< Daniel 12 >

1 “Nʼoge ahụ, Maikel, onyeisi ọchịchị ukwuu ahụ, nke na-eche ndị unu, ga-ebili. Ọ ga-abụ oge nhụju anya, a na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe mba ọbụla malitere ruo ugbu a. Ma mgbe ahụ, ndị gị niile, ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ ahụ, ka a ga-anapụta.
Katika kipindi hicho, Mikaeli, jemedari mkuu ambaye huwalinda watu wako, atainuka. Kutakuwa na wakati wa mateso ambao haujawahi kutokea tangu mwanzo wa taifa lolote mpaka kipindi hicho. Katika muda huo watu wako wataokolewa, yeyote ambaye jina lake litapatikana katika kitabu.
2 Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi.
Na wengi wa wale waliolala katika mavumbi ya dunia watainuka. baadhi kwa uzima wa milele na baadhi kwa ajili ya fedheha na matwezo ya milele.
3 Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi.
Wale wenye hekima watang'ara kama mng'ao wa anga la juu, na wale wenye kuwaelekeza wengine katika haki, watakuwa kama nyota milele na milele.
4 Ma gị bụ Daniel, zoo okwu e dere nʼakwụkwọ a, mechiekwa ma kachiekwa ha akara tutu ruo ọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ga-agbagharị ebe na ebe ọzọ, ma ihe ọmụma ga-aba ụba.”
Lakini wewe, Danieli, yafunge maneno haya; kihifadhi kitabu kikiwa kimetiwa chapa mpaka nyakati za mwisho. Watu wengi watakimbia huku na kule, na maarifa yataongezeka.
5 Mgbe ahụ, mụ bụ Daniel weliri anya hụ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha nọ nʼakụkụ osimiri ahụ, otu nʼakụkụ nke a, otu nʼakụkụ nke ọzọ.
Kisha mimi, Danieli, nilitazama, na kulikuwa na malaika wengine wawili wamesimama. Mmoja alisimama katika upande huu wa ukingo wa mto, na mwingine alisimama katika ukingo wa upande mwingine wa mto.
6 Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?”
Mmoja wao alimwambia mtu aliyevaa nguo za kitani, yeye aliyekuwa juu ya mkondo wa mto, “Je itachukua muda gani mpaka mwisho wa matukio haya ya kushangaza?”
7 Nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nọ nʼakụkụ elu elu mmiri nke osimiri ahụ chịlịri aka nri na aka ekpe ya elu. Anụkwara m mgbe o ji Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi, “Nʼihe ndị a ga-emezu naanị mgbe afọ atọ na ọkara gafere, tupu onye ahụ na-emebi ike nke ndị dị nsọ ga-abịa nʼisi ngwụcha ndụ ya, ihe ndị a niile ga-emezucha.”
Nilimsikia mtu yule aliyevaa nguo za kitani, aliyekuwa juu katika mkondo wa mto, aliinua mkono wake wa kuume na mkono wake wa kushoto kuelekea mbinguni na kuapa kwa yeye aishiye milele kwamba itakuwa kwa wakati, nyakati, na nusu wakati. Na wakati nguvu za watu watakatifu zitakapokuwa zimeshaharibiwa, mambo haya yote yatakuwa yamemalizika.
8 Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?”
Nilisikia, lakini sikufahamu. Basi nikamwuliza, “Bwana wangu, mambo haya yote yatakuwa na matokeo gani?”
9 Ọ sịrị, “Daniel, gawara onwe gị. Nʼihi na-apịachiela okwu ndị a, kachiekwa ya akara tutu ruo nʼọgwụgwụ oge.
Alisema, “Nenda zako Danieli, kwa kuwa maneno yamefungwa na kutiwa chapa mpaka wakati wa mwisho.
10 Ọtụtụ ka a ga-eme ka ha dị ọcha, sachaa ha mee ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ, a ga-anụchakwa ha. Ma ndị ajọ omume ga-aga nʼihu nʼajọ omume ha. O nweghị onye ajọ omume nke ga-aghọtakwa ihe, ma ndị ahụ maara ihe ga-aghọta ihe ihe a pụtara.
Watu wengi watakuwa wametakaswa, wameoshwa, na kusafishwa, lakini waovu wataenenda katika uovu.
11 “Site nʼoge e mechiri ịchụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị niile ruo nʼoge a ga-ewuli ihe arụ ahụ nke na-eweta mbibi, ga-abụ otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị itoolu.
Katika muda ule ambapo sadaka ya kawaida ya kuteketezwa itakapokuwa imeondolewa na chukizo la uharibifu liliosababisha ukiwa limesimamishwa, kutakuwa na siku zipatazo 1, 290.
12 Ngọzị ga-adịrị onye ahụ nke na-echere, ma nọgidesịkwa ike ruo mgbe otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị atọ, na iri ụbọchị atọ na ise ahụ gafere.
Ana heri mtu yule anayengojea mpaka mwisho wa siku 1, 335.
13 “Ma gị onwe, gawara onwe gị ruo ọgwụgwụ ihe ndị a. Ị ga-ezukwa ike, ị ga-ebilitekwa nʼoge ikpeazụ ịnara ihe nketa nke ruuru gị.”
Unapaswa uondoke uende njia yako hata mwisho, na kisha utapumzika. Utainuka katika sehemu uliyopewa, mwishoni mwa siku.”

< Daniel 12 >