروازەکەش دەلاقەی تێدابوو، هەیوانەکەشی وەک ئەو دەلاقانەی لە چواردەوری هەبوو. درێژی پەنجا باڵ و پانی بیست و پێنج باڵ بوو.
26 Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dịkwa iji rigoo ya, mpụta ọnụ ụlọ ya dịkwa na ncherita ihu ha, o nwekwara ihe ịchọ mma osisi nkwụ e sere nʼahụ akụkụ aja ahụ, otu nʼotu akụkụ, nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ.
پێپلیکانەکەشی حەوت پایە بوو، هەیوانەکەشی لەبەردەمی بوو، لە هەردوو لای دەروازەکە لە هەردوو ڕووی ناوبڕەکان نەخشی دار خورما هەبوون.
27 Ogige nke dị nʼime, nwekwara ọnụ ụzọ ama nke na-echere ihu na ndịda. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ.
حەوشەکەی ناوەوەش دەروازەیەکی بەرەو باشوور هەبوو، لە دەروازەوە بۆ دەروازە ڕووەو باشوور پێوای، سەد باڵ بوو.
28 O duuru m site nʼọnụ ụzọ dị na ndịda banye nʼogige dị nʼime. Ọ tụrụ ọnụ ụzọ mbata a hụ na ya na ọnụ ụzọ nke dị ọzọ bụ otu ọtụtụ.
ئینجا لە دەروازەکەی باشوورەوە منی هێنایە حەوشەکەی ناوەوە. دەروازەکەی باشووری پێوا، هەمان پێوانەی دەروازەکانی دیکەی بوو.
29 Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.
قوژبنەکانی و ناوبڕەکانی نێوانیان و هەیوانەکەی هەمان پێوانە بوون. دەروازەکە و هەیوانەکەشی دەلاقە بە چواردەوریاندا هەبوون. درێژی پەنجا باڵ و پانی بیست و پێنج باڵ بوو.
30 Mpụta ọnụ ụlọ nke ndị dị gburugburu ogige nke ime, dị iri mita na atọ nʼobosara, na mita abụọ na ụma atọ nʼịdị omimi.
لە هەر سێ لاوە هەیوانەکان بیست و پێنج باڵ درێژایی و پێنج باڵ پانی بوون.
31 Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi, oyiyi osisi nkwụ ka eji chọọ ogidi ọnụ ụlọ ahụ mma, ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.
هەیوانەکەشی ڕووەو خانەکانی دەرەوە بوو، لەسەر دینگەکانیشی نەخشی دار خورما هەبوون، پێپلیکانەکەشی لەسەر هەشت پایە بوون.
32 Ọ kpọbatakwara m nʼogige dị nʼime site nʼọnụ ụzọ mbata nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụkwara ọnụ ụzọ ama ahụ, chọpụta na ya na ndị ọzọ bụkwa otu ọtụtụ.
ئینجا منی هێنایە ناو حەوشەکەی ناوەوە بەرەو ڕۆژهەڵات. دەروازەکەی پێوا، هەمان پێوانەی دەروازەکانی دیکە بوو.
33 Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya niile bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.
قوژبنەکانی و ناوبڕەکانی نێوانیان و هەیوانەکەی هەمان پێوانە بوون. لە دەروازەکە و لە هەیوانەکەشی دەلاقە بە چواردەوریدا هەبوون. درێژی دەروازەکە پەنجا باڵ و پانی بیست و پێنج باڵ بوو.
34 Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.
هەیوانەکەشی ڕووەو خانەکانی دەرەوە بوو، لەسەر دینگەکانیشی نەخشی دار خورما لە هەردوو لای هەبوون، پێپلیکانەکەشی لەسەر هەشت پایە بوون.
35 O mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama mbata nke ugwu. Ọ tụrụ ya, chọpụta na ọtụtụ ya dịkwa ka nke ndị ọzọ,
ئینجا منی هێنایە دەروازەکەی باکوور و پێوای، هەمان پێوانەی دەروازەکانی دیکە بوو.
36 dịka ọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya, ha niile nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ
قوژبن و ناوبڕەکانی و هەیوانەکەی و ئەو دەلاقانەی لە چواردەوری بوون، درێژی دەروازەکە پەنجا باڵ بوو، پانی بیست و پێنج باڵ بوو.
37 Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.
هەیوانەکەشی ڕووەو خانەکانی دەرەوە بوو، لەسەر دینگەکانیشی نەخشی دار خورما هەبوون، لە هەردوو لای، بە هەشت پایە بۆی سەردەکەوت.
38 Otu ọnụụlọ nke nwere ọnụ ụzọ dịkwa nʼakụkụ mpụta ọnụ ụlọ nke ime ime ọnụ ụzọ ama ọbụla, ebe a na anọ asacha anụ aja nsure ọkụ niile.
لەلای هەیوانی هەر دەروازەیەکی ناوەوە ژوورێک و داڵانێک هەبوو، لەوێ قوربانی سووتاندنیان دەشوشت.
39 Nʼime mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ka tebul abụọ dị nʼotu akụkụ, abụọ nke ọzọ dịkwa nʼakụkụ nke ọzọ nke ọnụ ụlọ ahụ. Nʼelu ha ka a na-egbu anụ e ji achụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja mmehie, maọbụ onyinye nʼihi aja ikpe ọmụma.
لە هەیوانی دەروازەکەش دوو مێز لە هەر لایەکی هەبوون، بۆ ئەوەی قوربانی سووتاندن و قوربانی گوناه و قوربانی تاوان لەسەریان سەرببڕدرێن.
40 Nʼakụkụ mgbidi ezi nke mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, nʼakụkụ ihe nrigo nke dị na mbata ọnụ ụzọ ugwu, e nwere tebul abụọ, nʼakụkụ nke ọzọkwa nke ihe nrigo ahụ, e nwekwara tebul abụọ nʼebe ahụ.
لە دیوی دەرەوەی هەیوانی دەروازەکە، لە نزیکی پێپلیکانەکەی لای داڵانی دەروازەی باکوور، لە هەر لەلایەکی پێپلیکانەکە دوو مێز هەبوون.
41 Ya mere, e nwere tebul anọ nʼotu akụkụ ihe nrigo ahụ, nwekwa anọ nʼakụkụ nke ọzọ ya, ya bụ, tebul asatọ ma agụkọta ya ọnụ, ebe a na-anọ egbu anụ e ji achụ aja.
چوار مێز لێرە و چوار مێز لەوێ لەلای دەروازەکە، هەشت مێز قوربانییان لەسەر سەردەبڕان.
42 E nwekwara tebul anọ ndị ọzọ nʼime ọnụ ụlọ ahụ e ji nkume a wara awa wuo. Nʼelu ya ka a na-anọ akwado anụ a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ. Ịdị elu tebul ndị a bụ iri sentimita asatọ. Obosara elu ha nʼakụkụ niile dị iri sentimita ise na atọ. Ngwongwo niile e ji egbu anụ e ji achụ aja na-adị nʼelu tebul ndị a.
چوار مێزی دیکەش بۆ قوربانی سووتاندنەکان هەبوون لە بەردی تاشراو بوون، درێژییەکەیان باڵ و نیوێک و پانییەکەشیان باڵ و نیوێک بوون، بەرزاییەکەشیان یەک باڵ بوو. ئەو کەرەستانەی لەسەر دادەنرا کە قوربانی سووتاندن و قوربانی دیکەیان پێ سەردەبڕی.
43 E ji nko nke ịdị ogologo ya dị sentimita itoolu ejigidesi tebul ndị ahụ ike nʼahụ aja ụlọ. Nko ndị a dị gburugburu tebul ndị ahụ. Ọ bụkwa nʼelu tebul ndị a ka a na-edebe anụ niile e ji enye onyinye.
قولاپەکانیش چوار پەنجە بوون، لە دیوی ناوەوە بە چواردەوریدا قاییم کرابوون، مێزەکانیش بۆ گۆشتی قوربانییەکان بوون.
44 Nʼime ogige dị nʼime, e nwere ọnụụlọ abụọ nke nwere ụzọ e si abanye nʼogige dị nʼime. Otu dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, chee ihu nʼọdịda anyanwụ, nke ọzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼọdịda anyanwụ, chee ihu nʼugwu.
لە حەوشەکەی ناوەوە، لە دەرەوەی دەروازەکەی، دوو ژوور هەبوون، یەکێکیان لەلای دەروازەکەی باکوور، ڕووی لە باشوور بوو. ئەوەی دیکە لەلای دەروازەکەی باشوور، ڕووی لە باکوور بوو.
45 Ọ gwara m, “Ọnụụlọ ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼugwu bụ nke ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu.
پێی فەرمووم: «ئەو ژوورەی ڕووی لە باشوورە هی کاهینەکانە، کە بەرپرسیارن لە پارێزگاریکردنی پەرستگا.
46 Ọnụụlọ nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama chere ihu nʼugwu, bụ nke ndị nchụaja ndị na-eche ebe ịchụ aja nche. Ndị a bụ ụmụ ụmụ Zadọk. Ọ bụ naanị ha ka e kwere ka ha nwee ike ịbịaru Onyenwe anyị nso, ijere ya ozi site nʼetiti ebo Livayị niile.”
ئەو ژوورەش کە ڕووی لە باکوورە هی ئەو کاهینانەیە کە بەرپرسیارن لە پارێزگاریکردنی قوربانگا. ئەوان نەوەی سادۆقن، کە لەنێو نەوەی لێڤی تەنها ئەوان بۆیان هەیە لە یەزدان نزیک ببنەوە بۆ خزمەتکردنی.»
47 Mgbe ahụ, ọ tụrụ ogige ime ahụ, chọpụta na ogologo ya dị iri mita ise na asatọ. Obosara ya bụkwa otu ihe ahụ. Ebe ịchụ aja dịkwa nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ.
پاشان حەوشەکەی بەردەم پیرۆزگای پێوا، درێژی سەد باڵ و پانیشی سەد باڵ بوو، چوارگۆشە بوو، قوربانگاکەش لەبەردەم پیرۆزگاکە بوو.
48 O mere ka m bịaruo na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ nke mpụta ọnụ ụlọ ahụ, o ruru mita abụọ na ụma atọ nʼobosara, nʼakụkụ ya abụọ. Ebe mbata ya ruru mita asaa na ụma anọ nʼobosara, ebe akụkụ aja ụlọ ahụ ruru otu mita na ụma isii nʼobosara, nʼotu akụkụ nakwa nʼakụkụ nke ọzọ ya.
ئینجا منی هێنایە هەیوانی پیرۆزگاکە، دینگەکانی هەیوانەکەی پێوا، ئەستوورایی هەر لایەک پێنج باڵ بوو. پانی بەردەرگاکەش چواردە باڵ بوو، ناوبڕەکانی هەر لایەک سێ باڵ بوون.
49 Ebe mpụta ọnụ ụlọ ahụ dị ihe ruru mita iri na otu nʼobosara, sitekwa nʼazụ ruo nʼihu ya ruru mita isii na ụma anọ. Ọ bụ ihe nrigo iri ka eji arịgo ya. Ogidi dịkwa nʼakụkụ ọnụ ụzọ abụọ ahụ otu nʼakụkụ nke a ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ ya.
پانی هەیوانەکە بیست باڵ بوو، درێژییەکەشی دوازدە باڵ. لە پێپلیکانەکەوە بۆی سەردەکەوت، لە هەردوو لای دینگەکان کۆڵەکە هەبوون، یەکێک لەم بەر و یەکێکی دیکە لەو بەر.

< Izikiel 40 >