< Zabura 36 >

1 Don mai bi da kaɗe-kaɗe. Ta Dawuda bawan Ubangiji. Akwai magana a cikin zuciyata game da zunubin mugu. Babu tsoron Allah a idanunsa.
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị. E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe: Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke dị nʼanya ha.
2 Gama a idanunsa yana ganin kansa wani abu ne wanda ya sha ƙarfi a gane ko ya ƙi zunubinsa.
Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha, na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.
3 Kalmomin bakinsa mugaye ne da kuma ruɗu; ya daina zama mai hikima da yin alheri.
Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ; ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma.
4 Ko a kan gadonsa ma yana shirya mugunta; yakan sa kansa ga aikata zunubi kuma ba ya ƙin abin da ba shi da kyau.
Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe; ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume, ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.
5 Ƙaunarka, ya Ubangiji, kan kai sammai, amincinka har sararin sammai.
O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe, ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe.
6 Adalcinka yana kama da manyan duwatsu, hukuncinka kamar zurfi mai girma. Ya Ubangiji, kana lura da mutum da dabba.
Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu, ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri. O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.
7 Ina misalin ƙaunarka marar ƙarewa! Mutane manya da ƙanana kan sami mafaka cikin inuwar fikafikanka.
Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke! Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.
8 Suna biki a yalwar gidanka; kakan ba su sha daga rafin farin cikinka.
Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị; Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.
9 Gama a gare ka akwai maɓulɓular rai cikin haskenka mukan ga haske.
Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.
10 Ka ci gaba da ƙaunarka ga waɗanda suka san ka, adalcinka ga masu gaskiyar zuciya.
Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị, ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.
11 Kada ka bari ƙafar mai girman kai yă fāɗa mini, ko hannun mugu ya kore ni.
Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi, ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.
12 Dubi yadda masu aikata zunubi suka fāɗi, a zube, ba za su kuwa iya tashi ba!
Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala, a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.

< Zabura 36 >