< Diuteronomi 6 >

1 Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ, na ikpe niile nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nyere m nʼiwu ka a kuziere unu ka unu debe, nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.
Sasa haya ni maagizo, amri, na sheria ambazo Yahwe Mungu wetu ameniamuru mimi kuwafundisha ninyi, ili kwamba muweze kuzishika katika nchi ambayo mnaenda ng'ambo ya pili ya Yordani kumiliki,
2 Ihe e ji nye iwu ndị a bụ ka unu na ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, site nʼidebe iwu ya, ogologo ndụ unu niile. Ọ bụrụ na unu emee ya, unu ga-enwe ndụ ogologo.
ili kwamba mpate kumheshimu Yahwe wenu, ili muzishike amri zake zote na maagizo ninayowaamuru-ninyi, wana wenu na wana wa wana wenu, siku zenu zote za maisha, ili kwamba siku zenu ziongezeke.
3 Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa.
Kwa hiyo wasikilizeni, Israeli, na kuzishika ili kwamba iweze kuwa vizuri kwenu, ili kusudi muweze kuzidi mno kwenye nchi itiririkayo maziwa na asali, kama Yahwe Mungu wa Baba zenu, amewaahidi atafanya.
4 Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.
Sikiliza, Israel: Yahwe Mungu wetu ni mmoja.
5 Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya.
Mtampenda Yahwe Mungu wenu kwa moyo wenu wote, kwa roho zenu zote, na kwa akili zenu zote.
6 Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi.
Maneno ninayowaamuru ninyi leo yatakuwa katika moyo wenu;
7 Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
na mtayafundisha kwa bidii kwa watoto wenu, mtayazungumza wakati mkaapo katika nyumba zenu, wakati mlalapo, na wakati mwinukapo.
8 Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.
Utazifunga kama ishara juu ya mkono wako, nayo yatakuwa utepe kati ya macho yako.
9 Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.
Utaziandika kwenye miimo ya mlango ya nyumba yako na kwenye malango.
10 Mgbe Onyenwe anyị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị,
Wakati Yahwe Mungu wako akuleta kwenye nchi ambayo aliaapa kwa baba zako, Ibrahimu, Isaka, na Yakobo, kwamba angekupa, pamoja na miji mikubwa na mizuri ambayo hamkuijenga,
11 na ụlọ ihe ọma dị iche iche jupụtara nʼime ya nke unu na-azụghị, na olulu mmiri unu na-egwughị nʼonwe unu, na ubi vaịnị na ọtụtụ osisi oliv unu na-amaghị ndị kụrụ ha, mgbe unu riri ihe rijuo afọ,
na nyumba zilizojaa kila aina ya vitu vizuri ambavyo hamkuzifanya, visima ambavyo hamkuvichimba, mashamba na miti ya mizeituni ambayo hamkuipanda, mtakula na kutosheka-
12 leruonu anya, ka unu ghara ichefu Onyenwe anyị, onye mere ka unu site nʼala Ijipt pụta, bụ ala ebe unu bụ ohu.
basi iweni makini ili kwamba msije kumsahau Yahwe, aliyewaleta toka nchi ya Misri, toka nyumba ya utumwa.
13 Onyenwe anyị bụ Chineke gị, ka ị ga-atụ egwu, naanị ya ka ị ga-efe ofufe, ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji ṅụọ iyi.
Mtamheshimu Yahwe Mungu wenu, yeye mtamwabudu, na mtaapa kwa jina lake.
14 Unu agbasola chi ndị ọzọ, bụ chi ndị niile a gbara unu gburugburu na-efe.
Hamtawaendea miungu mingine, miungu ya watu wanaowazunguka wote-
15 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu, bụ Chineke ekworo. Ọ ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide unu, ọ ga-ekpochapụkwa unu site nʼelu ụwa.
kwa kuwa Yahwe Mungu wenu katikati yenu ni Mungu wa wivu- kama mtafanya, hasira ya Yahwe Mungu wenu atawasha dhidi yenu na atawaangamiza kutoka kwenye uso wa dunia.
16 Anwala Onyenwe anyị, bụ Chineke gị ọnwụnwa, dịka unu nwara ya na Masa.
Hamtamjaribu Yahwe Mungu wenu kama mlivyomjaribu huko Massah.
17 Lezienụ anya hụ na unu debere iwu niile na ụkpụrụ niile, na ihe ama niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.
Kwa bidii mtayashika maagizo ya Yahwe Mungu wenu, maagizo yake makini, na amri ambazo amewaamuru.
18 Meenụ ihe ziri ezi, na nke dị mma nʼanya Onyenwe anyị, ka ihe niile gaara unu nke ọma, ka unu nweekwa ike ịbanye, ma nweta ezi ala ahụ Onyenwe anyị ji ịṅụ iyi kwee nna nna unu ha na nkwa.
Mtafanya kile kilicho sahihi na kizuri katika macho ya Yahwe, kwamba iwe vizuri kwenu, na kwamba muweze kuingia na kumiliki nchi nzuri ambayo Yahwe aliaapa kwa baba zenu,
19 Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru.
kuwaondoa maadui zenu wote mbele zenu, kama Yahwe alivyosema.
20 Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?”
Wakati mwana wako auliza kwa wakati unaokuja, kusema,”Ni zipi amri za gano, sheria, na amri zingine ambazo Yahwe Mungu wetu alituamuru?
21 Ị ga-aza ya sị, “Anyị bụrị ndị ohu Fero nʼala Ijipt, ma site nʼike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị kpọpụtara anyị site nʼala Ijipt.
Basi utasema kwa mwana wako, tulikuwa watumwa wa Farao huko Misri, Yahwe alitutoa Misri kwa mkono wa uweza,
22 Nʼihu anyị, Onyenwe anyị zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile.
na alionesha ishara na maajabu, makuu na makali, Misri kwa Farao, na kwa nyumba yake yote, mbele ya macho yenu,
23 Ma o mere ka anyị site nʼIjipt pụta, ịkpọbata na inye anyị ala ahụ o ji ịṅụ iyi kwee nna nna anyị ha na nkwa.
na alitutoa kutoka huko, ili kwamba atulete ndani, kutupa nchi ambayo aliaapa kwa baba zetu.
24 Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji nye anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, na-atụ Onyenwe anyị Chineke anyị egwu, ka anyị bụrụ ndị ihe ga-agara nke ọma ụbọchị niile, ndị a na-edebe ndụ, dịka ọ dị taa.
Yahwe alituamuru daima kuzishika amri hizi, kumuogopa Yahwe Mungu wetu kwa uzuri wetu, ili kwamba atuweke hai, kama tulivyo leo.
25 Ọ bụrụ na anyị elezie anya debe iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị, dịka o nyere anyị nʼiwu, anyị ga-abụ ndị na-ejegharị nʼezi omume.”
Kama tutashika maagizo haya yote mbele ya Yahwe Mungu wetu kama alivyotuamuru, hii itakuwa haki yetu.

< Diuteronomi 6 >