< 2 Ndị Eze 7 >

1 Ịlaisha zara sị ya, “Nụrụ okwu Onyenwe anyị. Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Nʼoge dịka mgbe a echi, a ga-ere otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, rekwaa akpa nta ọka balị abụọ otu shekel nʼọnụ ụzọ ama obodo Sameria.”
Elisha akasema, “Sikiliza neno la Yahwe. Hivi ndivyo Yahwe asemavyo: “Kesho mda kama huu kipimo cha unga mzuri kitauzwa kwa shekeli, na vipimo viwili vya shayiri kwa shekeli, kwenye lango la Samaria.””
2 Ọchịagha ahụ, nke eze na-adabere nʼaka ya, sịrị onye nke Chineke, “Lee, a sịkwarị na Onyenwe anyị emeghee oghere idee nke eluigwe, nke a ọ pụrụ ime?” Ma Ịlaisha zara ya, “Ị ga-eji anya gị abụọ hụ ya, ma ị gaghị eri site nʼime ya.”
Basi yule nahodha ambaye alikuwa akitegemea mkono wake amemjibu mtu wa Mungu, na kusema, “Ona, hata kama Yahwe ataweka madirisha mbinguni, je jambo hili linawezekana?” Elisha akajibu, “Ona, utaona ikitokea kwa macho yako mwenyewe, lakini hutakula chochote katika hilo.”
3 Nʼoge a, e nwere ndị ekpenta anọ nọ nʼezi mgbidi gbara Sameria gburugburu, nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka anyị nọ nʼebe a na-eme? Ọ bụ ka anyị nọrọ nʼebe a tutu anyị anwụọ?
Basi, kulikuwa na watu wanne wenye ukoma upande wa nje wa lango la mji. Wakaambizana kila mmoja, “Kwa nini tukae hapa hadi hapo tutakapokufa?
4 Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Anyị ga-abanye nʼime obodo,’ ụnwụ dị nʼebe ahụ, anyị ga-anwụkwa. Ọ bụrụkwanụ na anyị anọgide nʼebe a anyị ga-anwụ. Ya mere ka anyị gafeenụ banye nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram, were onwe anyị nyefee ha nʼaka. Ọ bụrụ na ha edebe anyị ndụ, anyị ga-adị ndụ, ọ bụrụ na ha egbuo anyị, anyị ga-anwụkwa.”
Kama tukisema kwamba tutaenda kwenye ule mji, maana mjini kuna njaa, na tutakufa hapo. Lakini kama tukiendelea kukaa hapa, bado tutakufa. Sawa, njoni, twendeni kwenye lile jeshi la Washami. Kama wakitupa uhai, tutakuwa hai, na kama wakituua, tutakufa tu.”
5 Nʼoge uhuruchi, ha biliri gaa nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram. Mgbe ha bịarutere nʼọnụ ụlọ ikwu ahụ, o nwekwaghị onye nọ nʼebe ahụ,
Hivyo wakaamka asubuhi kabla giza halijaisha kwenda kwenye kambi ya Washami; Wakati walipofika sehemu ya mwanzo wa kambi, hapakuwa na mtu hapo.
6 nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ndị Aram nụ ụzụ ụgbọ agha na nke ịnyịnya, na nke usuu ndị agha. Nke a mere ka onye ọbụla gwa ibe ya sị, “Lee, eze ndị Izrel egoola ndị agha ndị Het, na ndị eze Ijipt ibuso anyị agha.”
Kwa kuwa Bwana alikuwa ameunda jeshi la Washami kusikia sauti ya magari ya farasi, na sauti za farasi-sauti za jeshi jingine kubwa, ndipo wakaambizana kila mmoja wao, “Yule mfalme wa Israeli amekodisha wafalme wa Wahiti na Wamisri waje wapigane dhidi yetu.”
7 Ha biliri gbapụ ọsọ nʼabalị ahụ, hapụ ụlọ ikwu ha niile, na ịnyịnya ha niile, na ịnyịnya ibu ha niile, na ihe niile otu o si dịrị, ma gbapụ ọsọ ndụ.
Hivyo wale maaskari wakaondoka kungali giza; waliacha mahema yao, punda zao, na kambi kama ilivyokuwa, na kukimbia kwa ajili ya maisha yao.
8 Mgbe ndị ekpenta ahụ rutere ogige ndị agha ndị Siria, ha banyere nʼime otu ụlọ rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ dị nʼime ya. Ha chịịrị ọlaọcha na ọlaedo na uwe ọma niile dị nʼime ya gaa zoo ha. Ọzọkwa, ha lọghachiri banye nʼụlọ ọzọ kwakọrọ ụfọdụ ihe dị nʼime ya gaa zoo.
Wakati wale watu wenye ukoma walipokuja sehemu ya mwisho wa kambi, wakaenda kwenye hema moja na kula na kunywa, na kubeba fedha na dhahabu na nguo, na kwenda na kuzificha. Wakarudi na kuingia kwenye hema nyingine na kubeba kutoka pale pia, na kwenda kuvificha.
9 Ma mgbe ahụ ha sịrịtara onwe ha, “Ihe anyị na-eme ezighị ezi. Taa bụ ụbọchị oziọma, ma lee ka anyị na-agba nkịtị. Ọ bụrụ na anyị echere ruo ìhè ụtụtụ, a ga-achọpụta ajọọ omume anyị. Ugbu a bịanụ, ka anyị gaa gwa ndị nọ nʼụlọeze, ihe anyị hụrụ.”
Basi, wakaambizana kila mmoja, “Hatufanyi sahihi. Siku hii ni siku ya habari njema, lakini tunanyamaza kimya kuhusu hili. Kama tukisubiri mpaka kutakapopambazuka, adhabu itakuwa juu yetu. Basi, njoni, twendeni na kuwaambia nyumba ya mfalme.”
10 Ya mere, ha gara kpọkuo ndị nche ọnụ ụzọ obodo ahụ, gwa ha sị, “Anyị banyere nʼogige ndị agha Aram, o nweghị mmadụ ọbụla nọ nʼebe ahụ, ọ dịghị olu mmadụ anyị nụrụ nʼebe ahụ, naanị ịnyịnya na ịnyịnya ibu elibere nʼosisi, na ụlọ ikwu ha a hapụrụ dịka ha dị.”
Kwa hiyo wakaenda na kuwaita mabawabu wa mji. Wakawaambia, wakisema, “Tumeenda kambi ya Washami, lakini hapakuwa na mtu pale, hakuna sauti ya mtu yeyote, lakini kulikuwa na farasi wamefungwa, na punda wamefungwa, na zile hema kama zilivyokuwa.”
11 Ndị na-eche nche tiri mkpu kọọrọ ndị nọ nʼụlọeze ihe mere.
Ndipo mabawabu wakatoa habari, ndipo wakaambiwa ndani ya nyumba ya mfalme.
12 Eze biliri nʼabalị ahụ gwa ndịisi ọrụ ya sị, “Ka m gwa unu ihe ndị Aram mere anyị. Ha maara na anyị nọ nʼoke agụụ, nʼihi ya, ha akpacharala anya hapụ ọmụma ụlọ ikwu ha gaa zoo onwe ha nʼime ọhịa. Echiche ha bụ, ‘Ndị a ga-apụtarịrị, mgbe ahụ, anyị ga-ejide ha na ndụ, banyekwa nʼime obodo ha.’”
Basi yule mfalme akainuka usiku nakusema kwa watumishi wake, “Nitawaambia sasa kile ambacho Washami walichotufanyia. Wanajua kwamba tunanjaa, hivyo wameondoka kwenye kambi kwenda kujificha kwenye mashamba. Wanasema, 'Wakati watakapotoka mjini, tutawakamata wakiwa hai, na kuingia mjini.”
13 Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.”
Mmoja wa wale watumishi wa mfalme akajibu na kusema, “Nakuomba, ngoja baadhi ya watu wachukue farasi watano wale waliosalia, ambao wamebaki kwenye mji. Wako kama mkutano wote wa Israeli waliobaki-wengi wamekufa; ngoja tuwatume na tuone.”
14 Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.”
Hivyo wakachukua magari mawili ya farasi pamoja na farasi, na mfalme akawatuma baada ya jeshi la Washami, akisema, “Enendeni mkaone.”
15 Ha sogidere ha ruo nʼosimiri Jọdan. Nʼakụkụ ụzọ niile jupụtara nʼuwe na ngwa agha ndị agha Aram tufuru mgbe ha na-eme ngwangwa. Ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri bịa kọọrọ eze ihe ha hụrụ.
Wakawafuata kwenda Yordani, na barabara zote zilikuwa zimejaa na vifaa ambavyo Washami walivitupa wapate kukimbia haraka. Kwa hiyo wale wajumbe wakarudi na kumwambia mfalme.
16 Ndị Izrel niile pụrụ gaa kwakọrọ ihe dị nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Aram. Nke bụ na e rere otu akpa nta ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma otu shekel, rekwaa akpa ọka balị abụọ otu shekel dịka Onyenwe anyị si kwuo.
Wale watu wakatoka nje na wakaziteka nyara zile kambi za Washami. Hivyo kipimo cha unga mzuri uliuzwa kwa shekeli moja, na vipimo viwili vya shayiri kwa shekeli moja, kama vile ambavyo neno la Yahwe lilivyosema.
17 Eze họpụtara ọchịagha ahụ, nke ọ na-adabere nʼaka ya, nye ya ọrụ ilekọta ọnụ ụzọ obodo ahụ. Ma ndị si nʼobodo na-enupụta nuturu ya, zọọ ya ụkwụ, zọgbuo ya mgbe ha na-agbapụta. Ọ nwụrụ dịka Ịlaisha onye nke Chineke kwuru mgbe eze bịakwutere ya ụnyaahụ, ijide ya.
Naye mfalme alimwagiza yule nahodha ambaye alitegemea mkono wake kuwa mkuu wa lango, na watu wakamkanyaga chini langoni. Alikufa kama mtu wa Mungu alivyosema, ambaye ameongea wakati yule mfalme alipomshukia.
18 Ihe niile mezuru dịka onye nke Chineke gwara eze okwu sị ya, “A ga-ere akpa nta ọka balị abụọ otu shekel na otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, nʼọnụ ụzọ ama Sameria.”
Basi ikatokea kama yule mtu wa Mungu alivyosema kwa mfalme akisema, “Mda kama huu kwenye lango la Samaria, vipimo viwili vya shayiri vitapatikana kwa shekeli, na kipimo cha unga mzuri kwa shekeli.”
19 Nʼoge ahụ, ọchịagha ahụ na-ejere eze ozi zara sị ya, “Ihe dị otu a agaghị eme, ọ bụladị na Onyenwe anyị emeghee eluigwe mee ka nri zoo, nke a ọ ga-eme?” Ma onye nke Chineke zara ya, “Ị ga-eji anya gị hụ ya, ma ị gaghị eso rie ya.”
Yule nahodha alimjibu yule mtu wa Mungu na kusema, “Tazama, hata kama Yahwe angefanya madirisha mbinguni, je hiki kitu kingeweza kutokea” Elisha akasema, “Tazama, utaona kikitokea kwa macho yako mwenyewe, lakini hutakula chochote katika hicho.”
20 Ọ bụkwa otu a ka o si mee, nʼihi na ndị mmadụ zọgburu ya nʼụkwụ nʼọnụ ụzọ ama, ebe ọ nọ nwụọ.
Hivyo ndivyo haswa kilichompata, kwa kuwa watu wakamkanyaga kwenye lango, na kufa.

< 2 Ndị Eze 7 >