< Ezekiyel 44 >

1 Sai mutumin ya komo da ni zuwa ƙofar waje na wuri mai tsarki, wadda take fuskantar gabas, tana kuwa a rufe.
Mgbe ahụ, o mere ka m laghachi nʼụzọ, nʼọnụ ụzọ ama nke ebe nsọ ahụ, nke dị nʼezi, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, ma a gbachiri ya agbachi.
2 Ubangiji ya ce mini, “Wannan ƙofar za tă kasance a rufe. Ba za a buɗe ta ba; ba wanda zai shiga ta wurinta. Za tă kasance a rufe domin Ubangiji, Allah na Isra’ila, ya shiga ta wurinta.
Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Ọnụ ụzọ ama nke a ga-abụ ihe e mechiri emechi. A gaghị emeghe ya ọzọ, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi na ya bata. Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel esitela na ya bata. Ya mere, ọ bụ ihe emechiri emechi.
3 Sarki kansa ne kaɗai zai zauna a hanyar shiga don yă ci a gaban Ubangiji. Zai shiga ta hanyar shirayin hanyar shiga yă kuma fita a wannan hanya.”
Naanị nwa eze, naanị ya onwe ya, bụ onye ga-anọdụ ala nʼime ya, iri nri nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ bata, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-esi pụọ.”
4 Sa’an nan mutumin ya kawo ni ta hanyar ƙofar arewa zuwa gaban haikali. Na duba na kuma ga ɗaukakar Ubangiji tana cika haikalin Ubangiji, sai na fāɗi rubda ciki.
Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
5 Ubangiji ya ce mini, “Ɗan mutum, ka lura sosai, ka saurara sosai ka kuma mai da hankali ga kome da na faɗa maka game da dukan ƙa’idodi game da haikalin Ubangiji. Ka lura sosai da ƙofar shigar haikali da kuma dukan ƙofofin wuri mai tsarki.
Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, leruo anya nke ọma, gee ntị nke ọma nʼihe niile m na-agwa gị banyere iwu m niile na usoro niile nke ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Leruo anya nke ọma banyere ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọnsọ ukwu a, na nke ọpụpụ niile nke ebe nsọ a.
6 Faɗa wa’yan tawayen gidan Isra’ila, ‘Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa ayyukan banƙyamarku sun isa haka, ya gidan Isra’ila!
Ị ga-agwa ndị Izrel bụ ndị ụlọ nnupu isi, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, o zuola bụ ibi ndụ arụ unu niile ahụ, unu ndị Izrel!
7 Ban da dukan sauran ayyukanku na banƙyama, kun kawo baƙi marasa kaciya a zuciya da jiki a wurina mai tsarki, kun kuma ƙazantar da haikalina yayinda kuke miƙa mini abinci, kitse da kuma jini, kun kuma karya alkawarina.
Nʼihi na ọ bụghị naanị na ihe arụ unu mere dị ukwu, kama unu mekwara ihe arụ kachasị site nʼịkpọbata ndị ala ọzọ a na-ebighị anụ ahụ ha na obi ha ugwu nʼime ụlọnsọ, si otu a merụọ ụlọnsọ mgbe unu na-ewetara m nri nsọ, nke bụ abụba na ọbara. Nʼụzọ dị otu a, unu emebiela ọgbụgba ndụ m.
8 A maimakon yin ayyukanku bisa ga abubuwana masu tsarki, kun sa waɗansu su lura da wurina mai tsarki.
Unu edebeghị iwu m nyere unu banyere ihe m ndị dị nsọ, kama unu goro ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-elekọta ebe nsọ m.
9 Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa ba baƙo marar kaciya a zuciya da jiki da zai shiga wurina mai tsarki, kai, har ma da baƙin da suke zama a cikin Isra’ila.
Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, o nweghị onye ala ọzọ ọbụla a na-ebighị anụ ahụ ya na obi ya ugwu kwesiri ịbata nʼụlọnsọ m. Ọ bụladị ndị ọbịa ndị bi nʼetiti ụmụ Izrel.
10 “‘Lawiyawan da suka yi nesa da ni sa’ad da Isra’ila suka kauce da kuma waɗanda suka karkata daga gare ni suka bi gumakansu, dole su ɗauki alhakin zunubinsu.
“‘Ndị ikom agbụrụ Livayị niile, ndị sitere nʼijere m ozi wezuga onwe ha mgbe Izrel bidoro ịgbaso arụsị niile ha, ga-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
11 Za su iya yin hidima a wurina mai tsarki, suna lura da ƙofofin haikali suna kuma hidima a cikinsu; za su iya yankan hadayun ƙonawa da sadaka don mutane su kuma tsaya a gaban mutane su yi musu hidima.
Ha ga-abụ ndị na-eje ozi nʼime ebe nsọ m, ndị nlekọta nke ọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwuu, na-ejekwa ozi nʼime ya; ha ga-egburu ndị m anụ e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ na nke aja ndị ọzọ, ha ga-eguzokwa nʼihu ha jeere ha ozi.
12 Amma domin sun yi musu hidima a gaban gumakansu suka sa gidan Isra’ila ya yi zunubi, saboda haka na ɗaga hannu na rantse cewa dole su ɗauki alhakin zunubinsu, in ji Ubangiji Mai Iko Duka.
Ma nʼihi na ha guzoro nʼihu arụsị jeere ha ozi, mee ka ụlọ Izrel daba na mmehie ikpere arụsị, nʼihi nke a, eweliela m aka elu na-aṅụ iyi na ha aghaghị ịta ahụhụ mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
13 Ba za su yi kusa don su yi hidima kamar firistoci ko su zo kusa da abubuwana masu tsarki ko hadayuna mafi tsarki ba; dole su sha kunya saboda ayyukansu na banƙyama.
Ha agaghị abịakwute m nso ije ozi dịka ndị nchụaja, maọbụ bịaruo nso ihe nsọ m niile ọbụla maọbụ onyinye m dị nsọ karịchasịa onyinye nsọ niile, ha aghaghị ibu ọnọdụ ihere nke ihe arụ niile ha mere.
14 Duk da haka zan sa su su lura da ayyukan haikali da kuma dukan ayyukan da za a yi a cikinsa.
Ma aga m ahọpụta ha ka ha bụrụ ndị ilekọta ụlọnsọ m dị nʼaka, nʼihi ịrụ ọrụ niile na ije ozi niile dị nʼime ya.
15 “‘Amma firistoci, waɗanda suke Lawiyawa kuma zuriyar Zadok waɗanda suka yi aminci ta wurin yin ayyukansu a wurina mai tsarki sa’ad da Isra’ilawa suka kauce daga gare ni, su ne za su zo kusa don hidima a gabana; za su tsaya a gabana don miƙa hadayun kitse da jini, in ji Ubangiji Mai Iko Duka.
“‘Ma ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk, ndị Livayị, ndị chegidere ebe nsọ m nche, mgbe Izrel niile sitere nʼebe m nọ kpafuo, ga-abịa nso ijere m ozi, ha ga-eguzo nʼihu m chụọ aja abụba na ọbara. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
16 Su ne kaɗai za su shiga wurina mai tsarki; su ne kaɗai za su zo kusa da teburina don yin hidima a gabana su kuma yi hidimata.
Ọ bụ naanị ha ga-abanye nʼime ebe nsọ m, naanị ha ga-abịakwa na tebul m ije ozi nʼihu m, na ife m dịka ndị nche.
17 “‘Sa’ad da suka shiga ƙofofin fili na can ciki, dole su sa tufafin lilin; kada su sa wani rigar da aka yi da ulu yayinda suke hidima a ƙofofin fili na can ciki da cikin haikali.
“‘Mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama nke ogige dị nʼime, ha ga-eyi naanị akwa ọcha. Ha agaghị eyi uwe ọbụla e ji ajị anụ kpaa mgbe ha na-eje ozi nʼogige ime nke ụlọnsọ ukwu m.
18 Za su naɗa rawunan lilin a kawunansu, su kuma sa wandunan lilin. Kada su sa wani abin da zai sa su yi zuffa.
Ha ga-eji akwa ọcha kee nʼisi ha, yirikwa uwe ọcha nʼukwu ha. Ha agaghị eyi ihe ọbụla ga-eme ka ọsịsọọ gbaa ha.
19 Sa’ad da suka fita daga haikali zuwa fili na waje inda mutane suke, sai su tuɓe rigunan da suka yi hidima da su su bar su a tsarkakan ɗakuna, su sa waɗansu riguna, don kada su tsarkake mutane ta wurin rigunansu.
Mgbe ha na-apụ nʼogige dị nʼezi ebe ndị mmadụ nọ, ha ga-eyipụ uwe ha yi mgbe ha na-eje ozi, hapụkwa ha nʼime ọnụụlọ nsọ ndị a, yiri uwe ọzọ, ka ha ghara ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị e doro nsọ site nʼimetụ uwe ha ahụ.
20 “‘Ba za su aske kawunansu ko su bar gashin kansu ya yi tsayi ba, amma sai su sausaye gashin kansu.
“‘Ha agaghị ekwe ka agịrị isi ha too ogologo, ha agakwaghị akpụchapụ ya. Naanị mkpacha ka ha ga na-akpacha isi ha.
21 Kada firist ya sha ruwan inabi sa’ad da zai shiga fili na can ciki.
Onye nchụaja ọbụla agaghị aṅụ mmanya vaịnị mgbe ọ na-abata nʼogige dị nʼime.
22 Kada su auri gwauruwa ko macen da aka sāke; za su auri budurwai ne kaɗai na Isra’ilawa ko gwaurayen firistoci.
Ha agaghị alụ nwanyị nke di ya nwụrụ anwụ, maọbụ nwanyị gbaara di ya alụkwaghị m. Kama ọ bụ naanị ụmụ agbọghọ ndị sitere nʼagbụrụ Izrel ndị na-amaghị nwoke, maọbụ nwunye ndị nchụaja nwụrụ anwụ.
23 Za su koyar da mutanena bambanci tsakanin tsarki da rashin tsarki su kuma nuna musu yadda za su bambanta marar tsarki da mai tsarki.
Ha ga-akụziri ndị m ihe dị iche nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ; gosi ha otu esi amata ihe dị iche nʼetiti ihe na-adịghị ọcha na nke dị ọcha.
24 “‘A duk wani rashin jituwa, firistoci za su zama alƙalai su kuma yanke magana bisa ga farillaina. Za su kiyaye dokokina da ƙa’idodina a dukan ƙayyadaddun bukukkuwana, su kuma kiyaye Asabbataina da tsarki.
“‘Ha ga-abụ ndị ikpe, idozi esemokwu dapụtara nʼetiti ndị m. Usoro iwu m niile ka ha ga-eji kpee ikpe. Ndị nchụaja nʼonwe ha kwa ga-erube isi nʼiwu m niile nʼoge mmemme ọbụla dị nsọ. Ha ga-ahụkwa na e doro ụbọchị izuike nsọ.
25 “‘Firist ba zai ƙazantar da kansa ta wurin zuwa kusa da gawa ba; amma, in gawar mahaifinsa ko mahaifiyarsa, ko ɗansa ko’yarsa, ko ɗan’uwansa ko’yar’uwarsa ce, to, ba zai ƙazantar da kansa ba.
“‘Onye nchụaja agaghị emerụ onwe ya site nʼije nʼebe ozu dị, karịakwa maọbụ ozu nna ya maọbụ nne ya, ma o bụ nwa ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị na-enweghị di.
26 Bayan ya tsarkaka, dole yă jira har kwana bakwai.
Mgbe e mechara ka ọ dị ọcha ọzọ, ọ ga-echere ruo ụbọchị asaa.
27 A ranar da ya shiga fili na can ciki na wuri mai tsarki don hidima a wuri mai tsarki, zai miƙa hadaya don zunubi saboda kansa, in ji Ubangiji Mai Iko Duka.
Ma nʼụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi nʼụlọ ukwu ahụ ịbanye nʼime ebe nsọ, ọ ga-ebu ụzọ chụọ aja mmehie nʼihi onwe ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
28 “‘Ni ne kaɗai zan zama abin gādon da firistoci za su kasance da shi. Kada ka ba su wani mallaka a Isra’ila; zan zama mallakarsu.
“‘Ọ bụ naanị mụ onwe m bụ ihe nketa nke ndị nchụaja ga-enweta. Unu agaghị enye ha ihe nweta ọbụla nʼIzrel. Mụ onwe m bụ ihe nketa ha.
29 Za su ci hadaya ta gari, hadaya don zunubi da hadaya don laifi; da kuma kowane keɓaɓɓen abu a Isra’ila da za a ba wa Ubangiji zai zama nasu.
Ha ga-eri onyinye ịnata ihuọma, ihe aja mmehie, ihe aja ikpe ọmụma, ihe niile dị nʼIzrel e doro nsọ nye Onyenwe anyị ga-abụ nke ha.
30 Mafi kyau na nunan farinku da kuma dukan kyautanku na musamman za su zama na firistoci. Za ku ba su rabo na fari na ɓarzajjen hatsinku saboda albarka ta kasance a gidanku.
Mkpụrụ mbụ kachasị mma site na mkpụrụ ubi ọbụla na onyinye niile pụrụ iche ga-abụ nke ndị nchụaja. Ọka mbụ a kwọrọ akwọ, nke a na-eweta nʼihe ubi ga-abụkwa nke ndị nchụaja, ime ka ngọzị dịkwasị nʼụlọ unu.
31 Firistoci ba za su ci mushen tsuntsu ko na dabba ba, ba kuwa za su ci waɗanda namun jeji suka kashe ba.
Ndị nchụaja agaghị ata nnụnụ ọbụla, maọbụ anụ nke nwụrụ ọnwụ chi ya, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu.

< Ezekiyel 44 >