< Ọrụ Ndị Ozi 3 >

1 Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie.
Da bi Petro ne Yohane kɔɔ asɔredan mu awia nnɔnabiɛsa a na ɛyɛ bere a wɔde bɔ mpae.
2 Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.
Wɔreyɛ adu asɔredan pon a wɔfrɛ no Ɔpon Fɛfɛ ano no, wohuu obubuafo bi sɛ ɔda hɔ. Na wɔsoa saa obubuafo yi de no bɛto ɔpon yi ano da biara ma ɔsrɛsrɛ sika fi wɔn a wɔrekɔ asɔredan no mu no nkyɛn.
3 Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ.
Bere a ohuu sɛ Petro ne Yohane rekɔ mu no, ɔsrɛɛ wɔn se wɔmma no biribi.
4 Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.”
Wɔhwɛɛ nʼanim dinn na Petro ka kyerɛɛ no se, “Hwɛ yɛn!”
5 O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye.
Ɔhwɛɛ wɔn susuw sɛ wɔbɛma no biribi.
6 Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.”
Nanso Petro ka kyerɛɛ no se, “Sika de, minni bi; na nea mewɔ a mede bɛma wo ne sɛ Yesu Kristo Nasareni din mu, sɔre nantew!”
7 O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike.
Afei Petro de ne nsa nifa soo no mu maa no so gyinaa hɔ. Prɛko pɛ, nʼanan mu yɛɛ den.
8 Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.
Ohuruw gyinaa nʼanan so na ofii ase nantewee. Afei ɔne wɔn nyinaa kɔɔ asɔredan no mu a ɔrehuruhuruw, rekamfo Onyankopɔn.
9 Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke,
Nnipa no nyinaa huu no sɛ ɔnam reyi Onyankopɔn ayɛ.
10 ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya.
Wohuu no no, wohuu sɛ ɔno ne ɔsrɛsrɛni a na ɔda asɔredan pon a wɔfrɛ no Ɔpon Fɛfɛ no ano no, wɔn ho dwiriw wɔn.
11 Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn.
Bere a nnipa no huu sɛ ɔbarima no ne Petro ne Yohane nam no, wɔn ho dwiriw wɔn; enti wotuu mmirika kɔɔ wɔn nkyɛn wɔ baabi a wɔfrɛ no Salomo Abrannaa no so hɔ.
12 Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije?
Bere a Petro huu nnipadɔm no, ɔka kyerɛɛ wɔn se, “Israelfo, adɛn na eyi yɛ mo nwonwa? Adɛn nti na mohwɛ yɛn, susuw sɛ yɛnam yɛn tumi anaa yɛn som pa so na asa ɔbarima yi yare?
13 Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa.
Abraham, Isak ne Yakob Nyankopɔn ne yɛn nenanom Nyankopɔn ama ne somfo Yesu ɔsoro anuonyam. Mode no maa atumfo; na bere a Pilato yɛɛ sɛ obegyaa no no mpo, mopoo no wɔ nʼanim.
14 Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ.
Na ɔyɛ Kronkron, ɔteɛ; nanso mopoo no na mosrɛɛ Pilato sɛ ɔmfa odwotwafo mma mo.
15 Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a.
Enti mukum obi a ogye nnipa kɔ nkwa mu. Nanso Onyankopɔn nyan no fii awufo mu na yɛyɛ eyi ho nnansefo.
16 Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.
Tumi a ɛwɔ ne din mu no na ɛmaa saa obubuafo yi nyaa ahoɔden. Gyidi a yɛwɔ wɔ ne din mu no na ɛma yetumi yɛɛ saa anwonwade a muhu yi. Gyidi a yɛwɔ wɔ Yesu din mu no na ama ne ho atɔ no a ogyina mo anim mprempren yi.
17 “Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu kpara agwa na-amaghị ama, dịka ndị ndu unu sikwara kpaa.
“Afei me nuanom, minim sɛ nea mo ne mo mpanyimfo yɛɛ Yesu no, na onim na munnim.
18 Ma Chineke siri otu a mezuo ihe o kwuru site nʼọnụ ndị amụma niile na Kraịst ya aghaghị ịhụ ahụhụ.
Tete no, Onyankopɔn nam nʼadiyifo so kae se Agyenkwa no behu amane. Na ɔnam saa kwan yi so ma ɛbaa mu.
19 Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu,
Monsakra mo adwene na momfa mo ho mma Onyankopɔn na wɔbɛpepa mo bɔne, na moanya foforoyɛ mmere afi Awurade hɔ,
20 ka enyekwa unu ntute nke ime mmụọ nke sitere nʼihu Onyenwe anyị, ma zitekwara unu Kraịst ahụ, bụ onye ahọpụtara nye unu, nke bụ Jisọs.
na wasoma Yesu a ɔyɛ Agyenkwa a wɔayi no ama mo no.
21 Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ. (aiōn g165)
Sɛnea Onyankopɔn nam nʼadiyifo akronkron so aka dedaw no, ɛsɛ sɛ ɔtena ɔsoro kosi sɛ nneɛma nyinaa bɛyɛ foforo. (aiōn g165)
22 Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu.
Na Mose kae se, ‘Awurade, mo Nyankopɔn bɛsoma odiyifo aba mo nkyɛn sɛnea ɔsomaa me a mifi mo mu no. Ɛsɛ sɛ mutie asɛm biara a ɔbɛka akyerɛ mo.
23 Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’
Obiara a wantie nea odiyifo no bɛka no, wobeyi no afi Onyankopɔn nkurɔfo ho na wɔasɛe no.’
24 “Nʼezie ndị amụma niile site na Samuel na ndị ọzọ so ya nʼazụ, bukwara amụma banyere ụbọchị ndị a.
“Samuel ne adiyifo a akyiri no wɔbae no nyinaa nso aka asɛm a asi nnɛ yi ho asɛm pɛn.
25 Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’
Onyankopɔn bɔ a ɔnam adiyifo so hyɛe no yɛ mo dea. Saa ara nso na mowɔ kyɛfa wɔ apam a Onyankopɔn ne mo agyanom pam no mu. Sɛnea ɔka kyerɛɛ Abraham se, ‘Wʼasefo so na menam behyira wiasefo nyinaa.’
26 Mgbe Chineke kpọlitere onyeozi ya, o buuru ụzọ zitere unu ya, ka ọ gọzie unu site nʼime ka onye ọbụla nʼime unu chegharịa site nʼụzọ ọjọọ ya.”
Enti Onyankopɔn dii kan yii ne somfo somaa no baa mo nkyɛn sɛ ɔmmɛdom mo na mo nyinaa nnan mfi mo akwammɔne no so.”

< Ọrụ Ndị Ozi 3 >