< Izikiel 24 >
1 O ruo nʼafọ nke itoolu, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Ilizwi leNkosi laselifika kimi, ngomnyaka wesificamunwemunye, ngenyanga yetshumi, ngolwetshumi lwenyanga, lisithi:
2 “Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu.
Ndodana yomuntu, zibhalele ibizo losuku, lwalona lolusuku; inkosi yeBhabhiloni yazimisa ukumelana leJerusalema ngalona lolusuku.
3 Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị ya kunyekwanụ mmiri nʼime ya.
Njalo tshono umfanekiso kuyo indlu evukelayo uthi kubo: Itsho njalo iNkosi uJehova: Beka imbiza, ibeke, futhi uthele amanzi kuyo,
4 Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya. Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya. Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya.
ubuthele iziqa zayo kiyo, zonke iziqa ezinhle, umlenze lomkhono, uyigcwalise ngekhethelo lamathambo.
5 Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ, kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ, mee ya ka ọ gbọọ nke ọma, sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya.
Thatha ikhethelo lomhlambi, ubuthelele lamathambo ngaphansi kwayo, kwenze kubile kuhle, kuphekwe lamathambo awo phakathi kwayo.
6 “‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya. E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya, nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya. Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu. Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a.
Ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Maye kuwo umuzi wegazi, imbiza omengulo wayo uphakathi kwayo, lomengulo wayo kawuphumanga kuyo! Khupha isiqa ngesiqa, inkatho kayingaweli kuyo.
7 “‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya. Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya. Ọ bụghị nʼelu ala efu, ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya.
Ngoba igazi lawo liphakathi kwawo, ulibeke edwaleni elize, kawulithululelanga phezu komhlabathi ukuligqibela ngenhlabathi.
8 Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume, ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya.
Ukuze ngivuse intukuthelo, ukuze ngiphindisele impindiselo, ngibekile igazi lawo edwaleni elize, ukuze lingagqitshelwa.
9 “‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara. Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.
Ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Maye kuwo umuzi wegazi! Lami ngizakwenza ibonda libe likhulu.
10 Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu, mụnyekwanụ ọkụ. Jirinụ ụda dị iche iche sizie anụ ahụ nke ọma; surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.
Yandisa izinkuni, uphembe umlilo, uqede inyama, uxubanise izinongo, lamathambo atshiswe.
11 Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ, tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa, gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị, nchara ya ga-agwụsịkwa.
Ubusuyibeka phezu kwamalahle ayo ingelalutho, ukuze kutshise kuvuthe ithusi layo, lokungcola kwayo kuncibilike phakathi kwayo, kuqedwe umengulo wayo.
12 Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ. Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya emeghị ka ọ gbazee.
Izidinisile ngomtshikatshika, lomengulo wayo omnengi kawuphumanga kuyo. Umengulo wayo usemlilweni.
13 “‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke.
Kulamanyala ekungcoleni kwakho; ngoba ngikuhlambulule, kodwa kawuhlambulukanga, kawuyikuhlambuluka ekungcoleni kwakho futhi, ngize ngihlalise ukuthukuthela kwami phezu kwakho.
14 “‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’”
Mina Nkosi ngikhulumile; kuzafika, ngikwenze; kangiyikuyekela, kangiyikuba lesihawu, kangiyikuzisola; njengokwendlela zakho lanjengokwezenzo zakho bazakugweba, itsho iNkosi uJehova.
15 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Ilizwi leNkosi lafika kimi futhi, lisithi:
16 “Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta.
Ndodana yomuntu, khangela, ngizasusa kuwe isiloyiso samehlo akho ngokutshaya; kodwa ungalili, ungakhali inyembezi, futhi inyembezi zakho zingaveli.
17 I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.”
Bubula, uthule, ungenzi isililo ngabafileyo, ubophe iqhiye yakho phezu kwakho, ufake amanyathela akho enyaweni zakho, ungambombozi indevu zendebe yakho yangaphezulu, ungadli isinkwa sabantu.
18 Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu.
Ngasengikhuluma labantu ekuseni, lakusihlwa umkami wafa. Ngasengisenza ekuseni njengokulaywa kwami.
19 Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?”
Abantu basebesithi kimi: Kawuyikusitshela yini ukuthi lezizinto ziyini kithi, ukuthi wenze nje?
20 Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
Ngasengisithi kubo: Ilizwi leNkosi lafika kimi lisithi:
21 Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.
Tshono kuyo indlu kaIsrayeli: Itsho njalo iNkosi uJehova: Khangela, ngizangcolisa indawo yami engcwele, udumo lwamandla enu, isiloyiso samehlo enu, lokuzwelwa ngumphefumulo wenu; njalo amadodana enu lamadodakazi enu eliwatshiyileyo azakuwa ngenkemba.
22 Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri.
Khona lizakwenza njengoba ngenzile; kaliyikumbomboza indevu zendebe yangaphezulu, kaliyikudla isinkwa sabantu.
23 Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu.
Lamaqhiye enu azakuba phezu kwamakhanda enu, lamanyathela enu ezinyaweni zenu; kaliyikulila kaliyikukhala inyembezi; kodwa lizacikizeka ngenxa yeziphambeko zenu, libubule, omunye komunye.
24 Izikiel ga-abụrụ unu ihe ịmaatụ. Unu ga-emekwa dịka o mere mgbe ihe ndị a mezuru. Unu ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’
Ngokunjalo uHezekeli uzakuba yisibonakaliso kini; lizakwenza njengakho konke akwenzileyo; lapho sekufika lokhu, lizakwazi ukuthi ngiyiNkosi uJehova.
25 “Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom,
Futhi, wena ndodana yomuntu, kakuyikuba njalo yini ngalolosuku lapho engizasusa kubo inqaba yabo, intokozo yobuhle babo, isiloyiso samehlo abo, lokuphakama komphefumulo wabo, amadodana abo lamadodakazi abo,
26 nʼụbọchị ahụ, ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ ga-agbakwute gị ịkọrọ gị ihe mere.
ngalolosuku kuzafika kuwe ophunyukileyo, ukwenza indlebe zakho zizwe?
27 Nʼoge ahụ, ị ga-asaghe ọnụ gị. Gị na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ ga-ekwurịta okwu. Ị gaghị anọkwa juu ọzọ. Nʼihi ya, ị ga-aghọrọ ha ihe ịrịbama. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
Ngalolosuku umlomo wakho uzavulekela yena ophunyukileyo; njalo uzakhuluma, ungabe usaba yisimungulu; ngokunjalo uzakuba yisibonakaliso kubo; khona bazakwazi ukuthi ngiyiNkosi.