< Ayuba 26 >

1 Sai Ayuba ya amsa,
Mgbe ahụ, Job zaghachiri:
2 “Yadda ka taimaki marar ƙarfi! Yadda ka ceci marar ƙarfi!
“Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka! Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị!
3 Ka ba marar hikima shawara! Ka nuna kana da ilimi sosai.
Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe! Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara.
4 Wane ne ya taimake ka ka yi waɗannan maganganu? Kuma ruhun wane ne ya yi magana ta bakinka?
Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a? Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu?
5 “Matattu suna cikin azaba, waɗanda suke ƙarƙashin ruwaye da dukan mazauna cikin ruwaye.
“Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu, ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.
6 Mutuwa tsirara take a gaban Allah; haka kuma hallaka take a buɗe. (Sheol h7585)
Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke; mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya. (Sheol h7585)
7 Ya shimfiɗa arewancin sararin sama a sarari; ya rataye duniya ba a jikin wani abu ba.
Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu. O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.
8 Ya naɗe ruwaye a cikin gizagizansa, duk da haka girgijen bai yage saboda nauyi ba.
Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii, ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.
9 Ya rufe fuskar wata, ya shimfiɗa gizagizai a kan shi,
Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya, na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,
10 ya zāna iyakar fuskar ruwa a kan iyakar da take tsakanin duhu da haske.
O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri, ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
11 Madogaran sama sun girgiza, saboda tsawatawarsa.
Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji, tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya.
12 Da ikonsa ya kwantar da teku; da hikimarsa ya hallaka dodon ruwan nan Rahab.
Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri; ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.
13 Da numfashinsa ya sa sararin sama ya yi kyau da hannunsa ya soke macijin nan mai gudu.
Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma; aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ.
14 Waɗannan kaɗan ke nan daga cikin ayyukansa masu yawa. Kaɗan kawai muke ji game da shi! Wane ne kuwa yake iya gane tsawar ikonsa?”
Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya; lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya! Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda nke ike ya?”

< Ayuba 26 >