< Ndị Efesọs 3 >

1 Ọ bụ nʼihi nke a ka mụ onwe m bụ Pọl bụ onye mkpọrọ nke Jisọs Kraịst maka unu ndị mba ọzọ.
For this cause, I Paul, the prisoner of Jesus Christ for you Gentiles,
2 Nʼihi nʼezie, unu anụla banyere nlekọta nke amara Chineke ahụ nke e nyere m maka ọdịmma unu.
If ye have heard of the dispensation of the grace of God which is given me on your account.
3 Otu e si kpughee nzube nzuzo ya niile nye m, dị ka m gwara unu ihe banyere ya nʼokwu dị nta nʼakwụkwọ ozi ahụ m detara unu.
That by revelation he made known to me the mystery, as I wrote before in few words;
4 Ọ bụrụkwa na unu agụọ akwụkwọ ahụ m deere, unu ga-aghọta ihe m maara banyere ihe omimi Kraịst.
By which when ye read, ye may understand my knowledge in the mystery of Christ,
5 Nke a e meghị ka ụmụ mmadụ mara nʼọgbọ gara aga dị ka Mmụọ Nsọ siri kpugheere ya ndị ozi na ndị amụma ya dị nsọ ugbu a.
Which in other ages was not made known to the sons of men, as it is now revealed to his holy apostles and prophets by the Spirit;
6 Otu a ka ndị mba ọzọ si soro bụrụ ndị nketa, ndị ga-abụ otu anụ ahụ na ndị ga-eketa nkwa ahụ nʼime Jisọs Kraịst site nʼoziọma.
That the Gentiles should be joint-heirs, and of the same body, and partakers of his promise in Christ by the Gospel:
7 E mere m ka m bụrụ onyeozi nke oziọma a, dịka onyinye amara nke Chineke si dị, bụ nke e nyere m site nʼịrụ ọrụ nke ike ya.
Of which I was made a minister, according to the gift of the grace of God given to me by the effectual working of his power.
8 Ọ bụ ezie na mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nʼetiti ndị nsọ niile, e nyere m amara nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ nke enweghị atụ nke juru nʼime Kraịst,
To me, who am less than the least of all saints, is this grace given, that I should preach among the Gentiles the unsearchable riches of Christ;
9 meekwa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmatụ nke ihe omimi e zoro nʼime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ. (aiōn g165)
And to make all [men] see what is the fellowship of the mystery, which from the beginning of the world hath been hid in God, who created all things by Jesus Christ: (aiōn g165)
10 Ka ọ ga-abụ site na chọọchị, a ga-eme ka amamihe Chineke nʼụdị dị iche iche bụrụ ihe ọchịchị na ikike niile dị nʼeluigwe ga-amata.
To the intent that now to the principalities and powers in heavenly [places] might be known by the church the manifold wisdom of God,
11 Nke a bụ nʼusoro nke atụmatụ ya dị ebighị ebi, nke e mezuru nʼime Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, (aiōn g165)
According to the eternal purpose which he purposed in Christ Jesus our Lord: (aiōn g165)
12 bụ onye anyị nwere ntụkwasị obi na obi siri ike ịbịakwute site nʼokwukwe anyị nwere na ya.
In whom we have boldness and access with confidence by the faith of him,
13 Nʼihi nke a, arịọ m ka unu ghara ịda mba maka mkpagbu m nʼihi unu, ha bụ otuto nye unu.
Wherefore I desire that ye faint not at my tribulations for you, which is your glory.
14 Ọ bụ nʼihi nke a ka m na-egbu ikpere m nʼala nʼihu Nna anyị,
For this cause I bow my knees to the Father of our Lord Jesus Christ,
15 onye ezinaụlọ niile dị nʼụwa a na nke dị nʼeluigwe na-esite nʼaka ya enwe aha.
Of whom the whole family in heaven and earth is named,
16 Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu;
That he would grant you according to the riches of his glory to be strengthened with might by his Spirit in the inner man;
17 ka Kraịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya.
That Christ may dwell in your hearts by faith; that ye, being rooted and grounded in love,
18 Ana m arịọkwa, ka unu na ndị nsọ niile nwee ike ịghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi,
May be able to comprehend with all saints what [is] the breadth, and length, and depth, and highth.
19 na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke.
And to know the love of Christ, which passeth knowledge, that ye may be filled with all the fullness of God.
20 Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ imebiga ihe nʼoke karịa ihe niile nke anyị rịọrọ, maọbụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nʼuche anyị, site nʼike ya nke na-arụ ọrụ nʼime anyị,
Now to him that is able to do exceeding abundantly above all that we ask or think, according to the power that worketh in us.
21 ọ bụ ya ka otuto dịrị nʼime chọọchị na nʼime Kraịst Jisọs ruo ọgbọ niile nke mgbe niile, ebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
To him [be] glory in the church by Christ Jesus throughout all ages, world without end. Amen. (aiōn g165)

< Ndị Efesọs 3 >