< 1 Samuel 11 >

1 Nʼoge ahụ, Nahash, eze ndị Amọn, duuru ndị agha ya bilie imegide ndị Izrel bi nʼala Jebesh Gilead. Ma ndị Jebesh rịọrọ ya sị, “Ka anyị na gị gbaa ndụ, anyị ga-anọ nʼokpuru ọchịchị gị.”
And Nahash the Ammonite came up and encamped against Jabesh-Gilead. And all the men of Jabesh said to Nahash, Make a covenant with us, and we will serve thee.
2 Ma Nahash, onye Amọn zara sị ha, “Mụ na unu ga-agba ndụ ma ọ bụrụ na unu ekwenye ka m ghụpụta anya aka nri nke onye ọbụla nʼime unu, si otu a wetara Izrel niile ihe nkọcha.”
And Nahash the Ammonite said to them, On this [condition] will I treat with you, that I thrust out all your right eyes, and lay it for a reproach upon all Israel.
3 Ndị okenye obodo Jebesh zara sị, “Nye anyị abalị asaa ka anyị ziga ndị ozi nʼala Izrel niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye kwere ịbịa zọpụta anyị, anyị ga-ewere onwe anyị nyefee gị nʼaka.”
And the elders of Jabesh said to him, Allow us seven days, and we will send messengers into all the districts of Israel; and if there be no man to deliver us, we will come out to thee.
4 Mgbe ndị ozi ha zipụrụ bịaruru Gibea, nke bụ obodo Sọl, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị a, ha niile dapụrụ nʼakwa.
And the messengers came to Gibeah of Saul and told these words in the ears of the people. And all the people lifted up their voice and wept.
5 Ma nʼoge a, Sọl si nʼubi na-alọta, soro ụmụ ehi ya nʼazụ, ọ jụrụ, “Ọ bụ gịnị na-eme onye ọbụla? Gịnị mere na ha ji ebe akwa?” Ha kọọrọ ya ihe banyere ozi e si Jebesh zite.
And behold, Saul came after the oxen from the field; and Saul said, What [aileth] the people that they weep? And they related to him the words of the men of Jabesh.
6 Mgbe Sọl nụrụ ozi a, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼike, iwe wekwara ya nke ukwuu.
And the Spirit of God came upon Saul when he heard those words, and his anger was kindled greatly.
7 Ọ kpụpụtara ehi abụọ bọkasịa ha, zipụ ndị ozi ka ha buru ha ga obodo niile dị nʼIzrel. Ozi ha ga-ezi ndị obodo ọbụla bụ nke a. “Ọ bụ ihe e mere ehi ndị a ka a ga-eme ehi onye ọbụla jụrụ iso Sọl na Samuel jee ọgụ.” Onyenwe anyị mere ka egwu jide ndị Izrel niile. Nʼihi ya, ha niile bịakwutere Sọl dịka otu mmadụ.
And he took a yoke of oxen and cut them in pieces, and sent throughout the territory of Israel by the hand of messengers, saying, Whoever comes not forth after Saul and after Samuel, so shall it be done to his oxen! And the fear of Jehovah fell on the people, and they came out as one man.
8 Mgbe Sọl kpọkọtara ha na Bezek, ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel dị narị puku atọ, tinyekwara iri puku mmadụ atọ, ndị sitere na Juda.
And he numbered them in Bezek, and the children of Israel were three hundred thousand, and the men of Judah thirty thousand.
9 Ha gwara ndị zitere ozi ahụ okwu sị ha, “Zienụ ndị ikom Jebesh Gilead, ‘Echi, tupu anyanwụ achaa nʼuju ya, a ga-anapụta unu.’” Mgbe ndị ozi a gara zie ndị ikom Jebesh Gilead ozi a, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu.
And they said to the messengers that had come, Thus shall ye say to the men of Jabesh-Gilead: To-morrow ye shall have deliverance when the sun is hot. And the messengers came and informed the men of Jabesh-Gilead; and they were glad.
10 Ndị ikom Jebesh ziri ozi gwa ndị Amọn sị ha, “Echi, anyị ga-enye unu onwe anyị, ka unu mee anyị ihe masịrị unu.”
And the men of Jabesh said, To-morrow we will come out to you, and ye may do with us according to all that is good in your sight.
11 Ma nʼụtụtụ echi, Sọl na ndị agha ya bịaruru. O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, buso ụmụ Amọn agha na mberede nʼisi ụtụtụ. O gbugidere ha ụtụtụ niile ruo mgbe anyanwụ chara nʼuju ya, chụsasịa ndị fọdụrụ nʼime ha. Nke a mere na o nweghị ebe a ga-ahụ ka ndị agha Amọn abụọ nọkọtara.
And it came to pass the next day that Saul set the people in three companies; and they came into the midst of the camp in the morning watch, and smote Ammon until the heat of the day: and it came to pass that they who remained were scattered, and not two of them were left together.
12 Ndị Izrel niile bịakwutere Samuel jụọ ya sị, “Olee ndị ahụ sị na Sọl agaghị abụ eze anyị? Kpọpụtara anyị ha ka anyị gbuo ha!”
And the people said to Samuel, Who is he that said, Shall Saul reign over us? bring the men, that we may put them to death.
13 Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa, Onyenwe anyị anapụtala Izrel!”
But Saul said, There shall not a man be put to death this day; for to-day Jehovah has wrought deliverance in Israel.
14 Samuel gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.”
And Samuel said to the people, Come and let us go to Gilgal, and renew the kingdom there.
15 Ya mere, mmadụ niile gara Gilgal. Na mmemme pụrụ iche, ha mere Sọl eze nʼihu Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja udo nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ. Ọṅụ jupụtakwara nʼobi Sọl na ndị Izrel niile.
And all the people went to Gilgal; and there they made Saul king before Jehovah in Gilgal; and there they sacrificed peace-offerings before Jehovah. And there Saul and all the men of Israel rejoiced exceedingly.

< 1 Samuel 11 >