< Ọpụpụ 6 >
1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.”
INkosi yasisithi kuMozisi: Khathesi uzabona engizakwenza kuFaro; ngoba ngesandla esilamandla uzabayekela bahambe, langesandla esilamandla uzabaxotsha elizweni lakhe.
2 Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
UNkulunkulu wasekhuluma kuMozisi wathi kuye: NgiyiNkosi;
3 Egosiri m Ebraham na Aịzik na Jekọb onwe m dịka Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mgbe m mere ka ha mata aha m dịka Onyenwe anyị.
njalo ngabonakala kuAbrahama, kuIsaka, lakuJakobe njengoNkulunkulu uSomandla; kodwa ngebizo lami lokuthi uJehova ngangingaziwa kubo.
4 Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa.
Njalo lami ngamisa isivumelwano sami labo ukubapha ilizwe leKhanani, ilizwe lobuhambuma babo, ababehlala kulo njengabezizwe.
5 Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m.
Futhi lami ngizwile ukububula kwabantwana bakoIsrayeli, amaGibhithe abagcine ebugqilini; njalo ngikhumbule isivumelwano sami.
6 “Ya mere, gwa ụmụ Izrel, ‘Abụ m Onyenwe anyị. Aga m akpọpụta unu site nʼọnọdụ ịbụ ohu ndị Ijipt. Aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu nye ha. Aga m eji aka ike m nke m ga-esetipụ, ya na ihe ngosipụta dị ukwuu nke ikpe ikpe m, gbapụta unu.
Ngakho-ke tshono kubantwana bakoIsrayeli ukuthi: NgiyiNkosi; njalo ngizalikhupha lisuke ngaphansi kwemithwalo yamaGibhithe; ngilikhulule ebugqilini bawo, ngilihlenge ngengalo eyeluliweyo langezigwebo ezinkulu.
7 Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt.
Njalo ngizazithathela lina libe yisizwe, ngizakuba kini nguNkulunkulu; njalo lizakwazi ukuthi ngiyiNkosi uNkulunkulu wenu, olikhupha lisuke ngaphansi kwemithwalo yamaGibhithe;
8 Aga m akpọbata unu nʼala ahụ m weliri aka m elu, ṅụọ nʼiyi, nye Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ime ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Abụ m Onyenwe anyị.’”
njalo ngizalingenisa elizweni engaphakamisa isandla sami ngalo ukulinika uAbrahama, uIsaka loJakobe, ngilinike lona libe yilifa; mina, iNkosi.
9 Mosis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị ntị nʼihi ịda mba nke obi ha na ahụhụ sitere na ndọgbu nʼọrụ ha.
UMozisi wasekhuluma ngokunjalo kubantwana bakoIsrayeli; kodwa kabamlalelanga uMozisi ngenxa yokukhathazeka komoya langenxa yobugqili obunzima.
10 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị,
INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
11 “Gaa gwa Fero eze Ijipt, ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha pụọ nʼala ya.”
Ngena ukhulume kuFaro, inkosi yeGibhithe, ukuthi ayekele abantwana bakoIsrayeli basuke elizweni lakhe.
12 Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Mgbe ụmụ Izrel na-aṅaghị m ntị, olee otu Fero ga-esi ṅaa m ntị? Nke ka nke, enweghị m ike ikwu okwu nke ọma.”
Kodwa uMozisi wakhuluma phambi kweNkosi esithi: Khangela, abantwana bakoIsrayeli kabangilalelanga; pho-ke uFaro angangizwa njani, engingowendebe ezingasokanga?
13 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.
INkosi yasikhuluma kuMozisi lakuAroni yabapha umlayo ngabantwana bakoIsrayeli langoFaro inkosi yeGibhithe ukukhupha abantwana bakoIsrayeli elizweni leGibhithe.
14 Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile. Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ, Hanok na Palu, Hezrọn na Kami. Ndị a bụ agbụrụ Ruben.
Laba bazinhloko zezindlu zaboyise; amadodana kaRubeni, izibulo likaIsrayeli: OHanoki loPalu, oHezironi loKarimi; laba bazinsapho zikaRubeni.
15 Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan). Ndị a bụ agbụrụ Simiọn.
Lamadodana kaSimeyoni: OJemuweli loJamini loOhadi loJakini loZohari loShawuli indodana yomKhananikazi; laba bazinsapho zikaSimeyoni.
16 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Livayị nʼusoro e si mụọ ha: Geshọn, Kohat na Merari. Livayị nʼonwe ya gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
Njalo la ngamabizo amadodana kaLevi ngezizukulwana zawo: OGerishoni loKohathi loMerari; leminyaka yempilo kaLevi yayiyiminyaka elikhulu lamatshumi amathathu lesikhombisa.
17 Ụmụ ndị ikom Geshọn, nʼagbụrụ ha, bụ Libni na Shimei, nʼusoro ezinaụlọ ha.
Amadodana kaGerishoni: OLibini loShimeyi ngezinsapho zawo.
18 Ụmụ ndị ikom Kohat bụ, Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Kohat gbara narị afọ na iri afọ atọ na atọ mgbe ọ nwụrụ.
Njalo amadodana kaKohathi: OAmramu loIzihari loHebroni loUziyeli; leminyaka yempilo kaKohathi yayiyiminyaka elikhulu lamatshumi amathathu lantathu.
19 Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi. Ndị a niile si nʼagbụrụ Livayị, dịka ihe e dere banyere ha si dị.
Njalo amadodana kaMerari: OMahli loMushi. Laba bazinsapho zamaLevi ngezizukulwana zabo.
20 Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya. Erọn na Mosis bụ ụmụ ha ndị ikom. Ma Amram gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
UAmramu wasethatha uJokebedi udadewabo kayise, waba ngumkakhe. Wasemzalela uAroni loMozisi. Leminyaka yempilo kaAmramu yayiyiminyaka elikhulu lamatshumi amathathu lesikhombisa.
21 Ụmụ ndị ikom Izha bụ Kora, Nefeg na Zikri.
Njalo amadodana kaIzihari: OKora loNefegi loZikiri.
22 Ụmụ ndị ikom Uziel bụ, Mishael, Elzafan na Sitri.
Lamadodana kaUziyeli: OMishayeli loElizafani loSithiri.
23 Erọn lụrụ Elisheba, nwa Aminadab, na nwanne nwanyị Nashọn. Ụmụ ha bụ, Nadab, na Abihu, Elieza na Itama.
UAroni wasezithathela uElisheba indodakazi kaAminadaba, udadewabo kaNashoni, waba ngumkakhe. Wasemzalela uNadabi loAbihu, uEleyazare loIthamari.
24 Ụmụ ndị ikom Kora bụ, Asịa, Elkena na Abiasaf. Ndị a bụ ndị ikwu Kora.
Njalo amadodana kaKora: OAsiri loElkana loAbhiyasafa; laba bazinsapho zabakoKora.
25 Elieza, nwa Erọn lụrụ otu nʼime ụmụ Putiel, onye mụtaara ya Finehaz. Ndị a bụ aha ndịisi ezinaụlọ Livayị dịka ikwu ha si dị.
UEleyazare indodana kaAroni wasezithathela enye yamadodakazi kaPutiyeli, yaba ngumkakhe. Yasimzalela uPhinehasi. Yizo lezi inhloko zaboyise bamaLevi ngezinsapho zazo.
26 Ọ bụkwa Mosis na Erọn ka Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Sitenụ nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel dịka ọnụọgụgụ ha si dị.”
Lo nguAroni loMozisi iNkosi eyathi kubo: Khuphani abantwana bakoIsrayeli elizweni leGibhithe ngamabutho abo.
27 Ha bụ ndị gwara Fero, eze Ijipt okwu banyere ime ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụọ. Ọ bụkwa otu Mosis na Erọn ahụ.
Yibo labo ababekhuluma kuFaro inkosi yeGibhithe ukukhupha abantwana bakoIsrayeli eGibhithe; lo nguMozisi loAroni.
28 Otu ụbọchị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼIjipt,
Kwasekusithi mhla iNkosi ikhuluma kuMozisi elizweni leGibhithe
29 ọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, gaa gwa Fero eze Ijipt ihe niile m gwara gị.”
iNkosi yakhuluma kuMozisi isithi: Mina ngiyiNkosi; khuluma kuFaro inkosi yeGibhithe konke engikukhuluma kuwe.
30 Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Lee, abụ m onye na-adịghị ekwuzi okwu nke ọma, gịnị mere Fero ga-eji gee ntị nʼihe m ga-agwa ya?”
UMozisi wasesithi phambi kweNkosi: Khangela, ngingowendebe ezingasokanga; ngakho uFaro angangizwa njani?