< Makoki 3 >

1 Ni ne mutumin da ya ga azaba ta wurin bulalar fushin Ubangiji.
Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.
2 Ya kore ni, ya sa na yi tafiya a cikin duhu maimakon a cikin haske;
O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè.
3 ba shakka, ya juya mini baya, yana gāba da ni sau da sau, dukan yini.
Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.
4 Ya sa fatar jikina da naman jikina sun tsufa ya kuma karya ƙasusuwana.
O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.
5 Ya yi mini kwanton ɓauna ya kuma kewaye ni da baƙin ciki da kuma wahala.
O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.
6 Ya sa na zauna a cikin duhu kamar waɗanda suka mutu da jimawa.
O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.
7 Ya kewaye ni yadda ba zan iya gudu ba; Ya daure ni da sarƙa mai nauyi.
Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.
8 Ko lokacin da nake kira don neman taimako, ba ya jin addu’ata.
Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.
9 Ya tare hanyata da tubula na duwatsu; ya sa hanyata ta karkace.
O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.
10 Kamar beyar da take a laɓe tana jira, kamar zaki a ɓoye,
Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,
11 ya janye ni daga kan hanya ya ɓatar da ni ya bar ni ba taimako.
o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
12 Ya ja kwarinsa ya sa in zama abin baratarsa.
Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.
13 Ya harbi zuciyata da kibiyoyin kwarinsa.
O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi.
14 Na zama abin dariya ga mutanena duka; suna yi mini ba’a cikin waƙa dukan yini.
Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
15 Ya cika ni da kayan ɗaci ya gundure ni da abinci mai ɗaci.
O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.
16 Ya kakkarya haƙorana da tsakuwa; ya tattake ni cikin ƙura.
O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
17 An hana ni salama; na manta da ko mene ne ake kira wadata.
Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
18 Saboda haka na ce, “Darajata ta ƙare da kuma duk abin da nake begen samu daga wurin Ubangiji.”
Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”
19 Na tuna da azabata da kuma sintiri, da na yi ta yi da ɗacin rai.
Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.
20 Na tuna su sosai, sai kuma na ji ba daɗi a raina.
Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.
21 Duk da haka na tuna da wannan na kuma sa bege ga nan gaba.
Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya.
22 Domin ƙaunar Ubangiji ba mu hallaka ba; gama jiyejiyanƙansa ba su ƙarewa.
Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
23 Sababbi ne kowace safiya; amincinka kuwa mai girma ne.
Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
24 Na ce wa kaina, “Ubangiji shi ne nawa; saboda haka zan jira shi.”
Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
25 Ubangiji mai alheri ne ga waɗanda suke da bege a cikinsa, ga kuma wanda yake neman shi;
Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
26 yana da kyau ka jira shiru domin samun ceton Ubangiji.
Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
27 Yana da kyau mutum yă sha wuya tun yana yaro.
Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.
28 Bari yă zauna shiru shi kaɗai, gama haka Ubangiji ya sa yă yi.
Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.
29 Bari yă ɓoye fuskarsa cikin ƙura kila akwai bege.
Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.
30 Bari yă ba da kumatunsa a mare shi, yă kuma bari a ci masa mutunci.
Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.
31 Gama Ubangiji ba ya yashe mutane har abada.
Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi.
32 Ko da ya kawo ɓacin rai, zai nuna tausayi sosai, ƙaunarsa tana da yawa.
Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
33 Gama ba haka kawai yake kawo wahala ko ɓacin rai ga’yan adam ba.
Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.
34 Bai yarda a tattake’yan kurkuku a ƙasa ba,
Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ
35 ko kuma a danne wa mutum hakkinsa a gaban Maɗaukaki,
ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,
36 ko kuma a danne wa mutum shari’ar gaskiya ashe Ubangiji ba zai ga irin waɗannan abubuwa ba?
ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?
37 Wane ne ya isa yă yi magana kuma ta cika in ba Ubangiji ne ya umarta ba?
Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?
38 Ba daga bakin Maɗaukaki ne bala’i da abubuwa masu kyau suke fitowa ba?
Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?
39 Don mene ne wani mai rai zai yi gunaguni sa’ad da aka ba shi horo domin zunubansa?
Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?
40 Bari mu auna tafiyarmu mu gwada ta, sai mu kuma koma ga Ubangiji.
Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya. Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.
41 Bari mu ɗaga zuciyarmu da hannuwanmu ga Allah na cikin sama, mu ce,
Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
42 “Mun yi zunubi mun yi tawaye ba ka kuwa gafarta ba.
“Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.
43 “Ka rufe kanka da fushi, ka fafare mu; ka karkashe mu ba tausayi.
“I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.
44 Ka rufe kanka da gajimare don kada addu’armu ta kai wurinka.
I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị ka ekpere anyị ghara irute gị.
45 Ka mai da mu tarkace da juji a cikin mutane.
I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ nʼetiti mba niile.
46 “Dukan maƙiyanmu suna ta yin mana magana marar daɗi.
“Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha megide anyị.
47 Muna cika da tsoro, da lalatarwa da hallakarwa.”
Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche, na mbibi na ịla nʼiyi.”
48 Hawaye na kwararowa daga idanuna domin an hallaka mutanena.
Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi.
49 Idanuna za su ci gaba da kwararowa da hawaye, ba hutawa.
Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị,
50 Har sai in Ubangiji ya duba daga sama ya gani.
tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ.
51 Abin da nake gani yana kawo mini baƙin ciki domin dukan matan birnina.
Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.
52 Maƙiyana suna farauta ta ba dalili kamar tsuntsu.
Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
53 Sun yi ƙoƙari su kashe ni a cikin rami suka kuma jajjefe ni da duwatsu;
Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume.
54 ruwaye suka rufe kaina, sai na yi tunani cewa na kusa mutuwa.
Mmiri kpuchiri m isi, echere m na-efuola m.
55 Na yi kira ga sunanka, ya Ubangiji, daga rami mai zurfi.
Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị Onyenwe anyị.
56 Ka ji roƙona, “Kada ka toshe kunnuwanka ka ƙi jin roƙona na neman taimako.”
Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”
57 Ka zo kusa lokacin da na kira ka, kuma ka ce mini, “Kada ka ji tsoro.”
Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.”
58 Ya Ubangiji, ka goyi bayana; ka fanshi raina.
Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m, gị gbapụtara ndụ m.
59 Ya Ubangiji, ka ga inda aka yi mini ba daidai ba. Ka shari’anta, ka ba ni gaskiya!
Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m. Kpechitere m ọnụ m.
60 Ka ga zurfin ramakonsu, da duk mugun shirin da suke yi mini.
Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m.
61 Ya Ubangiji, ka ji zaginsu, da duka mugun shirin da suke yi mini
Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m na nzube niile ha na-ezube megide m.
62 Abin da maƙiyana suke yin raɗa a kai game da ni duk yini.
Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m megide m ogologo ụbọchị niile.
63 Dube su! A zaune ko a tsaye, suna yi mini ba’a cikin waƙoƙinsu.
Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala. Ha ji abụ na-akọcha m.
64 Ka ba su abin da ya dace su samu, ya Ubangiji, domin abin da hannuwansu suka yi.
Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha, nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.
65 Ka sa yana ta rufe zuciyarsu, kuma bari la’anarka ta bi su.
Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha. Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha.
66 Ka fafare su cikin fushi ka hallaka su daga cikin duniya ta Ubangiji.
Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị, ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke Onyenwe anyị ọzọ.

< Makoki 3 >