< Ọpụpụ 34 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, aga m edekwasị nʼelu ha okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ ahụ, bụ nke ị tụpịasịrị.
Yahweh akamwabia Musa, “Kata mbao mbili za mawe kama zile za awali. Nitaandika kwenye hizi mbao za mawe maneno yaliyo kuwa kwenye mbao za mawe za mwanzo, mbao za mawe ulizo zivunja.
2 Jikere nʼụtụtụ, rigoro ugwu Saịnaị ka i chee onwe gị nʼihu m nʼelu ugwu ahụ.
Kuwa tayari asubui na uje Mlima Sinai, na uje mbele zangu juu ya mlima.
3 Onye ọbụla esokwala gị, ma ọ bụkwanụ nọdụ nso ugwu ahụ. Ekwekwala ka igwe ehi maọbụ igwe atụrụ kpaa nri nso nso ugwu ahụ.”
Hakuna atakaye kuja nawe. Usiruhusu mtu yeyote aonekana popote kwenye mlima. Hakuna kundi la mifugo wanao ruhusiwa ata kula mbele ya mlima.”
4 Mosis biliri nʼisi ụtụtụ, waa mbadamba nkume abụọ dịka ndị nke mbụ, rigoro ugwu Saịnaị dịka Onyenwe anyị gwara ya. Ọ jikwa nkume abụọ ahụ nʼaka ya.
Hivyo Musa akakata mbao mbili za mawe kama za mwanzo, na akaamka asubui mapema na kwenda juu ya Mlima Sinai, kama Yahweh alivyo muelekeza. Musa alibeba mbao za mawe mikononi mwake.
5 Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime ogidi igwe ojii, guzo nʼihu Mosis, kwupụta aha ya bụ Onyenwe anyị.
Yahweh akaja chini katika wingu na akasima mbele za Musa, na akatamka jina “Yahweh.”
6 O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
Yahweh akapita kwake na kukiri, “Yahweh, Yahweh, Mungu ni wa rehema na wa neema, sio mwepesi wa hasira, na anadumu katika uwaminifu wa agano na uadilifu,
7 Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.”
ukishika uaminifu wa agano kwa vizazi maelfu, ukisamehe maasi, makosa, na dhambi. Lakini hamsafishi mwenye hatia. Ataleta adhabu ya dhambi za baba kwa watoto wao na watoto wa watoto wao, kwa kizazi cha tatu na hadi cha nne.”
8 Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala,
Musa haraka akainamisha kichwa chake kwenye ardhi na kuabudu.
9 sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.”
Kisha akasema, “Kama sasa nimepata upendeleo machoni pako, Bwana wangu, tafadhali nenda pamoja nasi, kwa kuwa hawa watu ni wa korofi. Samehe maasi yetu na dhambi zetu, na utuchukuwe kama urithi wako.”
10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mụ onwe m na gị na-agba ndụ. Nʼihu ndị gị niile, aga m arụ oke ọrụ ịtụnanya dị ukwu, ụdị nke a na-emetụbeghị mbụ nʼụwa, maọbụ na mba ọ bụla. Ndị niile unu bi nʼetiti ha ga-ahụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọrụ ahụ dị oke egwu nke m ga-arụ nʼihi unu.
Yahweh akasema, “Ona, ninakaribu kufanya agano. Mbele za watu wako, nitafanya maajabu ambayo hayajawai kufanywa duniani kote wala kwenye taifa lote. Watu wote miongoni mwako wataona matendo yangu, kwa kuwa ni kitu cha hofu ninacho fanya kwako.
11 Debe ihe niile m nyere gị nʼiwu taa. Aga m esite nʼihu unu chụpụ ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus.
Tii amri zangu leo. Ninawaondoa mbele yako Waamori, Wakanani, Wahivi, Wahiti, Waperizi, Wahivi, na Wayebusi.
12 Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ unu na-aba nʼime ya ghara ịgba ndụ. Ka ha ghara ị bụ ihe ịma nʼọnya nʼetiti unu.
Kuwa mwanglifu usifanye agano na wakazi wa nchi unayo kwenda, au wata kuwa mtego kwako.
13 Kama, tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha jiri mere chi ha.
Badala yake, lazima uvunje madhabahu zao, ponda nguzo zao za mawe, na kukata nguzo zao za Ashera.
14 Unu efela chi ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị, onye aha ya bụ Ekworo, bụ Chineke na-ekwo ekworo.
Kwa kuwa wewe haupaswi kumuabudu mungu mwingine, maana Yahweh, ambaye jina lake ni Uwivu, ni Mungu wa uwivu.
15 “Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ ghara ịgba ndụ, nʼihi na mgbe ha na-akwaso chi ha iko, na-achụkwa aja nye chi ha, ha ga-akpọ unu oku nri, mgbe ahụ, unu ga-eri site nʼihe aja ha.
Hivyo kuwa mwangalifu usifanye agano na wakazi wa nchi, kwa kuwa wanajifanyia ukahaba kwa miungu yao, na wanatoa dhabihu kwa miungu yao. Kisha mmoja wao ata kukaribisha na wewe utakula baadhi ya dhabihu zake,
16 Mgbe unu lụtara ụfọdụ ndị inyom ha dịka nwunye nye ụmụ unu ndị ikom, ndị inyom ndị a na-akwaso chi ha iko, ga-eme ka ụmụ unu ndị ikom soro ha nʼomume dị otu a.
na kisha utachukuwa baadhi ya mabinti zake kwa wanao, na mabinti wake watafanya ukahaba kwa miungu yao, na watafanya wanao kufanya ukahaba kwa miungu yao.
17 “Unu akpụla chi ọbụla.
Usifanye Miungu ya chuma ya kuyayusha.
18 “Na-emenụ mmemme achịcha na-ekoghị eko. Rienụ achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa, dịka m nyere nʼiwu na a ga-eme nʼụbọchị ndị ahụ a họpụtara, nʼọnwa Abib, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta.
Laziam ushike Sherehe ya Mkate Usiotiwachachu. Kama nilivyo kuamuru, lazima ule mkate usio na hamira kwa siku saba kwa muda uliotengwa wa mwezi wa Abibu, maana nikatika mwezi wa Abibu ulitoka Misri.
19 “Nwa nwoke ọbụla e bụ ụzọ mụọ bụ nke m, tinyere ụmụ anụ ụlọ, ma ehi, ma atụrụ, ma ewu.
Wazaliwa wote ni mwangu, ata mzaliwa wa kwanza wa kiume wa mifugo, yote ya ng'ombe na kondoo.
20 E nwere ike ịgbapụta nwa oke ịnyịnya ibu site nʼiwere nwa atụrụ dochie nʼọnọdụ ya. Ọ bụrụ na i kpebie na ị gaghị agbapụta ya, mgbe ahụ, ị ga-agbaji olu ya. Ma ụmụ unu ndị ikom niile ka a ga-agbapụta. “O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abịa guzo m nʼihu na-ejighị onyinye.
Lazima umnunue tena mzaliwa kwanza wa punda kwa kondoo, lakini usipo mnunua tena, kisha uivunje shingo yake. Lazima ununue tena wazaliwa wa kwanza wote wa wanao. Hakuna ata mmoja atakye kuja kwangu mikono mitupu.
21 “Nʼoge ịkụ ihe nʼubi na nʼoge owuwe ihe ubi, rụọnụ ọrụ naanị ụbọchị isii. Zukwanụ ike nʼụbọchị nke asaa.
Utafanya kazi kwa siku sita, lakini siku ya saba utapumzika. Ata wakati wakilimo na wa mavuno, lazima upumzike.
22 “Mee Mmemme Izu Ụka asaa, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ọka wiiti mee, na Mmemme Nchịkọta Ihe nʼọgwụgwụ afọ ọbụla.
Lazima uadhimishe Sherehe ya Majuma kwa mazao ya kwanza ya mavuno ya ngano, na lazima uadhimishe Sherehe ya Makusanyo mwisho wa mwaka.
23 Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nke Izrel.
Mara tatu kwa mwaka wanaume wenu wote watajitokeza kwa Bwana Yahweh, Mungu wa Israeli.
24 Nʼihi na aga m esite nʼihu unu chụpụ mba dị iche iche. Meekwa ka ala unu saa mbara. Ọ dịghị onye ọbụla ga-enwe anya ukwu nʼebe ala unu dị, mgbe unu na-aga iche onwe unu nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ugbo atọ nʼafọ.
Kwa kuwa nitaondoa mataifa mbele yenu na kutanua mipika. Hakuna atakaye tamani kuwa na ardhi yenu kama yao utakapo toka mbele za Yahweh mara tatu kwa mwaka.
25 “Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nye m. Unu ahapụkwala aja sitere na Mmemme Ngabiga ka ọ nọọ ruo ụtụtụ.
Hautatoa damu ya dhabihu yangu na hamira yeyote, wala nyama yeyote kutoka dhabihu za Sherehe ya Pasaka kubaki hadi asubui.
26 “Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma nʼụlọ Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.”
Lazima ulete matunda ya kwanza yalio bora kutoka nyumbani kwako. Usimchemshe mbuzi mtoto katika maziwa ya mama yake.”
27 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Dee iwu ndị a m nyere gị, nʼihi na dịka okwu ndị a si dị, ka ọgbụgba ndụ mụ na gị na ụmụ Izrel gbara si dị.”
Yahweh akamwabia Musa, “Andika chini haya maneno, kwa kuwa nimejiahidi haya maneno niliyo yasema, na nimefanya agano kwako na Israeli.”
28 Mosis na Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ.
Musa alikuwa huko na Yahweh kwa siku arobaini na usiku; hakula chakula chochote wala kunywa maji yeyote. Aliandika katika mbao maneno ya agano, Amri kumi.
29 Mgbe Mosis ji mbadamba nkume abụọ nke ihe ama ahụ na-arịdata site nʼelu ugwu ahụ, ọ mataghị na ihu ya na-egbuke egbuke, nʼihi ọnọdụ nke ọ nọrọ nʼihu Onyenwe anyị.
Musa alipo shuka chini ya Mlima Sinai na mbao mbili za agano za ushuhuda mikononi mwake, hakujua kuwa ngozi ya kuwa uso wake ulikuwa wa'ngaa akizungumza na Mungu.
30 Nʼihi mgbuke ahụ ihu Mosis na-egbuke, ụjọ ekweghị Erọn na ụmụ Izrel bịaruo ya nso.
Wakati Aruni na Waisraeli walipo muona Musa, ngozi ya uso wake ulikuwa wa ng'aa, na waliogopa kuja karibu yake.
31 Ma Mosis kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Nʼihi ya, Erọn na ndị ndu nzukọ Izrel bịara ka ha na Mosis kparịtaa ụka.
Lakini Musa aliwaita, na Aruni na viongozi wa jamii wakaja kwake. Kisha Musa akasema nao.
32 Mgbe e mesịrị, ndị Izrel niile bịakwutere ya. O nyekwara ha iwu ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ya nʼelu ugwu Saịnaị.
Baada ya haya, watu wote wa Israeli wakaja kwa Musa, na akawambia amri zote Yahweh alizo mpa katika Mlima Sinai.
33 Mgbe Mosis gwachara ha okwu, o weere akwa kpuchie ihu ya.
Musa alipo maliza kuzungumza nao, alifunika uso wake kwa kitambaa.
34 Ma mgbe ọbụla ọ na-abanye nʼihu Onyenwe anyị ka ha kparịtaa ụka nʼime ụlọ nzute ahụ, ọ na-ekepụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya tutu ruo mgbe ọ nọchara pụta. Mgbe ọ pụtara, ọ na-agwa ndị Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
Wakati Musa alipoenda mbele za Yahweh kusema naye, aliondoa kitambaa, hadi alipo toka. Alipo toka, aliwaambia Waisraeli alicho amriwa kusema.
35 Ha hụkwara na ihu ya na akpụkpọ ihu ya na-egbuke egbuke. Emesịa, Mosis na-ekpuchikwa ihu ya tutu ruo mgbe ọ ga-abanye nʼime ka ya na Onyenwe anyị kparịta ụka.
Waisraeli walipo muona Musa ana'ngaa uso, alirudisha kitambaa tena usoni mpaka alipokuwa anaenda kuongea na Yahweh.

< Ọpụpụ 34 >