< Ƙidaya 33 >

1 Ga wuraren da Isra’ilawa suka yi sansani sa’ad da suka fito runduna-runduna a ƙarƙashin Musa da Haruna daga Masar.
Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a.
2 Bisa ga umarnin Ubangiji, Musa ya rubuta wuraren tafiye-tafiyensu da sansaninsu. Ga yadda tafiye-tafiyen suka kasance.
Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
3 Isra’ilawa sun tashi daga Rameses a rana ta goma sha biyar, ga watan fari, kashegarin Bikin Ƙetarewa. Suka fita gabagadi a gaban dukan Masarawa,
Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt,
4 waɗanda suke binne gawawwakin’ya’yan farinsu da Ubangiji ya karkashe; gama Ubangiji ya hukunta allolinsu.
mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.
5 Isra’ilawa suka tashi daga Rameses, suka yi sansani a Sukkot.
Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.
6 Suka tashi daga Sukkot, suka yi sansani a Etam, a gefen hamada.
Ha hapụrụ Sukọt bịaruo Etam, nke dị nʼọnụ ọnụ ọzara ahụ.
7 Suka tashi daga Etam, suka koma baya zuwa Fi Hahirot, wajen gabashin Ba’al-Zafon, suka yi sansani kusa da Migdol.
Ha hapụrụ Etam laghachi azụ gaa Pi Hahirot, nke dị nso nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Baal-Zefọn, ebe ha manyere ụlọ ikwu ha na ndịda ugwu Migdol.
8 Suka tashi daga Fi Hahirot, suka ratsa cikin teku zuwa hamada, bayan sun yi tafiya kwana uku a cikin Hamadan Etam, sai suka yi sansani a Mara.
Mgbe ha hapụrụ Pi Hahirot, ha sitere nʼetiti Osimiri Uhie gafee gaa ije ụbọchị atọ bata nʼọzara Etam. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mara.
9 Suka tashi daga Mara, suka tafi Elim, inda akwai maɓulɓulan ruwa goma sha biyu, da itatuwan dabino guda saba’in, suka yi sansani a can.
Mgbe ha hapụrụ Mara, ha batara Elim, ebe e nwere mmiri iri na abụọ si nʼala na-asọpụta, na iri osisi nkwụ asaa. Ha nọrọ ọdụ dị ukwuu nʼebe a.
10 Suka tashi daga Elim, suka yi sansani kusa da Jan Teku.
Mgbe ha hapụrụ Elim, ha wuru ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.
11 Suka tashi daga Jan Teku, suka yi sansani a Hamadan Sin.
Emesịa, ha hapụrụ Osimiri Uhie gaa maa ụlọ ikwu ha nʼọzara a na-akpọ Sin.
12 Suka tashi daga Hamadan Sin, suka yi sansani a Dofka.
Ha hapụrụ ọzara Sin gaa maa ụlọ ikwu ha na Dofka.
13 Suka tashi daga Dofka, suka yi sansani a Alush.
Emesịa, ha hapụrụ Dofka bịaruo Alush maa ụlọ ikwu ha.
14 Suka tashi daga Alush, suka yi sansani a Refidim, inda babu ruwan da mutane za su sha.
Mgbe ha hapụrụ Alush, ha rutere Refidim, ebe ndị Izrel na-ahụghị mmiri ọṅụṅụ.
15 Suka tashi daga Refidim, suka yi sansani a Hamadan Sinai.
Ha hapụrụ Refidim bịaruo nʼọzara Saịnaị ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
16 Suka tashi daga Hamadan Sinai, suka yi sansani a Kibrot Hatta’awa.
Ha hapụrụ ọzara Saịnaị bịaruo Kibrọt Hataava ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
17 Suka tashi daga Kibrot Hatta’awa, suka yi sansani a Hazerot.
Ha hapụrụ Kibrọt Hataava bịaruo Hazerọt ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
18 Suka tashi daga Hazerot, suka yi sansani a Ritma.
Ha hapụrụ Hazerọt bịaruo Ritma ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
19 Suka tashi daga Ritma, suka yi sansani a Rimmon Ferez.
Ha hapụrụ Ritma bịaruo Rimon-Perez ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
20 Suka tashi daga Rimmon Ferez, suka yi sansani a Libna.
Ha hapụrụ Rimon-Perez bịaruo Libna ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
21 Suka tashi daga Libna, suka yi sansani a Rissa.
Ha hapụrụ Libna bịaruo Rissa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
22 Suka tashi daga Rissa, suka yi sansani a Kehelata.
Ha hapụrụ Rissa bịaruo Kehelata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
23 Suka tashi daga Kehelata, suka yi sansani a Dutsen Shefer.
Ha hapụrụ Kehelata bịaruo nʼugwu Shefa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
24 Suka tashi daga Dutsen Shefer, suka yi sansani a Harada.
Ha hapụrụ ugwu Shefa bịaruo Harada ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
25 Suka tashi daga Harada, suka yi sansani a Makhelot.
Ha hapụrụ Harada bịaruo Makhelot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
26 Suka tashi daga Makhelot, suka yi sansani a Tahat.
Ha hapụrụ Makhelot bịaruo Tahat ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
27 Suka tashi daga Tahat, suka yi sansani a Tera.
Ha hapụrụ Tahat bịaruo Tera ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
28 Suka tashi daga Tera, suka yi sansani a Mitka.
Ha hapụrụ Tera bịaruo Mitka ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
29 Suka tashi daga Mitka, suka yi sansani a Hashmona.
Ha hapụrụ Mitka bịaruo Hashmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
30 Suka tashi daga Hashmona, suka yi sansani a Moserot.
Ha hapụrụ Hashmona bịaruo Moserot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
31 Suka tashi daga Moserot, suka yi sansani a Bene Ya’akan.
Ha hapụrụ Moserot bịaruo Bene Jaakan ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
32 Suka tashi daga Bene Ya’akan, suka yi sansani a Hor Haggidgad.
Ha hapụrụ Bene Jaakan bịaruo Họ Hagịdgad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
33 Suka tashi daga Hor Haggidgad, suka yi sansani a Yotbata.
Ha hapụrụ Họ Hagịdgad bịaruo Jotbata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
34 Suka tashi daga Yotbata, suka yi sansani a Abrona.
Ha hapụrụ Jotbata bịaruo Abrona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
35 Suka tashi daga Abrona, suka yi sansani a Eziyon Geber.
Ha hapụrụ Abrona bịaruo Eziọn Geba ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
36 Suka tashi daga Eziyon Geber, suka yi sansani a Kadesh, cikin Hamadan Zin.
Ha hapụrụ Eziọn Geba bịa maa ụlọ ikwu ha na Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.
37 Suka tashi daga Kadesh, suka yi sansani a Dutsen Hor, a iyakar Edom.
Ha hapụrụ Kadesh bịa maa ụlọ ikwu ha nʼugwu Hor nʼoke ala ndị Edọm.
38 Bisa ga umarni Ubangiji, Haruna firist, ya hau Dutsen Hor, inda ya mutu a rana ta fari ga watan biyar, a shekara ta arba’in, bayan Isra’ilawa suka fito daga Masar.
Erọn, bụ onye nchụaja gbagoro nʼugwu Hor site nʼiwu Onyenwe anyị. Nʼebe ọ nọ nwụọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke ise, nʼafọ nke iri anọ site na mgbe ụmụ Izrel si Ijipt pụta.
39 Haruna yana da shekara ɗari da ashirin da uku, sa’ad da ya mutu a Dutsen Hor.
Erọn gbara narị afọ na iri afọ abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ nʼugwu Hor.
40 Sarki Arad Bakan’ane, wanda yake zaune a Negeb na Kan’ana, ya ji labari cewa Isra’ilawa suna zuwa.
Onye Kenan bụ eze Arad, onye bi na Negev nʼime ala Kenan, nụrụ na ndị Izrel na-abịa.
41 Suka tashi daga Dutsen Hor, suka yi sansani a Zalmona.
Ha hapụrụ ugwu Hor bịaruo Zalmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
42 Suka tashi daga Zalmona, suka yi sansani a Funon.
Ha hapụrụ Zalmona bịaruo Punon ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
43 Suka tashi daga Funon, suka yi sansani a Obot.
Ha hapụrụ Punon bịaruo Obot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
44 Suka tashi daga Obot, suka yi sansani a Iye Abarim, a iyakar Mowab.
Ha hapụrụ Obot bịaruo Iye Abarim, nʼoke ala ndị Moab.
45 Suka tashi daga Iyim, suka yi sansani a Dibon Gad.
Ha hapụrụ Iye Abarim bịaruo Dibọn Gad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
46 Suka tashi daga Dibon Gad, suka yi sansani a Almon Dibilatayim.
Ha hapụrụ Dibọn Gad bịaruo Almon Diblataim ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
47 Suka tashi daga Almon Dibilatayim, suka yi sansani a duwatsun Abarim, kusa da Nebo.
Ha hapụrụ Almon Diblataim bịaruo nʼugwu Abarim nke dị nso na Nebo ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
48 Suka tashi daga duwatsun Abarim, suka yi sansani a filayen Mowab kusa da Urdun, ɗaura da Yeriko.
Ha hapụrụ ugwu Abarim bata nʼobosara ala Moab nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
49 A can filayen Mowab, suka yi sansani kusa da Urdun ɗaura da Bet-Yeshimot har zuwa Abel-Shittim.
Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab.
50 A filayen Mowab kusa da Urdun ɗaura da Yeriko ne Ubangiji ya ce wa Musa,
Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya,
51 “Ka gaya wa Isra’ilawa cewa, ‘Sa’ad da kuka haye Urdun zuwa Kan’ana,
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan,
52 ku kori dukan mazaunan ƙasar a gabanku. Ku rurrushe sassaƙaƙƙun duwatsu, da siffofinsu na zubi, ku kuma rurrushe dukan masujadansu na kan tudu.
unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe.
53 Ku mallaki ƙasar, ku kuma zauna a ciki, gama na ba ku ƙasar, ku mallake ta.
Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya.
54 Ku rarraba ƙasar ta wurin jefan ƙuri’a, bisa ga kabilanku. Kabilar da take babba, a ba ta babban gādo, ƙarami kabila kuwa, a ba ta ƙaramin gādo. Duk abin da ƙuri’a ta ba su, shi zai zama nasu. Ku rarraba wannan bisa zuriyar kakanninku.
Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị.
55 “‘Amma in ba ku kori mazaunan ƙasar ba, waɗanda kuka bari su ci gaba da zama, za su zama muku hakki a idanunku, da kuma ƙayayyuwa a bayanku. Za su ba ku wahala a ƙasar da kuke zama.
“‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị niile bi nʼala ahụ, ndị unu hapụrụ ga-abụrụ unu iberibe unyi nʼanya unu. Ha ga-adịkwara unu ka ogwu nke ga-adụkasị unu ahụ. Ha ga-enye unu nsogbu nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya.
56 Sa’an nan kuwa zan yi muku abin da na shirya yin musu.’”
Mgbe ahụ kwa, aga m emeso unu ụdị mmeso ahụ m na-akwado imeso ha ugbu a.’”

< Ƙidaya 33 >