< Ọrụ Ndị Ozi 4 >
1 Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị Sadusii bịakwutere ha.
And as they spoke to the people, the priests and the captain of the temple and the Sadducees approached them,
2 Ha were oke iwe nʼihi na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa na nʼime Jisọs ka mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị.
being greatly annoyed because of their teaching the people, and proclaiming in Jesus the resurrection of the dead.
3 Ha jidere ha tinye ha nʼụlọ mkpọrọ, ruo nʼechi ya. Nʼihi na oge e jidere ha bụ nʼoge uhuruchi.
And they threw hands on them, and put them in custody for the morrow, for it was now evening.
4 Ma ọtụtụ ndị nụrụ okwu ahụ kwenyere. Ọnụọgụgụ ha ruru ihe dị ka puku mmadụ ise.
But many of those who heard the word believed, and the number of the men became about five thousand.
5 Nʼechi ya, ndị na-achị achị, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ na Jerusalem.
And it came to pass on the morrow, to be assembled in Jerusalem, their rulers, and elders, and scholars,
6 Onyeisi nchụaja bụ Anas nọ nʼebe ahụ, na Kaịfas na Jọn na Alegzanda, na ndị ọzọ bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja.
and Annas the high priest, and Caiaphas, and John, and Alexander, and as many as were of the high priestly family.
7 Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?”
And after placing them in the midst, they inquired, By what power, or in what name, have ye done this?
8 Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye.
Then Peter being filled with the Holy Spirit, said to them, Rulers of the people, and elders of Israel,
9 Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya,
if we are examined today about a good deed, of a feeble man, by what this man has been healed,
10 ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ.
be it known to you all, and to all the people of Israel, that in the name of Jesus Christ the Nazarene, whom ye crucified, whom God raised from the dead, by this, this man stands here before you healthy.
11 Jisọs a bụ “‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’
This is the stone that was rejected by you who build, which became into the head of the corner.
12 Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”
And salvation is not in any other man, for there is no other name under the heaven, that has been given among men, by which we must be saved.
13 Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu Pita na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na Jisọs nọkọrọ.
Now when they saw the boldness of Peter and John, and having perceived that they are illiterate and uneducated men, they marveled. And they recognized them, that they had been with Jesus.
14 Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a.
And seeing the man who was healed standing with them, they had nothing to contradict.
15 Ha nyere iwu ka ha si nʼụlọikpe ahụ pụọ, ma bido ịgba izu nʼetiti onwe ha banyere nke a.
But after commanding them to go outside of the council, they conferred among each other,
16 Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na Jerusalem maara ihe banyere nke a.
saying, What will we do to these men? For that indeed a notable sign has happened by them, is apparent to all who dwell in Jerusalem, and we cannot deny it.
17 Ma iji mee ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla okwu banyere aha nwoke a.”
But that it may not spread on further among the people, let us threaten them with threats to speak no longer in this name, to not one man.
18 Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha Jisọs.
And having called them, they commanded them entirely, not to utter nor to teach in the name of Jesus.
19 Ma Pita na Jọn zara sị ha, “Kpeenụ ikpe a nʼonwe unu, maọbụ ihe ziri ezi nʼanya Chineke ige unu ntị karịa ige Chineke ntị?
But Peter and John having replied to them, they said, Whether it is right in the sight of God to hearken to you rather than God, judge ye.
20 Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.”
For we are not able not to speak what we saw and heard.
21 Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere.
And they, having further threatened, released them, finding nothing how they might punish them, because of the people. Since all glorified God for that which happened.
22 Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ.
For the man was more than forty years old on whom this sign of healing had occurred.
23 Mgbe ha hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị ibe ha ihe ndịisi nchụaja na ndị okenye gwara ha.
And after being released, they went to their own men, and reported as many things as the chief priests and the elders said to them.
24 Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile ji otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gị onwe gị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha.
And those who heard lifted up a voice to God with one accord, and said, Thou Master, the God who made the heaven and the earth and the sea, and all things in them.
25 Ọ bụ gị sitere nʼaka Mmụọ Nsọ site nʼọnụ nna anyị Devid, onye na-ejere gị ozi, sị: “‘Gịnị mere mba niile ji eme oke mkpọtụ? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
He who said through the mouth of thy boy David, Why do the nations rage, and the peoples meditate vain things?
26 Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa, imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.’
The kings of the earth stood up, and the rulers were gathered together, against the Lord, and against his Christ.
27 Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs Pailet, na ndị mba ọzọ, nakwa ndị Izrel ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ Jisọs, onye i tere mmanụ,
For in truth, against thy holy Boy Jesus, whom thou anointed, both Herod and Pontius Pilate, with the Gentiles and the peoples of Israel, were gathered together,
28 ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu.
to do as many things as thy hand and thy purpose predetermined to happen.
29 Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla.
And now, Lord, look upon their threats, and grant to thy bondmen with all boldness to speak thy word,
30 Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jisọs.”
by thy stretching forth thy hand for healing, and signs and wonders to happen through the name of thy holy Boy Jesus.
31 Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.
And when they prayed, the place in which they were assembled was shaken, and they were all filled with the Holy Spirit, and they spoke the word of God with boldness.
32 Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere.
And the multitude of those who believed were of one heart and soul. And not even one man said that anything of the things that was possessed by him was his own, but all things were common to them.
33 Ndị ozi sitere nʼike gaa nʼihu na-agba ama banyere mbilite nʼọnwụ Onyenwe anyị Jisọs, oke amara bakwaara ha niile ụba.
And with great power the apostles gave back the testimony of the resurrection of the Lord Jesus, and great grace was upon them all.
34 O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha,
For not even any needy was among them, for as many as were owners of lands or houses, selling, they brought the proceeds of the things that were sold,
35 nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị.
and placed them at the apostles' feet. And it was distributed to each, according as any man had need.
36 Josef onye ikwu Livayị, onye sitere na Saiprọs, onye ndị ozi na-akpọ Banabas (nke pụtara “nwa nke nkasiobi”).
And Joses, who was surnamed by the apostles, Barnabas (which is, being translated, son of encouragement), a Levite, a Cypriot by nationality,
37 O rere ala o nwere, weta ego ya, ma tọgbọ ya nʼụkwụ ndị ozi.
having sold a field that was possessed by him, brought the money and placed it at the apostles' feet.