< Izikiel 37 >

1 Aka nke Onyenwe anyị dịkwasịrị m, o sitekwara nʼike Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bulie m, debe m nʼetiti ndagwurugwu nke jupụtara nʼọkpụkpụ.
KAU mai la ka lima o Iehova maluna o'u, a lawe ae ia'u iwaho ma ka Uhane o Iehova, a hooku iho ia'u ilalo mawaenakonu o ka papu, ua paapu ia i na iwi.
2 O mere ka m jegharịa nʼetiti ha. Ahụrụ m ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, nke dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, ka ha ghasa na ndagwurugwu ahụ.
A hoohele ia'u e maalo ma ia mau mea a puni; aia hoi he nui wale o lakou ma ka papu, aia hoi, ua maloo loa lakou.
3 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a ha pụrụ ịdị ndị ọzọ?” Asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ naanị gị onwe gị maara.”
A ninau mai la oia ia'u, E ke keiki a ke kanaka, e hiki anei i keia mau iwi ke ola? I aku la hoi au, E Iehova ka Haku, o oe no ka i ike.
4 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ọkpụkpụ ndị ahụ, gwa ha, ‘Unu ọkpụkpụ niile kpọrọ nkụ, geenụ ntị nʼokwu nke Onyenwe anyị.
Olelo hou mai la oia ia'u, E wanaua oe i keia mau iwi, a e olelo aku ia lakou, E na iwi maloo, e hoolohe i ka olelo a Iehova.
5 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ọkpụkpụ ndị a. Lee, aga m eme ka ume baa nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ.
Ke i mai nei Iehova ka Haku penei i keia mau iwi; Eia hoi, e hookomo au i ke ea iloko o oukou, a e ola na oukou.
6 Aga m etinyekwasị unu akwara, na anụ ahụ, werekwa akpụkpọ ahụ kpuchie unu. Aga m etinye ume nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
A e kau iho au i na olona maluna o oukou, a lawe mai au i ka io maluna o oukou, a e uhi ia oukou i ka ili, a e hookomo ae au i ke ea iloko o oukou, a e ola oukou; a e ike no oukou owau no Iehova ka Haku.
7 Ya mere, eburu m amụma dịka e sị nye m nʼiwu. Mgbe m nọ na-ebu amụma ahụ, anụrụ m ụzụ, ụzụ mkpọtụ. Ma lee, ọkpụkpụ ndị ahụ niile bịara ibe ha nso; ọkpụkpụ malitekwara ijikọta onwe ha ọnụ.
A wanana aku la au e like me au i kauohaia mai ai: a i kuu wanana ana, kawewe ae la, aia hoi, he nauwe ana, a hui ae na iwi, ka iwi me kona iwi.
8 Mgbe m nọkwa na-ele anya, lee, ahụrụ m ka akwara na anụ ahụ malitere ịbịakwasị nʼelu ọkpụkpụ ndị ahụ, akpụkpọ ahụ kpuchikwara elu ha. Ma nʼoge a ume ọbụla adịghị nʼime ha.
A i ko'u nana ana'ku, aia hoi, pii mai no na olona a me ka io maluna o lakou, a uhi mai ka ili ia lakou maluna; aka, aole ea iloko o lakou.
9 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ifufe; buo amụma, nwa nke mmadụ, sị ifufe, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: site nʼakụkụ anọ nke ụwa bịa, gị ume na-enye ndụ, kukwasị ndị a e gburu egbu ka ha dịkwa ndụ ọzọ.’”
Alaila olelo mai la oia ia'u, E wanana oe i ka makani, e wanana, e ke keiki a ke kanaka, a e olelo i ka makani, ke i mai nei Iehova ka Haku, E hele mai, e ka makani, mai na makani eha mai, a e ha iho maluna o keia poe make i ka pepehiia, i ola lakou.
10 Ya mere, eburu m amụma dịka o si nye m nʼiwu. Ume ndụ banyekwara nʼime ha. Ha niile dịịrị ndụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ ha, ghọọ usuu ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.
A wanana aku la au e like me kana i kauoha mai ai ia'u, a komo mai ke ea iloko o lakou, a ola ae la lakou, a ku ae la lakou iluna ma ko lakou mau wawae, he mau koa lehulehu loa.
11 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a nọchiri anya ụlọ Izrel niile. Ha na-asị, ‘Anyị aghọọla ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, olileanya niile agwụkwala, anyị abụrụla ndị e bipụrụ.’
Alaila olelo mai la oia ia'u, E ke keiki a ke kanaka, o keia poe iwi, o ka ohana a pau ia a Iseraela; aia hoi, ke olelo nei lakou, Uamaloo ko kakou mau iwi, a ua lilo ko kakou mea i manaolana ai; ua oki loa ia'e nei kakou.
12 Nʼihi ya, buo amụma gwa ha, ‘otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ndị m, aga m emeghe ili unu, si nʼebe ahụ wepụta unu. Aga m eme ka unu lọghachitakwa nʼala Izrel.
Nolaila e wanana aku, a e olelo aku ia lakou, Ke i mai nei Iehova ka Haku, Aia hoi, e ko'u poe kanaka, e huai ae au i ko oukou mau luakupapau, a e hoopii mai au ia oukou mai loko mai o ko oukou mau luakupapau, a e lawe ae ia oukou i ka aina o ka Iseraela.
13 Nʼikpeazụ, mgbe m meghere ili unu mee ka unu si nʼime ya pụta, unu bụ ndị m ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Alaila e ike oukou owau no Iehova, i ka wa i huai ai au i ko oukou mau luakupapau, e ko'u poe kanaka, a lawe mai hoi au ia oukou mai loko mai o ko oukou mau luakupapau;
14 Aga m etinye Mmụọ m nʼime unu, unu ga-adị ndụ, lọghachikwa nʼala unu ọzọ. Unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya, meekwa ya, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’”
A hookomo i kuu Uhane iloko o oukou, a e ola oukou, a e hoonoho au ia oukou ma ko oukou aina; alaila e ike oukou owau no Iehova ka i olelo a e hana aku hoi, wahi a Iehova.
15 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Hiki hou mai la ka olelo a Iehova ia'u, i mai la,
16 “Nwa nke mmadụ, were osisi dee ihe ndị a nʼelu ya, ‘Osisi a nọchiri anya Juda na ndị Izrel e kekọtara ya na ha ọnụ.’ Werekwa osisi ọzọ deekwa okwu ndị a nʼelu ya. ‘Osisi a nọchiri anya Ifrem, na Josef, na ndị Izrel niile e jikọtara ha na ndị a ọnụ.’
A o oe, e ke keiki a ke kanaka, e lawe oe i ka laau nou, a e kakau iho maluna iho ona, No Iuda, a no na mamo a Iseraela kona mau hoa; alaila e lawe i kekahi laau, a e kakau iho maluna ona, No Iosepa, ka laau o ka Eperaima, a no ka ohana a pau a Iseraela kona mau hoa.
17 Jidekọtaa osisi abụọ ndị a ọnụ, mee ka ha bụrụ otu osisi nʼaka gị.
A e hookui ia laua i kekahi i kekahi i laau hookahi; a e lilo laua i hookahi iloko o kou lima.
18 “Mgbe ndị gị jụrụ gị, ‘Ị gaghị egosi anyị ihe nke a pụtara?’
Aia olelo na keiki a kanaka ia oe, e ninau ana, Aole anei oe e hoike mai ia makou i kou ma keia mau mea?
19 gwa ha, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, agaje m iwere osisi Josef, nke dị Ifrem nʼaka, nke bụkwa ihe nọchiri anya ebo ụfọdụ ndị Izrel, jidekọtaa ya na osisi nọchiri anya Juda, mee ha ka ha ghọọ otu osisi, bụrụkwa otu nʼaka m.’
E olelo aku oe ia lakou, Ke i mai nei Iehova ka Haku, penei; Aia hoi, e lawe au i ka laau o Iosepa, ka mea iloko o ka lima o Eperaima, a me na ohana a Iseraela kona mau hoa, a e hui aku au ia lakou me ia, me ka laau hoi o Iuda, a e hoolilo au ia lakou i laau hookahi, a lilo lakou i hookahi iloko o ko'u lima.
20 Were mkpirisi osisi ndị ahụ i dere ihe nke dị nʼaka gị, gosi ha,
A e waiho no na laau au e kakau ai iloko o kou lima imua o ko lakou alo.
21 ma gwakwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m esite na mba niile ndị Izrel jere biri kpọpụta ha. Aga m achịkọtakwa ha site nʼakụkụ niile, kpọbata ha nʼala nke aka ha.
A e olelo aku oe ia lakou, Ke i mai nei Iehova ka Haku, penei; Aia hoi, e lawe mai au i ka poe mamo a Iseraela mai waena mai o na lahuikanaka kahi i hele aku ai lakou, a e houluulu au ia lakou ma kela aoao keia aoao, a e lawe mai ia lakou iloko o ko lakou aina.
22 Aga m eme ha ka ha bụrụ otu mba nʼala ahụ, nʼugwu niile nke Izrel. Ha ga-enwe naanị otu eze nke ga-achị ha niile. Ha agaghị abụkwa mba abụọ maọbụ alaeze abụọ ọzọ.
A e hoolilo au ia lakou i lahuikanaka hookahi ma ka aina maluna o na mauna o ka Iseraela; a no lakou a pau he alii hookahi no; aole alua lahuikanaka hou aku lakou, aole loa hoi e mokuahana hou aku i elua aupuni.
23 Ha agaghị ejikwa arụsị ha niile, maọbụ ihe a pịrị apị rụrụ arụ, maọbụ jiri ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche merụọ onwe ha ọzọ. Nʼihi na aga m azọpụta ha site na ịlaghachi azụ nʼụzọ mmehie ha niile, meekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
Aole hoi e hoohaumia hou aku lakou ia lakou iho me ko lakou mau akuakii, aole hoi me ko lakou mau mea inainaia, aole hoi me kahi o ka lakou lawehala ana: aka, a e hoola au ia lakou mai loko mai o ko lakou mau wahi i noho ai, i hana hewa ai lakou, a e hoomaemae au ia lakou: a e lilo lakou i kanaka no'u, a owau hoi i Akua no lakou.
24 “‘Ohu m, Devid, ga-abụ eze ga-achị ha, ha ga-enwekwa otu onye ọzụzụ atụrụ. Ha ga-edebezu iwu m niile, na ụkpụrụ m niile.
A e lilo ka'u kauwa o Davida i alii maluna o lakou, a no lakou a pau he kahuhipa hookahi; e hele hoi lakou ma ko'u mau kanawai, a malama hoi lakou i ka'u mau kauoha, a e hana hoi malaila.
25 Ha ga-ebi nʼala ahụ m nyere ohu m Jekọb, ala ebe nna nna ha biri. Ha na ụmụ ha ga-ebi nʼime ya. Ụmụ ụmụ ha ruo ọgbọ niile ga-ebikwa nʼime ya. Ohu m Devid ga-abụ eze ha ruo ebighị ebi.
A e noho lakou ma ka aina a'u i haawi aku ai i kuu kauwa ia Iakoba, kahi i noho ai ko oukou mau makua; a e noho lakou malaila, o lakou, a me ka lakou poe keiki, a me ka poe keiki a ka lakou poe keiki a mau loa aku; a e mau ana no ko ka'u kauwa ko Davida alii ana no lakou.
26 Mụ na ha ga-agba ndụ udo, ọgbụgba ndụ nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Aga m agọzi ha, mee ka ha baa ụba. Nʼetiti ha kwa ka ụlọnsọ m ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.
A e hana au i ka berita hoomalu me lakou, e lilo ia i berita mau loa me lakou; a e hoonoho au ia lakou, a e hoonui au ia lakou, a e hoonoho au i kuu wahi hoano iwaena o lakou a mau loa.
27 Ebe obibi m ga-abụkwa nʼetiti ha. E, aga m abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.
A o ko'u halelewa kekahi me lakou; a owau auanei ko lakou Akua, a o lakou hoi ko'u poe kanaka.
28 Mgbe ụlọnsọ m ga-adị nʼetiti ha ruo ebighị ebi, mba niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-edo Izrel nsọ.’”
A e ike hoi na lahuikanaka, owau o Iehova ka i hoomaemae i ka Iseraela, i ka mau loa ana o ko'u wahi hoano iwaenakonu o lakou.

< Izikiel 37 >