< Izikiel 11 >

1 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m mee ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama ụlọ Onyenwe anyị, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Nʼebe ahụ, nʼoghere nke ọnụ ụzọ ama ahụ, ahụrụ m iri mmadụ abụọ na ise. Ahụkwara m nʼetiti ha, Jaazanaya nwa Azoa na Pelataya nwa Benaya, bụ ndịisi ndị Izrel.
And [the] Spirit lifts me up, and it brings me to the east gate of the house of YHWH, that is facing the east, and behold, at the opening of the gate [are] twenty-five men, and I see in their midst Jaazaniah son of Azzur, and Pelatiah son of Benaiah, heads of the people.
2 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a.
And He says to me, “Son of man, these [are] the men who are devising iniquity, and who are giving evil counsel in this city;
3 Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’
who are saying, It [is] not near—to build houses, it [is] the pot, and we [are] the flesh.
4 Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.”
Therefore prophesy concerning them, prophesy, son of man.”
5 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Onyenwe anyị bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche.
And [the] Spirit of YHWH falls on me, and He says to me, “Say, Thus said YHWH: You have said correctly, O house of Israel, And I have known the steps of your spirit.
6 Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ.
You multiplied your wounded in this city, And filled its out-places with the wounded.
7 “Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta.
Therefore, thus said Lord YHWH: Your wounded whom you placed in its midst, They [are] the flesh, and it [is] the pot, And He has brought you out from its midst.
8 Mma agha ahụ unu na-atụ egwu ya ka m ga-eme ka ọ bịakwasị unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
You have feared a sword, And I bring in a sword against you, A declaration of Lord YHWH.
9 Aga m esitekwa nʼetiti ya kpọpụta unu, were unu nyefee nʼaka ndị mba ọzọ, ma kpekwa unu ikpe.
And I have brought you out of its midst, And given you into the hand of strangers, And I have done judgments among you.
10 Unu ga-ada site na mma agha. Ọ bụ nʼoke ala Izrel niile ka m ga-anọ kpee unu ikpe. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
You fall by the sword, I judge you on the border of Israel, And you have known that I [am] YHWH.
11 E, obodo a agaghị abụrụ unu ite. Unu agaghị anọkwa nʼime ya dịka anụ. Aga m ekpe unu ikpe nʼoke ala Izrel niile.
It is not for a pot for you, Nor are you for flesh in its midst, I judge you at the border of Israel.
12 Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na unu bụ ndị na-enupu isi site nʼiwu m na ụkpụrụ m. Ma unu na-agbaso nzọ ụkwụ nke mba ndị ahụ niile gbara unu gburugburu.”
And you have known that I [am] YHWH, For you have not walked in My statutes, And you have not done My judgments, And according to the judgments of the nations Who are around you, you have done!”
13 Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?”
And it comes to pass, at my prophesying, that Pelatiah son of Benaiah is dying, and I fall on my face, and cry—a loud voice—and say, “Aah! Lord YHWH, You are making an end of the remnant of Israel.”
14 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
And there is a word of YHWH to me, saying,
15 “Nwa nke mmadụ, ụmụ nke nna gị, ọ bụladị ụmụnna gị, na ndị mgbapụta gị na ezinaụlọ Izrel niile, ọ bụ ha ka ndị bi na Jerusalem sịrị, ‘Ha esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ gaa ebe dị anya, ọ bụkwa anyị ka enyere ala nke a ka ọ bụrụ ihe nnweta anyị,’
“Son of man, your brothers, your brothers, men of your family, and all the house of Israel—all of it—[are] they to whom inhabitants of Jerusalem have said, Keep far off from YHWH;
16 “Nʼihi nke a, kwuo, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị, Nʼagbanyeghị na m zipụrụ ha gaa ebe dị anya nʼetiti mba dị iche iche, chụsakwaa ha nʼetiti ala dị iche iche, ma nwa mgbe nta, a bụụrụ m ha ebe dị nsọ nʼala niile ahụ bụ ebe ha gara.’
it [is] ours, the land has been given for an inheritance; therefore say, Thus said Lord YHWH: Because I put them far off among nations, And because I scattered them through lands, I am also for a little sanctuary to them, In lands to where they have gone in.
17 “Ya mere kwuo, ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m achịkọtakwa unu ọnụ ọzọ, site nʼobodo niile bụ ebe unu gbasara, nyeghachikwa unu ala Izrel.’
Therefore say, Thus said Lord YHWH: And I have assembled you from the peoples, And I have gathered you from the lands, Into which you have been scattered, And I have given the ground of Israel to you.
18 “Ha ga-alọghachi nʼebe ahụ, sitekwa nʼetiti ya wezuga oyiyi ihe arụ niile, na arụsị niile bụkwa ihe arụ.
And they have gone in there, And turned aside all its detestable things, And all its abominations—out of it.
19 Aga m enyekwa ha otu obi, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime ha. Aga m ewepụ site nʼime ha obi kpọrọ nkụ ma nye ha obi nke anụ ahụ.
And I have given one heart to them, And I give a new spirit in your midst, And I have turned the heart of stone out of their flesh, And I have given a heart of flesh to them.
20 Nke a ga-eme ka ha soro ụkpụrụ m na iwu m niile, leziekwa anya idebe ha. Ha ga-abụ ndị nke m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
So that they walk in My statutes, And keep My judgments, and have done them, And they have been to Me for a people, And I am to them for God.
21 Ma banyere ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe ọjọọ na ihe niile rụrụ arụ, mmehie ha ka m ga-atụkwasị nʼisi ha; otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
As for those whose heart is going to the heart Of their detestable things and their abominations, I have put their way on their head, A declaration of Lord YHWH.”
22 Mgbe ahụ, cherubim ndị ahụ weliri nku ha elu, wịịlu ndị ahụ dịkwa nʼakụkụ ha ma ebube nke Chineke nke Izrel guzokwa nʼelu ha.
And the cherubim lift up their wings, and the wheels [are] alongside them, and the glory of the God of Israel [is] over them above.
23 Ebube Onyenwe anyị sitere nʼetiti obodo ahụ rigoo, guzo nʼelu ugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
And the glory of YHWH goes up from off the midst of the city, and stands on the mountain, that [is] on the east of the city.
24 Nʼime ọhụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu bubata m na Kaldịa, ebe ndị a dọkpụụrụ gaa mba ọzọ nọ. Otu a ka ọhụ m hụrụ si hapụ m.
And [the] Spirit has lifted me up, and brings me to Chaldea, to the expulsion, in a vision, by [the] Spirit of God, and the vision that I have seen goes up from off me;
25 Agwakwara m ndị niile ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ ihe niile nke Onyenwe anyị gosiri m.
and I speak to the expulsion all the matters of YHWH that He has showed me.

< Izikiel 11 >