< 1 Ndị Eze 21 >

1 Mgbe nwa oge nta gasịrị, Nebọt, onye Jezril, nwere ubi vaịnị dị na Jezril, nʼakụkụ ụlọeze Ehab bụ eze Sameria.
А после ових ствари догоди се: Навутеј Језраељанин имаше виноград у Језраелу до двора Ахава цара самаријског.
2 Ehab sịrị Nebọt, “Nye m ubi vaịnị gị ka ọ bụrụ ubi a gbara ogige, ebe m ga-akụ akwụkwọ nri, ebe ọ dị nso nʼụlọeze m. Aga m enye gị ubi vaịnị ọzọ dị mma karịa ya, ma ọ bụrụkwa na ị chọrọ, aga m akwụ gị ego ọbụla o ruru nʼọnụ ahịa ya.”
И рече Ахав Навутеју говорећи: Дај ми свој виноград да начиним од њега врт за зеље, јер је близу двора мог; а ја ћу ти дати за њ бољи виноград, или ако волиш, даћу ти у новцу шта вреди.
3 Ma Nebọt zara sị Ehab, “Ala a bụ ihe nketa ruuru m site nʼaka nna nna m ha. M ga-esi aṅaa nye gị ya. Onyenwe anyị ekwela na m ga-ewere ihe nketa nke nna nna m ha nye gị.”
А Навутеј рече Ахаву: Сачувај Боже да бих ти дао наследство отаца својих.
4 Ehab jiri obi ụfụ na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya nʼihi okwu a Nebọt, onye Jezril gwara ya, sị, “Agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m ha.” O dinara nʼihe ndina ya, chee ihu ya nʼaja ụlọ, jụ iri ihe ọbụla.
Тада Ахав дође кући зловољан и љутит ради речи коју му рече Навутеј Језраељанин говорећи: Не дам ти наследство отаца својих. И леже на постељу своју, и окрену лице своје на страну, и не једе хлеба.
5 Ma nwunye ya bụ Jezebel, bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji jụ iri ihe? Gịnị mere i ji nọgide nʼobi ọjọọ na iwe?”
Тада дође к њему Језавеља, жена његова и рече му: Зашто је душа твоја зловољна те не једеш хлеба?
6 Ehab zara sị ya, “Agwara m Nebọt, nwoke onye Jezril okwu sị ya, ‘Resi m ubi vaịnị gị, ma ọ bụrụ na ị chọrọ, aga m enye gị ala ubi ọzọ mara mma nʼọnọdụ ya.’ Ma ọ jụrụ jụwaa isi inye m ubi ahụ.”
А он јој рече: Јер говорих с Навутејем Језраељанином и рекох му: Дај ми виноград свој за новце, или ако волиш, даћу ти други виноград за тај. А он рече: Не дам ти свој виноград.
7 Mgbe ahụ, nwunye ya Jezebel jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Ọ bụghị gị bụ eze na-achị Izrel? Bilie, rie nri, enyela obi gị nsogbu, nʼihi na aga m enyefe gị ubi vaịnị Nebọt onye Jezril nʼaka.”
Тада му рече Језавеља жена његова: Ти ли си цар над Израиљем? Устани, једи хлеба и буди весео. Ја ћу ти дати виноград Навутеја Језраељанина.
8 Ya mere, Jezebel dere akwụkwọ nʼaha Ehab, were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe Nebọt bi.
И написа књигу на име Ахавово, и запечати је печатом његовим и посла књигу старешинама и главарима који беху у граду његовом, који наставаху с Навутејем.
9 Nʼime akwụkwọ ozi ndị a, o dere sị, “Nyenụ iwu ka mmadụ niile buo ọnụ. Kpọkọtaanụ ndị Jezril niile, ka ha zukọta. Mgbe unu zukọrọ, nyenụ Nebọt ọnọdụ nʼoche dị mkpa.
А у књизи написа ово: Огласите пост, и посадите Навутеја међу главаре народне.
10 Họpụtanụ ndị ikom abụọ, ndị na-abaghị uru ka ha pụta nʼihu nzukọ unu guzo gbaa ama ụgha megide Nebọt sị na ha nụrụ mgbe ọ kọchara Chineke na eze. Maanụ ya ikpe ọnwụ, kpụpụ ya nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya, ka ọ nwụọ.”
И поставите два неваљала човека према њему, па нека засведоче на њ говорећи: Хулио си на Бога и на цара. Тада га изведите и заспите камењем, да погине.
11 Ndị okenye na ndị a na-asọpụrụ ndị bi nʼobodo ahụ mere dịka Jezebel nyere nʼiwu nʼakwụkwọ ahụ o degaara ha.
И учинише људи оног града, старешине и главари, који живљаху у граду његовом, како им заповеди Језавеља, како беше написано у књизи коју им посла.
12 Ha nyere iwu maka ibu ọnụ, kpọọkwa nzukọ ndị obodo ahụ niile, meekwa ka Nebọt nọdụ nʼoche dị mkpa.
И огласише пост, и посадише Навутеја међу главаре народне.
13 Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ na-abaghị uru pụtakwara, nọdụ na ncherita ihu ya, ha gbara ama ụgha megide Nebọt, nʼihu ndị mmadụ, sị, “Nebọt kọchara Chineke na eze.” Nʼihi nke a, ha dọkpụụrụ ya gaa nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya.
И дођоше два неваљала човека, и стадоше према њему; и сведочише на Навутеја ти неваљали људи пред народом говорећи: Навутеј је хулио на Бога и на цара. И изведоше га иза града, и засуше га камењем, те погибе.
14 Emesịa, ndị okenye na ndị a maara aha ha nke obodo Jezril, ziri ozi zigara Jezebel gwa ya na Nebọt anwụọla.
Потом послаше к Језавељи и поручише јој: Засут је камењем Навутеј, и погинуо је.
15 Ngwangwa Jezebel natara ozi na a tụgbola Nebọt, ọ sịrị Ehab, “Bilie, gaa nwetara onwe gị ubi vaịnị Nebọt, nwoke onye Jezril. Ubi ahụ ọ jụrụ inye gị nʼego abụrụla nke gị ugbu a nʼihi na Nebọt anwụọla. Ọ dịkwaghị ndụ ọzọ!”
А кад Језавеља чу да је Навутеј засут камењем и погинуо, рече Ахаву Језавеља: Устани, узми виноград Навутеја Језраељанина, који ти не хте дати за новце, јер Навутеј није жив него је умро.
16 Mgbe Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, o biliri pụọ, gaa ịbanye nʼubi ahụ, inwetara onwe ya ubi vaịnị Nebọt, onye Jezril.
А кад чу Ахав да је умро Навутеј, уста и пође у виноград Навутеја Језраељанина да га узме.
17 Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya,
Али дође реч Господња к Илији Тесвићанину говорећи:
18 “Bilie, gaa zute Ehab, eze Izrel onye bi na Sameria. Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị Nebọt inwetara ya onwe ya.
Устани, изиђи на сусрет Ахаву, цару Израиљевом, који седи у Самарији; ено га у винограду Навутејевом, куда је отишао да га узме.
19 Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara Nebọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’”
И реци му и кажи: Овако вели Господ: Ниси ли убио и ниси ли присвојио? Па му кажи и реци: Овако вели Господ: Како пси лизаше крв Навутејеву, тако ће лизати пси и твоју крв.
20 Mgbe ahụ, Ehab jụrụ Ịlaịja ajụjụ sị ya, “Onye iro m, ị chọrọkwala m bịa?” Ịlaịja zara sị ya, “E, achọrọla m gị bịa nʼihi nnyefe i nyefere onwe gị ime ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
А Ахав рече Илији: Нађе ли ме непријатељу мој? А он рече: Нађох, јер си се продао да чиниш зло пред Господом.
21 Ọ sịrị, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ dakwasị gị. Aga m ekpochapụ ndị agbụrụ gị, site nʼezinaụlọ Ehab bipụ nwoke ọbụla, maọbụ ohu maọbụ onyenwe onwe ya nʼIzrel.
Ево, пустићу зло на те, и узећу наслеђе твоје, и истребићу Ахаву и оно што уза зид мокри, и ухваћеног и остављеног у Израиљу.
22 Aga m eme ka ụlọ gị dịrị ka nke Jeroboam nwa Nebat, na dịka nke Baasha nwa Ahija, nʼihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka Izrel mehie.’
И учинићу с домом твојим као с домом Јеровоама, сина Наватовог и као са домом Васе, сина Ахијиног, што си ме гневио и што си навео на грех Израиља.
23 “Ma banyere Jezebel, Onyenwe anyị sịrị, ‘Ụmụ nkịta ga-eri anụ ahụ Jezebel nʼakụkụ mgbidi aja ụlọ dị nʼobodo Jezril.’
Такође и за Језавељу рече Господ говорећи: Пси ће изјести Језавељу испод зидова језраелских.
24 “Nkịta ga-eri anụ onye ọbụla si nʼezinaụlọ Ehab nke nwụrụ nʼime obodo, ma anụ ufe nke eluigwe ga-eri anụ ndị ọbụla nwụrụ nʼọhịa.”
Ко Ахавов погине у граду изјешће га пси, а ко погине у пољу изјешће га птице небеске.
25 (Nʼezie, o nweghị onye ọbụla ọzọ dị ka Ehab, onye rere onwe ya nye ime ihe ọjọọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, onye Jezebel nwunye ya kwagidere ime ihe ọjọọ dị iche iche.
И не би таквог као Ахав, који се продаде да чини шта је зло пред Господом, јер га подговараше жена његова Језавеља.
26 Ehab bụ onye mere mmehie dị oke njọ nke ịgbaso na ife arụsị dị iche iche ofufe dịka ndị Amọrait mere, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼala a chụpụ ime ka ndị Izrel nweta ala ha.)
И почини врло грдна дела идући за гадним боговима сасвим као што чинише Амореји, које изагна Господ испред синова Израиљевих.
27 Mgbe Ehab nụrụ okwu amụma ndị a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, buo ọnụ, dinaa nʼakwa mkpe ahụ, jegharịakwa nʼịdị umeala.
А кад Ахав чу те речи, раздре хаљине своје, и привеза кострет око тела свог, и пошћаше, и спаваше у кострети, и хођаше полагано.
28 Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe ọzọ, sị ya,
И дође реч Господња Илији Тесвићанину говорећи:
29 “Ị hụrụ otu Ehab si weda onwe ya ala nʼihu m? Nʼihi ihe a o mere, iweda onwe ya ala nʼihu m, agaghị m eme ka ihe ọjọọ ndị a m kwuru okwu banyere ha rute ya nʼoge ọ dị ndụ. Kama aga m eme ka ihe ndị a dakwasị ezinaụlọ ya mgbe nwa ya ga-achị dịka eze.”
Јеси ли видео како се Ахав понизио преда мном? Зато што се тако понизио преда мном, нећу пустити оно зло за његовог живота; него за сина његовог пустићу оно зло на дом његов.

< 1 Ndị Eze 21 >