< 2 Ndị Eze 13 >

1 Nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash nwa Ahazaya na Juda, ka Jehoahaz nwa Jehu malitere ịbụ eze nʼIzrel nʼobodo Sameria. Ọ chịkwara na Sameria afọ iri na asaa.
In the twenty-third year of Joash son of Ahaziah king of Judah, began Jehoahaz, son of Jehu, to reign over Israel, in Samaria, [and he reigned] seventeen years.
2 Kama Jehoahaz bụ eze ọjọọ. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O soro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie.
And he did the thing that was wicked in the eyes of Yahweh, —and went after the sins of Jeroboam son of Nebat which he caused, Israel, to commit, he departed not therefrom.
3 Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu megide Izrel. O mere ka ha nọrọ nʼokpuru ọchịchị Hazael eze Aram na Ben-Hadad nwa ya ogologo oge.
Then was kindled the anger of Yahweh against Israel—and he delivered them into the hand of Hazael king of Syria, and into the hand of Ben-hadad son of Hazael, continually.
4 Ma Jehoahaz kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼoge a ka o nyere ya aka, Onyenwe anyị gere ya ntị, nʼihi na Chineke hụrụ mmegbu nke eze Aram na-emegbu ndị Izrel.
And Jehoahaz appeased the face of Yahweh, —and Yahweh hearkened unto him, because he had seen the oppression of Israel, for that, the king of Syria, oppressed them.
5 Onyenwe anyị họpụtaara Izrel onye nzọpụta, ha sitere nʼaka ike ndị Aram nwere onwe ha. Izrel biri nʼụlọ nke aka ha dịka ha biiri nʼoge gara aga.
So Yahweh gave unto Israel a saviour, and they went forth from under the hand of Syria, —and the sons of Israel dwelt in their own homes, as aforetime.
6 Ma ha esighị na mmehie niile nke ụlọ Jeroboam wezuga onwe ha, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie, kama ha nọ na-ejegharị nʼime ha. Ọzọkwa, ogidi Ashera ka guzoro na Sameria.
Howbeit they departed not from the sins of the house of Jeroboam which he caused, Israel, to commit, therein, they walked, —moreover also, the Sacred Stem, still stood in Samaria.
7 Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ.
For he had not left remaining unto Jehoahaz a people, save only fifty horsemen, and ten chariots, and ten thousand footmen, —for the king of Syria had destroyed them, and had made them like dust in threshing.
8 Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoahaz, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
Now, the rest of the story of Jehoahaz, and all that he did, and his might, are, they, not written in the book of the Chronicles of the Kings of Israel?
9 Jehoahaz sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya Jehoash nọchiri anya ya.
So then Jehoahaz slept with his fathers, and they buried him in Samaria, —and, Joash his son, reigned, in his stead.
10 Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii.
In the thirty-seventh year of Joash king of Judah, began Jehoash son of Jehoahaz to reign over Israel, in Samaria, [and he reigned] sixteen years.
11 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, mmehie nke Jeroboam dubara Izrel ime. Jehoash nọgidere nʼime ha.
And he did that which was wicked in the eyes of Yahweh, —he turned not away from all the sins of Jeroboam son of Nebat, which he caused, Israel, to commit, therein, he walked.
12 Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha o buru megide Amazaya eze Juda, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
Now, the rest of the story of Joash, and all that he did, and his might, wherewith he fought against Amaziah king of Judah, are, they, not written in the book of the Chronicles of the Kings of Israel?
13 Jehoash soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Jeroboam anọchie nʼocheeze ya. E liri Jehoash na Sameria, nʼebe e liri ndị eze Izrel ndị ibe ya.
So then Joash slept with his fathers, and, Jeroboam, took his seat on his throne, —and Joash was buried in Samaria, with the kings of Israel.
14 Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!”
Now, Elisha, had fallen sick of his sickness whereof he was about to die, —so then Joash king of Israel came down unto him, and wept upon his face, and said, My father! my father! The chariots of Israel and the horsemen thereof!
15 Ịlaisha gwara ya okwu sị, “Wepụta ụta na àkụ ụfọdụ.” O mere dịka Ịlaisha gwara ya.
And Elisha said unto him, Take bow and arrows. So he took unto him bow and arrows.
16 Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze.
Then said he unto the king of Israel, Let thy hand rest upon the bow. So he let his hand rest thereon. Then Elisha put his own hands upon the hands of the king;
17 Ịlaisha gwara ya sị, “Meghee oghereikuku ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.” O meghere ya. Mgbe ahụ Ịlaisha gwara ya sị, “Gbapụ àkụ.” Eze gbapụrụ àkụ. Ịlaisha kwuru sị, “Àkụ mmeri Onyenwe anyị, àkụ mmeri megide Aram. Ị ga-ebibi ndị Aram kpamkpam nʼAfek.”
and said—Open the lattice eastward. And he opened it. Then said Elisha—Shoot! And he shot. Then he said, —The arrow of victory by Yahweh, yea the arrow of victory over Syria, therefore shalt thou smite Syria in Aphek, till it be consumed.
18 Ọ sịrị, “Chilite àkụ ndị ahụ,” ọ chilitere ha. Ịlaisha gwara eze Izrel, “Gbaa ha nʼala.” Ọ gbara ha nʼala ugboro atọ, ma kwụsị.
And he said—Take the arrows. So he took them. Then said he unto the king of Israel—Smite unto the ground. So he smote three times, and then stayed.
19 Ma onye nke Chineke ahụ were iwe sị ya, “Ị gaara apịa ya nʼala ugboro ise maọbụ isii. Mgbe ahụ, ị gaara enwe ike merie ndị Aram bibie ha kpamkpam. Ma ugbu a, ọ bụ naanị ugbo atọ ka ị ga-emeri ha.”
Then was the man of God wroth against him, and said—Thou shouldest have smitten five or six times, then, hadst thou smitten Syria, until it had been consumed; But, now, three times, shalt thou smite Syria.
20 Ya mere, Ịlaisha nwụrụ. E likwara ya. Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-esi nʼala ndị Moab na-abịa nʼala Izrel izu ohi site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ọhụrụ ọbụla.
And Elisha died, and they buried him, —now, troops of Moabites, used to enter the land, at the coming in of the year;
21 Otu ụbọchị, mgbe ụfọdụ ndị ikom na-eli otu nwoke nwụrụ anwụ, ha hụrụ ndị a na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Nʼihi nke a, ha mere ngwangwa site nʼụjọ tụbanye nwoke ahụ nʼili Ịlaisha. Mgbe ozu nwoke ahụ dara metụ ọkpụkpụ Ịlaisha ahụ, nwoke ahụ nwụrụ anwụ megharịrị ahụ bilie, guzo nʼụkwụ ya abụọ.
and it came to pass, as, they, were burying a man, that, lo! they saw a troop, so they cast the man into the sepulchre of Elisha, —and, as soon as the man touched the bones of Elisha, he came to life again, and rose up on his feet.
22 Hazael, eze Aram, busoro Izrel agha ụbọchị niile nke ndụ Jehoahaz eze Izrel.
And, Hazael king of Syria, had oppressed Israel all the days of Jehoahaz.
23 Ma Onyenwe anyị meere ha amara, nwee ọmịiko nʼebe ha nọ, ma gosikwa ha na ihe banyere ha na-emetụ ya nʼobi nʼihi ọgbụgba ndụ ya na Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ruo taa, o kweghị ka e bibie ha, maọbụ ka e site nʼihu ya chụpụ ha.
Then was Yahweh gracious unto them, and had compassion upon them, and turned unto them, for the sake of his covenant with Abraham, Isaac, and Jacob, —and was not willing to destroy them, nor to cast them off from his presence, as yet.
24 Emesịa, Hazael eze Aram nwụrụ, Ben-Hadad nwa ya nọchikwara nʼọnọdụ ya.
So then Hazael king of Syria died; and, Ben-hadad his son, reigned, in his stead.
25 Jehoash nwa Jehoahaz, weghachitere obodo niile nke ọ naara nʼaka nna ya Jehoahaz site nʼaka Ben-Hadad nwa Hazael. Ugboro atọ ka Jehoash meriri ya, site otu a weghachi obodo niile nke Izrel.
And Jehoash son of Jehoahaz again took the cities out of the hand of Ben-hadad son of Hazael, which he had taken out of the hand of Jehoahaz his father, in war, —three times, did Joash smite him, and recover the cities of Israel.

< 2 Ndị Eze 13 >