< 1 Ihe E Mere 6 >
1 Livayị mụrụ ndị a: Geshọn, Kohat na Merari.
Los hijos de Levi: Gersón, Coat y Merari.
2 Kohat mụrụ Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
Los hijos de Coat: Amram, Izhar, Hebrón y Uziel.
3 Amram mụrụ Erọn, Mosis na Miriam. Erọn mụrụ Nadab, Abihu, Elieza na Itama.
Los hijos de Amram: Aarón, Moisés y Miriam. Los hijos de Aarón: Nadab, Abiú, Eleazar e Itamar.
4 Elieza mụrụ Finehaz; Finehaz abụrụ nna Abishua
Eleazar fue el padre de Finehas. Finehas fue el padre de Abisúa.
5 Abishua bụ nna Buki, Buki abụrụ nna Uzi.
Abisúa fue el padre de Buqui. Buqui fue el padre de Uzi;
6 Uzi mụrụ Zerahaya, Zerahaya amụọ Meraiot.
Uzi fue el padre de Zeraías. Zeraías fue el padre de Meraioth.
7 Meraiot mụrụ Amaraya, Amaraya amụọ Ahitub.
Meraiot fue el padre de Amarías. Amarías fue el padre de Ajitub.
8 Ahitub mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Ahimaaz.
Ajitub fue el padre de Sadok. Sadok fue el padre de Ahimaas.
9 Ahimaaz mụrụ Azaraya, Azaraya amụọ Johanan.
Ahimaas fue el padre de Azarías. Azarías fue el padre de Johanán.
10 Johanan mụrụ Azaraya ọ bụ ya bụ onye ahụ bụ onye nchụaja ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru na Jerusalem.
Johanán fue el padre de Azarías (quien sirvió como sacerdote cuando Salomón construyó el Templo en Jerusalén).
11 Azaraya mụrụ Amaraya, Amaraya amụọ Ahitub.
Azarías fue el padre de Amarías. Amarías fue el padre de Ajitub.
12 Ahitub mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Shalum.
Ajitub fue el padre de Sadoc. Sadoc fue el padre de Salum.
13 Shalum mụrụ Hilkaya, Hilkaya amụọ Azaraya.
Salum fue el padre de Hilcías. Hilcías fue el padre de Azarías.
14 Azaraya mụrụ Seraya, Seraya amụọ Jehozadak,
Azarías fue el padre de Seraías, y Seraías fue el padre de Josadac.
15 A dọtara Jehozadak nʼagha mgbe Onyenwe anyị mere ka Nebukadneza dọkpụrụ ndị Juda na Jerusalem nʼagha.
Josadac fue llevado al cautiverio cuando el Señor usó a Nabucodonosor para enviar a Judá y a Jerusalén al exilio.
16 Ụmụ ndị ikom Livayị bụ, Geshọm, Kohat na Merari.
Los hijos de Leví: Gersón, Coat y Merari.
17 Geshọm mụrụ Libni na Shimei.
Estos son los nombres de los hijos de Gersón: Libni y Simei.
18 Ụmụ Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn, na Uziel.
Los hijos de Coat: Amram, Izhar, Hebrón y Uziel.
19 Merari mụtara Mahali na Mushi. Ndị a bụ ikwu Livayị ndị e depụtara dịka aha nna ha si dị.
Los hijos de Merari: Mahli y Musi. Estas son las familias de los levitas, que estaban ordenadas según sus padres:
20 Ikwu Geshọm bụ Libni, Jahat, Zima,
Los descendientes de Gersón: Libni su hijo, Jehat su hijo, Zima su hijo,
21 Joa, Ido, Zera na Jeaterai.
Joa su hijo, Iddo su hijo, Zera su hijo y Jeatherai su hijo.
22 Ikwu Kohat bụ Aminadab, Kora, Asịa,
Los descendientes de Coat: Aminadab su hijo; Coré su hijo; Asir su hijo,
23 Elkena, Ebiasaf, Asịa,
Elcana su hijo; Ebiasaf su hijo; Asir su hijo;
24 Tahat, Uriel, Ụzaya na Shaul.
Tahat su hijo; Uriel su hijo; Uzías su hijo, y Saúl su hijo.
25 Ụmụ ụmụ Elkena bụ Amasai na Ahimot.
Los descendientes de Elcana: Amasai, Ahimot,
26 Ụmụ ụmụ Ahimot bụ Elkena, Zofai, Nahat,
Elcana su hijo; Zofai su hijo; Nahat su hijo;
27 Eliab, Jeroham, Elkena na Samuel.
Eliab su hijo, Jeroham su hijo; Elcana su hijo, y Samuel su hijo.
28 Ụmụ Samuel bụ Juel, ọkpara ya, na Abija nke abụọ.
Los hijos de Samuel: Joel (primogénito) y Abías (el segundo).
29 Ụmụ ụmụ Merari bụ Mahali, Libni, Shimei, Ụza,
Los descendientes de Merari: Mahli, su hijo Libni, su hijo Simei, su hijo Uza,
30 Shimea, Hagiya na Asaya.
su hijo Simea, su hijo Haguía y su hijo Asaías.
31 Ndị a bụ ndị ikom Devid họpụtara nye ọrụ ilekọta ndị ọbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ nʼebe ahụ.
Estos son los músicos que David designó para dirigir la música en la casa del Señor una vez que el Arca fuera colocada allí.
32 Ha jere ozi ịbụ abụ ha nʼihu ụlọ ikwu, ya bụ, ụlọ nzute, tutu ruo mgbe Solomọn wuchara ụlọnsọ Onyenwe anyị na Jerusalem. Ha jere ozi ha dịka usoro ije ozi ha si dị.
Ellos dirigieron la música y el canto ante el Tabernáculo, la Tienda de Reunión, hasta que Salomón construyó el Templo del Señor en Jerusalén. Servían siguiendo el reglamento que se les había dado.
33 Ndị a bụ ndị ikom ahụ jere ozi, ha na ụmụ ha ndị ikom: Site nʼikwu Kohat: Heman, ọbụ abụ. Ndị a bụ nna nna ya ochie: Juel, nwa Samuel,
Estos son los hombres que servían, junto con sus hijos: De los coatitas Hemán, el cantor, el hijo de Joel, el hijo de Samuel,
34 nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa,
hijo de Elcana, hijo de Jeroham, hijo de Eliel, hijo de Toa,
35 nwa Zuf, nwa Elkena, nwa Mahat, nwa Amasai,
hijo de Zuf, ehijo de Elcana, hijo de Mahat, hijo de Amasai,
36 nwa Elkena, nwa Juel, nwa Azaraya, nwa Zefanaya,
hijo de Elcana, hijo de Joel, hijo de Azarías, hijo de Sofonías,
37 nwa Tahat, nwa Asịa, nwa Ebiasaf, nwa Kora,
hijo de Tahat, hijo de Asir, hijo de Ebiasaf, hijo de Coré,
38 nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, nwa Izrel.
hijo de Izhar, hijo de Coat, hijo de Leví, hijo de Israel.
39 Asaf onye na-enyere Heman aka, na-eje ozi nʼakụkụ aka nri ya. Ndị bụ nna nna ya ochie bụ ndị a: Berekaya, nwa Shimea,
Asaf, pariente de Hemán, que servía junto a él a la derecha: Asaf hijo de Berequías, hijo de Simea,
40 nwa Maikel, nwa Baaseya, nwa Malkija,
hijo de Miguel, hijo de Baasías, hijo de Malaquías,
41 nwa Etni, nwa Zera, nwa Adaya,
hijo de Etni, hijo de Zera, hijo de Adaías,
42 nwa Etan, nwa Zima, nwa Shimei,
hijo de Etán, hijo de Zima, hijo de Simei,
43 nwa Jahat, nwa Geshọm, nwa Livayị.
hijo de Jahat, hijo de Gersón, hijo de Leví.
44 Onye ọzọ na-enyere Heman aka bụ Etan, onye ikwu Merari. Ọ na-anọ nʼaka ekpe ya. Ndị bụ nna nna ochie Etan bụ ndị a, Kishi, nwa Abdi, nwa Maluk,
A la izquierda de Hemán sirvieron los hijos de Merari: Etán hijo de Quisi, el hijo de Abdi, hijo de Malluch,
45 nwa Hashabaya, nwa Amazaya, nwa Hilkaya,
hijo de Hasabiah, hijo de Amasías, hijo de Hilcías,
46 nwa Amzi, nwa Bani, nwa Shema,
hijo de Amzi, hijo de Bani, hijo de Semer,
47 nwa Mahali, nwa Mushi, nwa Merari, nwa Livayị.
hijo de Mahli, hijo de Musi, hijo de Merari, hijo de Levi.
48 Ụmụnna ha ndị Livayị ụfọdụ ka e tinyere nʼọrụ dị iche iche nʼụlọ ikwu, bụ ụlọ Chineke.
Los demás levitas desempeñaban todas las demás funciones en el Tabernáculo, la casa de Dios.
49 Ma Erọn na ụmụ ụmụ ya bụ ndị chụrụ aja onyinye nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nakwa nʼelu ebe ịchụ aja ihe na-esi isi ụtọ, nke metụtara ọrụ ije ozi niile nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na-ekpuchikwara Izrel mmehie niile ha, nʼusoro dịka ihe niile si dị nke Mosis ohu Chineke nyere nʼiwu.
Sin embargo, eran Aarón y sus descendientes quienes daban ofrendas en el altar de los holocaustos y en el altar del incienso y hacían todo el trabajo en el Lugar Santísimo, haciendo la expiación por Israel según todo lo que había ordenado Moisés, el siervo de Dios.
50 Ụmụ ụmụ Erọn bụ Elieza, na Finehaz, na Abishua,
Los descendientes de Aarón fueron: Eleazar su hijo, Finees su hijo, Abisúa su hijo,
51 na Buki, na Uzi, na Zerahaya,
Buqui su hijo, Uzi su hijo, Zeraías su hijo,
52 na Meraiot, na Amaraya, na Ahitub,
Meraioth su hijo, Amariah su hijo, Ahitub su hijo,
Zadok su hijo, y su hijo Ahimaas.
54 Ndị a bụ ala na obodo dị iche iche ụmụ Erọn ketara, nke e nyere ikwu Kohat, ụmụ ụmụ Erọn, nʼihi na ọ bụ ha ka e bu ụzọ kenye oke site nʼife nza.
Estos fueron los lugares que se les dieron para vivir como territorio asignado a los descendientes de Aarón, comenzando por el clan coatita, porque el suyo fue el primer lote:
55 Hebrọn, nʼime Juda, ya na ala ịta nri anụ ụlọ niile dị ya gburugburu.
Recibieron Hebrón, en Judá, junto con los pastos que la rodean.
56 Ma ala ubi na obodo nta niile gbara Hebrọn gburugburu ka e nyere Kaleb nwa Jefune.
Pero los campos y las aldeas cercanas a la ciudad fueron entregados a Caleb hijo de Jefone.
57 Ya mere e nyere ụmụ ụmụ Erọn Hebrọn (obodo mgbaba), na Libna, na Jatịa, na Eshtemoa,
Así, los descendientes de Aarón recibieron Hebrón, una ciudad de refugio, Libna, Jatir, Estemoa,
59 na Ashan, na Juta, na Bet-Shemesh, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
Asán, Juta y Bet Semes, junto con sus pastizales.
60 Site nʼebo Benjamin e nyere ha obodo Gibiọn, Geba, Alemet, na Anatot, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Obodo ndị a, nke e kere nʼetiti ndị ikwu Kohat, dị iri na otu nʼọnụọgụgụ.
De la tribu de Benjamín recibieron Gabaón, Geba, Alemeth y Anathoth, junto con sus pastizales. Tenían un total de trece ciudades entre sus familias.
61 E fere nza tupu e nye ndị fọdụrụ nʼime ikwu Kohat obodo iri site nʼala ọkara ebo Manase.
Los demás descendientes de Coat recibieron por sorteo diez ciudades de la media tribu de Manasés.
62 E fekwara nza nye agbụrụ niile dị nʼikwu Geshọm obodo iri na atọ na Bashan, site nʼala ebo Isaka, na Asha, na Naftalị, na agbụrụ niile dị nʼikwu Manase.
Los descendientes de Gersón, por familia, recibieron trece ciudades de las tribus de Isacar, Aser y Neftalí, y de la media tribu de Manasés en Basán.
63 E fekwara nza nye ikwu Merari obodo iri na abụọ site nʼala ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
Los descendientes de Merari, por familia, recibieron doce ciudades de las tribus de Rubén, Gad y Zabulón.
64 Otu a ka ndị Izrel si nye ndị Livayị obodo ndị a na ebe ịta nri nke anụ ụlọ dị.
El pueblo de Israel dio a los levitas estas ciudades y sus pastizales.
65 Site nʼebo Juda, na Simiọn, na Benjamin ka e si kenye ha obodo ndị ahụ a kpọrọ aha ha na mbụ.
A las ciudades ya mencionadas les asignaron por nombre las de las tribus de Judá, Simeón y Benjamín.
66 E sitere nʼala ndị ebo Ifrem kenye ụfọdụ nʼime ndị agbụrụ Kohat obodo ụfọdụ.
Algunas de las familias coatitas recibieron como territorio ciudades de la tribu de Efraín.
67 Nʼala ugwu ugwu Ifrem e kenyere ha Shekem (obodo mgbaba), na Gaza,
Se les dio Siquem, una ciudad de refugio, en la región montañosa de Efraín, Gezer,
68 na Jokmeam, na Bet-Horon,
Jocmeán, Bet-Horon,
69 na Aijalon, na, Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara ya gburugburu.
Aijalon y Gat Rimmon, junto con sus pastizales.
70 Site nʼọkara ebo Manase, ndị Izrel nyere ndị ikwu Kohat fọdụrụ obodo ndị a: Anea na Bileam, tinyere ala ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
De la mitad de la tribu de Manasés, el pueblo de Israel dio Aner y Bileam, junto con sus pastizales, al resto de las familias coatitas.
71 Ndị Geshọm natara obodo ndị a: Site nʼagbụrụ ọkara ebo Manase ha natara Golan, nke dị na Bashan, na Ashtarọt, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
Los descendientes de Gersón recibieron lo siguiente. De la familia de la media tribu de Manasés Golán en Basán, y Astarot, junto con sus pastizales;
72 Ebo Isaka nyere ha Kedesh, Daberat,
de la tribu de Isacar: Cedes, Daberat,
73 Ramọt na Anem, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
Ramot y Anem, junto con sus pastizales;
74 Ebo Asha nyere ha Mashal, Abdon,
de la tribu de Aser: Masal, Abdón,
75 Hukọk na Rehob, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
Hucoc y Rehob, junto con sus pastizales;
76 Ebo Naftalị nyere ha Kedesh nʼime Galili, Hamọn na Kiriatem, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
y de la tribu de Neftalí: Cedes en Galilea, Hamón y Quiriatím, con sus pastizales.
77 Ndị ebo Zebụlọn nyere ụmụ Merari ndị Livayị fọdụrụ ala ndị a: Jokneam, Kata, Rimọn na Taboa, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
Los demás descendientes de Merari recibieron lo siguiente. De la tribu de Zabulón Jocneam, Carta, Rimón y Tabor, con sus pastizales;
78 Ma nʼofe osimiri Jọdan, nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko, ndị ebo Ruben nyere ha obodo Beza dị nʼọzara, nyekwa ha Jahaz,
de la tribu de Rubén, al este del Jordán, frente a Jericó: Beser (en el desierto), Jahzá,
79 Kedemot na Mefaat, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.
Cedemot y Mefat, con sus pastizales
80 Ndị ebo Gad nyere ha Ramọt nke Gilead, Mahanaim,
y de la tribu de Gad: Ramot de Galaad, Mahanaim,
81 Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.
Hesbón y Jazer, con sus pastizales.