< 2 Samuel 1 >

1 Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag.
Atamwalira Sauli, Davide anabwerako kumene anakagonjetsa Aamaleki ndipo anakakhala ku Zikilagi masiku awiri.
2 O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ.
Pa tsiku lachitatu munthu wina wochokera ku msasa wa Sauli anafika, zovala zake zitangʼambika ndiponso anali atathira dothi pamutu pake. Atafika kwa Davide, anadzigwetsa pansi, kupereka ulemu kwa Davideyo.
3 Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?” Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.”
Davide anamufunsa iye kuti, “Kodi iwe wachokera kuti?” Iye anayankha kuti, “Ine ndathawa ku misasa ya Aisraeli.”
4 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.” Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!”
Davide anafunsa, “Tandiwuza, chachitika ndi chiyani?” Iye anati, “Anthu athawa ku nkhondo ndipo ambiri aphedwa. Sauli ndi mwana wake Yonatani aphedwa.”
5 Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”
Ndipo Davide anati kwa mnyamata amene anabweretsa nkhaniyi, “Ukudziwa bwanji kuti Sauli ndi mwana wake Yonatani afa?”
6 Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike.
Mnyamatayo anati, “Zinangochitika kuti ndinali pa phiri la Gilibowa, ndipo Sauli anali komweko ataweramira pa mkondo wake, pamodzi ndi magaleta ndi okwera ake atamuyandikira.
7 Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’
Pamene anatembenuka ndi kundiona ine, iye anandiyitana, ndipo ndinati, ‘Kodi ndichite chiyani?’”
8 “Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’ “Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’
Iye anandifunsa, “Iwe ndiwe yani?” Ine ndinayankha kuti, “Ndine Mwamaleki.”
9 “Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’
“Kenaka iye anati kwa ine, ‘Bwera pafupi ndipo undiphe! Ndikumva ululu kwambiri, koma ndikanali ndi moyo!’
10 “Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.”
“Kotero ndinabwera pafupi ndi kumupha, chifukwa ndinadziwa kuti mmene anagweramo sakanakhalanso ndi moyo. Ndipo ndatenga chipewa chaufumu chimene chinali pamutu pake ndi khoza la pa dzanja lake ndipo ndazibweretsa kwa inu mbuye wanga.”
11 Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha.
Apo Davide ndi anthu onse amene anali nawo anangʼamba zovala zawo.
12 Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha Onyenwe anyị na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha.
Iwo analira maliro ndi kusala zakudya mpaka madzulo chifukwa cha Sauli ndi mwana wake Yonatani, komanso chifukwa cha gulu la ankhondo la Yehova ndi nyumba ya Israeli, chifukwa anaphedwa ndi lupanga.
13 Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?” Ọ zara sị ya, “Abụ m onye ọbịa, onye Amalek.”
Davide anati kwa mnyamata amene anabweretsa uthengawo, “Iwe umachokera kuti?” Iye anayankha kuti, “Ine ndine mwana wa mlendo Mwamaleki.”
14 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye Onyenwe anyị tere mmanụ?”
Davide anamufunsanso kuti, “Nʼchifukwa chiyani sunaope kukweza dzanja lako ndi kupha wodzozedwa wa Yehova?”
15 Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya.
Kenaka Davide anayitana mmodzi mwa anyamata ake ndipo anati, “Pita ukamukanthe!” Kotero iye anapita kukamukantha, ndipo mnyamata uja anafa.
16 Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’”
Pakuti Davide anali atanena kwa iye kuti, “Iwe wadzipha wekha. Pakamwa pako pakunena zokutsutsa wekha, pamene unanena kuti, ‘Ine ndapha wodzozedwa wa Yehova.’”
17 Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan.
Davide anayimba nyimbo iyi ya maliro, kulira Sauli ndi mwana wake Yonatani.
18 O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.
Ndipo analamula kuti anthu a ku Yuda aphunzitsidwe nyimbo ya maliroyi imene yalembedwa mʼbuku la Yasari:
19 “Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. Lee ka ndị bụ dike si daa!
“Ulemerero wako iwe Israeli, wagona utaphedwa ku zitunda. Taonani amphamvu agwa kumeneko!
20 “Ekwutela ya na Gat. Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn. Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ.
“Musakanene zimenezi ku Gati, musazilengeze ku misewu ya ku Asikeloni, kuti ana aakazi a Afilisti angasangalale, ana aakazi a osachita mdulidwe angakondwere.
21 “Unu ugwu Gilboa, ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu. Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta ndị dị ike. E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ.
“Inu mapiri a ku Gilibowa, musakhalenso ndi mame kapena mvula, kapena minda yobereka zopereka za ufa. Pakuti kumeneko chishango cha munthu wamphamvu chinadetsedwa, chishango cha Sauli sanachipakenso mafuta.
22 “Site nʼọbara ndị e gburu egbu, site nʼanụ ahụ ndị dị ike. Ụta Jonatan alọghachighị azụ. Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi.
“Pa magazi a ophedwa, pa mnofu wa amphamvu, uta wa Yonatani sunabwerere, lupanga la Sauli silinabwere chabe.
23 Sọl na Jonatan, na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara. Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha. Ha dị gara gara karịa ugo. Ha dị ike karịa ọdụm.
“Sauli ndi Yonatani, pa moyo wawo anali okondedwa ndi okoma mtima, ndipo pa imfa yawo sanasiyanitsidwe. Iwo anali ndi liwiro loposa ziwombankhanga, anali ndi mphamvu zoposa mkango.
24 “Ụmụada Izrel, kwaaranụ Sọl akwa. Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma. Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.
“Inu ana aakazi a Israeli, mulireni Sauli, amene anakuvekani zovala zofiira ndi zofewa, amene anakometsera zovala zanu ndi zokometsera zagolide.
25 “Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha. E gbuola Jonatan nʼelu ugwu;
“Taonani amphamvu agwa ku nkhondo! Yonatani wagona ataphedwa ku zitunda.
26 ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m. Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi karịa ịhụnanya ndị nwanyị.
Ine ndikuvutika mumtima chifukwa cha iwe mʼbale wanga Yonatani, unali wokondedwa kwambiri kwa ine. Chikondi chako pa ine chinali chopambana, chopambana kuposa chikondi cha akazi.
27 “Lee ka ndị dị ike si daa! Ngwa agha niile abụrụla ihe lara nʼiyi!”
“Taonani amphamvu agwa! Zida zankhondo zawonongeka!”

< 2 Samuel 1 >