< Karin Magana 9 >

1 Hikima ta gina gidanta; ta yi ginshiƙansa bakwai.
Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa.
2 Ta shirya abincinta gauraye da ruwan inabinta; ta kuma shirya teburinta.
O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya.
3 Ta aiki bayinta mata, tana kuma kira daga wurare masu tsayi na birnin.
O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị,
4 “Bari dukan waɗanda suke marasa azanci su zo nan ciki!” Tana faɗa wa marasa hankali.
“Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị,
5 “Ku zo, ku ci abincina da ruwan inabin da na gauraye.
“Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara.
6 Ku bar hanyoyinku marasa hankali za ku kuwa rayu; yi tafiya a hanyar fahimi.
Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.”
7 “Duk wanda ya yi wa mai ba’a gyara yana gayyatar zagi duk wanda ya tsawata wa mugu yakan gamu da cin mutunci.
Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha.
8 Kada ka tsawata wa masu ba’a gama za su ƙi ka; ka tsawata wa mai hikima zai kuwa ƙaunace ka.
Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya.
9 Ka koya wa mai hikima zai kuwa ƙara hikima; ka koya wa mai adalci zai kuwa ƙara koyonsa.
Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya.
10 “Tsoron Ubangiji shi ne mafarin hikima, sanin Mai Tsarki kuwa fahimi ne.
Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
11 Gama ta wurina kwanakinka za su yi yawa, za a kuwa ƙara wa ranka shekaru.
Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.
12 In kana da hikima, hikimarka za tă ba ka lada; in kai mai ba’a ne, kai kaɗai za ka sha wahala.”
Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru, ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.
13 Wawancin mace a bayyane yake; ba ta da ɗa’a kuma ba ta da sani.
Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ, o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya.
14 Takan zauna a ƙofar gidanta, a wurin zama a wurin mafi tsayi na birni,
Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo,
15 tana kira ga masu wucewa, waɗanda suke tafiya kai tsaye a hanyarsu.
na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku, bụ ndị na-aga mkpa ha,
16 “Bari dukan waɗanda suke marasa azanci su zo cikin nan!” Tana ce wa marasa hankali.
“Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.” Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche,
17 “Ruwan da aka sata ya fi daɗi; abincin da aka ci a ɓoye ya fi daɗi!”
“Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ, nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ.”
18 Amma ba su san cewa matattu suna a can ba, cewa baƙinta suna a can cikin zurfin kabari ba. (Sheol h7585)
Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ. (Sheol h7585)

< Karin Magana 9 >