< Firistoci 15 >

1 Ubangiji ya ce wa Musa da Haruna,
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
2 “Yi wa Isra’ilawa magana, ku ce musu, ‘Duk sa’ad da wani namiji yake ɗiga daga azzakarinsa, wannan ɗiga marar tsarki ne.
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nwoke ọbụla ihe nsọpụta si nʼahụ ya na-asọpụta, bụ onye rụrụ arụ.
3 Ko ɗigar ta ci gaba da fitowa daga azzakarinsa ko an tsere ta, za tă sa mutumin yă zama marar tsarki. Ga yadda ɗigarsa za tă kawo ƙazantuwa,
Onye ahụ rụrụ arụ mgbe ihe ahụ si ya nʼahụ na-asọpụta, rụọkwa arụ mgbe ihe ahụ kwụsịrị ịsọ. Otu a ka ihe ọsụsọ ahụ si eme ka onye ahụ rụọ arụ.
4 “‘Duk gadon da mutumin mai ɗigar ya kwanta a kai, zai zama marar tsarki, kuma duk abin da ya zauna a kai, zai zama marar tsarki.
“‘Ihe ọbụla onye ahụ ji anọdụ ala, maọbụ nke o ji dinaa bụ ihe rụrụ arụ.
5 Duk wanda ya taɓa gadonsa dole yă wanke rigunansa, yă kuma yi wanka, zai kuwa ƙazantu har yamma.
Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya, na ahụ ya mmiri.
6 Duk wanda ya zauna a inda wannan mai ɗiga ya zauna a kai, dole yă wanke rigunansa yă kuma yi wanka, zai kuwa ƙazantu har yamma.
Onye ọbụla nọdụrụ ala nʼihe onye ahụ nọdụrụ ala nʼoge ahụ ọ bụ onye rụrụ arụ, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya, na ahụ ya mmiri.
7 “‘Duk wanda ya taɓa jikin mai ɗiga, dole yă wanke rigunansa, yă kuma yi wanka, zai kuma ƙazantu har yamma.
“‘Onye ọbụla metụrụ nwoke ahụ ihe si nʼahụ ya na-asọpụta aka ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri, bụrụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
8 “‘In mai ɗiga ya tofa miyau a kan wani wanda yake tsarkakakke, dole tsarkakakken nan yă wanke rigunansa, yă kuma yi wanka, zai kuma ƙazantu har yamma.
“‘Onye ọbụla dị ọcha nke onye ahụ bụsara ọnụ mmiri ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
9 “‘Kowane sirdi da mai ɗigar ya zauna a kai zai ƙazantu,
“‘Ihe ọbụla onye ahụ ji anọkwasị nʼelu anụmanụ ọ na-agba ga-abụ ihe rụrụ arụ.
10 kuma duk wanda ya taɓa wani abu cikin abubuwan da suke a ƙarƙashin sirdin zai ƙazantu har yamma; duk wanda ya ɗauki abubuwan nan dole yă wanke rigunansa, yă kuma yi wanka, zai kuwa ƙazantu har yamma.
Onye ọbụla ga-eburu, maọbụ metụ ihe ọbụla o ji nọdụ ala aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
11 “‘Duk wanda mai ɗiga ya taɓa ba tare da ya wanke hannuwansa da ruwa ba, dole yă wanke rigunansa yă kuma yi wanka, zai kuma ƙazantu har yamma.
“‘Ọ bụrụ na nwoke ahụ rụrụ arụ ebughị ụzọ saa aka ya tupu o metụ mmadụ aka, onye ahụ o metụrụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
12 “‘Dole a farfashe tukunya lakar da mutumin ya taɓa, kuma dole a ɗauraye duk wani abin da aka yi da katako wanda ya taɓa da ruwa.
“‘A ga-etiwa ite aja ọbụla onye ahụ metụrụ aka, jiri mmiri ṅachaa ihe osisi ọbụla o metụrụ aka.
13 “‘Sa’ad da aka tsabtacce mai ɗigar, zai ɗauki kwana bakwai don tsabtaccewarsa; dole yă wanke rigunansa, yă kuma yi wanka mai tsabta, zai kuwa zama tsarkakakke.
“‘Mgbe e mere ka onye ahụ bụrụ onye dị ọcha site nʼihe nsọpụta a, ọ ga-anọ ụbọchị asaa maka ịdị ọcha ya. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya nʼime mmiri na-asọ asọ tupu ọ bụrụ onye dị ọcha.
14 A rana ta takwas dole yă ɗauki kurciyoyi biyu ko tattabarai biyu, yă zo gaban Ubangiji a ƙofar Tentin Sujada, yă ba da su ga firist.
Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ bịa nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, were ha nye onye nchụaja.
15 Firist ɗin zai miƙa su, ɗaya domin hadaya don zunubi, ɗayan kuma domin hadaya ta ƙonawa. Ta haka zai yi kafara a gaban Ubangiji saboda mai ɗigar.
Onye nchụaja ga-eji ha chụọrọ ya aja nʼebe ahụ. Otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ maka aja nsure ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri nwoke ahụ mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị nʼihi ihe ọsụsọ ahụ.
16 “‘Sa’ad da namiji ya ɗigar maniyyi, dole yă wanke jikinsa gaba ɗaya da ruwa, zai kuma ƙazantu har yamma.
“‘Nwoke ọbụla mkpụrụ nwa ya si ya nʼamụ pụọ, ga-asa ahụ ya nke ọma, bụrụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
17 Dole a wanke duk riga ko fatar da yake da maniyyin a kansa da ruwa, zai kuma ƙazantu har yamma.
A ga-asacha ihe ọbụla mkpụrụ nwa ahụ metụrụ, maọbụ akwa maọbụ akpụkpọ anụ. Ha ga-abụ ihe rụrụ arụ ruo uhuruchi.
18 Sa’ad da namiji ya kwana da mace ya kuwa zub da maniyyi, dole dukansu biyu su yi wanka, za su kuma ƙazantu har yamma.
Mgbe nwoke na nwanyị dinakọrọ, ma nwoke ahụ anyụpụta mkpụrụ nwa, ha abụọ ga-asa ahụ ha nke ọma, bụrụ ndị rụrụ arụ ruo uhuruchi.
19 “‘Sa’ad mace take al’adarta ta ƙa’ida, rashin tsabtarta ta al’adar zai ɗauki kwana bakwai, kuma duk wanda ya taɓa ta, zai ƙazantu har yamma.
“‘Mgbe ọbara si nwanyị nʼahụ pụọ dịka o kwesiri nʼoge a kara aka nʼọnwa ọbụla, nwanyị ahụ ga-abụ onye rụrụ arụ ụbọchị asaa. Onye ọbụla metụrụ ya aka nʼoge a ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
20 “‘Duk abin da ta kwanta a kai a lokacin al’adarta zai ƙazantu, kuma duk abin da ta zauna a kai zai ƙazantu.
“‘Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya nʼoge a, maọbụ ihe ọ nọkwasịrị nʼelu ya ga-arụ arụ.
21 Duk wanda ya taɓa gadonta dole yă wanke rigunansa yă kuma yi wanka, zai kuma ƙazantu har yamma.
Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka, ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
22 Duk wanda ya taɓa wani abin da ta zauna a kai, dole yă wanke rigunansa yă kuma yi wanka, zai kuma ƙazantu har yamma.
Onye metụrụ ihe o ji nọdụ ala aka ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
23 Ko gado ne, ko kuwa wani abin da ta zauna a kai, sa’ad da wani ya taɓa shi, zai ƙazantu har yamma.
Ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe ndina ya, maọbụ ihe ọzọ nke o ji nọdụ ala, onye ọbụla metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
24 “‘In namiji ya kwana da ita, al’adarta kuwa ta taɓa shi, zai ƙazantu na kwana bakwai; duk kuma gadon da ya kwanta a kai, zai ƙazantu.
“‘Nwoke dinakwuru nwanyị ọbara si nʼahụ ya na-apụta, ọ bụrụ na ọbara ahụ emetụ ya, ọ ga-abụ onye rụrụ arụ abalị asaa. Ihe ndina ọbụla o dinara nʼelu ya ga-abụ ihe rụrụ arụ.
25 “‘Idan mace tana ɗigar jini na tsawon kwanaki, ban da kwanakin ganin al’adarta, ko kuwa idan al’adarta ya wuce yawan kwanakin da ya kamata, to, za tă ƙazantu daidai kamar na kwanakin al’adar da ta saba yi. Wato, muddin tana cikin ɗiga, ta zama mai ƙazanta.
“‘Ọ bụrụ na ọbara si nwanyị nʼahụ na-apụta agafee oge o kwesiri ịkwụsị maọbụ na ọ pụtara nʼoge ọ na-ekwesighị ịpụta, nwanyị ahụ ga-anọgide bụrụ onye rụrụ arụ ogologo ụbọchị ndị ahụ niile ọbara ahụ si ya nʼahụ na-apụta.
26 Duk gadon da ta kwanta yayinda ta ci gaba da ɗiga zai zama marar tsarki, kamar yadda gadonta yake a lokacin al’adarta, kuma duk abin da ta zauna a kai zai zama marar tsarki, kamar yadda yake a lokacin al’adarta.
Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya mgbe ọbara si ya nʼahụ na-apụta, maọbụ ihe ọbụla ọ nọdụrụ ala nʼelu ya, ga-abụ ihe rụrụ arụ, dịka mgbe ọbara nke oge a kara aka.
27 Duk wanda ta taɓa su zai zama marar tsarki; dole yă wanke rigunansa yă kuma yi wanka, zai kuma ƙazantu har yamma.
Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya maọbụ ihe ọ nọdụrụ ala nʼelu ya aka, ga-arụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asakwa uwe ya na ahụ ya mmiri.
28 “‘Sa’ad da aka tsabtacce ta daga ɗigarta, dole tă ɗauki kwana bakwai, bayan haka za tă zama mai tsarki.
“‘Mgbe ọbara ahụ kwụsịrị, ọ ga-agụ ụbọchị asaa site nʼoge ọ kwụsịrị. Mgbe abalị asaa ahụ zuru, ọ ga-abụ onye dị ọcha.
29 A rana ta takwas, dole tă ɗauki kurciyoyi biyu ko tattabari biyu ta kawo su ga firist a bakin ƙofar Tentin Sujada.
Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
30 Firist zai miƙa ɗaya saboda hadaya don zunubi, ɗayan kuma don hadaya ta ƙonawa. Ta haka zai yi kafara dominta a gaban Ubangiji saboda ƙazantar ɗigarta.
Onye nchụaja ahụ ga-eji otu chụọrọ ya aja mmehie, werekwa nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi adịghị ọcha nke ihe ọsụsọ ya.
31 “‘Ta haka za ka tsarkake Isra’ilawa daga rashin tsarkinsu, domin kada su mutu saboda rashin tsarkinsu ta wurin ƙazantar da wurin zamana wanda yake tsakiyarsu.’”
“‘Unu ga-ekewapụ ụmụ Izrel site nʼihe ndị ahụ na-emerụ ha, ka ha ghara ịnwụ nʼọnọdụ adịghị ọcha ha nʼihi imerụ ụlọ nzute m, nke dị nʼetiti ha.’”
32 Waɗannan su ne ƙa’idodi a kan wanda yake ɗiga, da wanda yake zubar da maniyyi,
Ndị a bụ usoro iwu gbasara ndị ikom ihe si nʼahụ ha na-asọpụta, na ndị ikom rụrụ arụ nʼihi mkpụrụ nwa si ha nʼahụ pụọ.
33 ƙa’idodi ne kuma ga mace wadda take al’ada, ga namiji ko macen da take ɗiga, ga kuma namijin da ya kwana da mace marar tsarki.
Ọ bụkwa iwu dịrị nwanyị ọbara si nʼahụ ya pụọ nʼoge a kara aka, na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla ihe si nʼahụ ya na-asọpụta, na nke dịrị nwoke ọbụla ya na nwanyị ga-edinakọ nʼoge nwanyị ahụ bụ onye rụrụ arụ.

< Firistoci 15 >