< Fitowa 13 >

1 Ubangiji ya ce wa Musa,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
2 “Keɓe mini kowane ɗan fari. Ɗan fari wanda ya fara buɗe mahaifa a cikin Isra’ilawa nawa ne, ko na mutum ko na dabba.”
“Dooro m nsọ onye ọbụla bụ ọkpara, onye ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼetiti ụmụ Izrel, na nʼetiti mmadụ ma nʼetiti anụ ụlọ, nke m ka ọ bụ.”
3 Sai Musa ya ce wa mutane, “Ku tuna da wannan rana, ranar da kuka fito daga Masar, daga ƙasar bauta, gama Ubangiji ya fito da ku da hannu mai iko. Kada ku ci wani abin da yake da yisti.
Mosis gwara ndị Izrel sị, “Chetanụ ụbọchị taa, ụbọchị unu si nʼala Ijipt pụta, ala ebe unu bụ ndị ohu, nʼihi na Onyenwe anyị sitere nʼike aka ya dị ukwu kpọpụta unu site nʼebe ahụ. Unu erikwala achịcha ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee.
4 A wannan rana kuka fita, wato, a watan Abib.
Taa, nʼọnwa Abib, bụ ụbọchị unu na-ahapụ ala Ijipt.
5 Sa’ad da Ubangiji ya kawo ku cikin ƙasar Kan’aniyawa, Hittiyawa, Amoriyawa, Hiwiyawa da Yebusiyawa, ƙasar da ya rantse wa kakanninku cewa zai ba ku, ƙasar da take zub da madara da zuma, za ku kiyaye wannan biki a wannan wata.
Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọrait, ndị Hiv na ndị Jebus bi nʼime ya, bụ ala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha na ọ ga-enye unu, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, unu ga-eme ofufe mmemme a nʼọnwa a.
6 Kwana bakwai za ku ci burodi marar yisti, a kan rana ta bakwai kuma za ku yi biki ga Ubangiji.
Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa ahụ. Nʼụbọchị nke ikpeazụ nʼime ụbọchị asaa ahụ, unu ga-eme mmemme oke oriri nʼihu Onyenwe anyị.
7 Ku ci burodi marar yisti cikin kwana bakwai; kada a sami wani abu mai yisti a cikinku, ko a sami yisti a ko’ina a wurinku.
Rienụ achịcha na-ekoghị eko nʼime ụbọchị asaa ndị ahụ. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼụlọ unu. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼoke ala unu niile.
8 A ranan nan kowa zai faɗa wa ɗanka, ‘Ina yin haka saboda abin da Ubangiji ya yi mini, sa’ad da na fita daga Masar.’
Nʼoge ọbụla ị na-eme mmemme a, kọwaara nwa gị nwoke ihe kpatara i ji eme mmemme a, si ya, ‘Ana m eme mmemme a maka icheta ihe Onyenwe anyị meere m, mgbe m si nʼIjipt pụta.’
9 Wannan abin tunawa zai zama muku alama a hannunku, da kuma a goshinku cewa dokar Ubangiji tana a bakinku. Gama Ubangiji ya fitar da ku daga Masar da hannu mai iko.
Imezu mmemme a ga-adịrị unu dịka ihe ịrịbama nʼala unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.
10 Dole ku kiyaye wannan farilla kowace shekara a lokacinta.
Unu ga na-eme mmemme a nʼoge a kara aka nʼafọ ọbụla.
11 “Bayan Ubangiji ya kawo ku cikin ƙasar Kan’aniyawa, ya kuma ba da ita yadda ya alkawarta muku da rantsuwa, ku da kakanninku,
“Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, nyefee unu ala ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha,
12 sai ku miƙa kowane ɗan fari ga Ubangiji. Duk ɗan farin dabbobinku na Ubangiji ne.
unu ga-enyefe Onyenwe anyị ụmụ ndị ikom unu niile e bụ ụzọ mụọ. Ọzọ, ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ bụ nke Onyenwe anyị.
13 Amma a fanshi kowane ɗan farin jakinku da ɗan rago. In kuwa ba za ku fanshe shi ba, sai ku karye wuyansa. Sai ku fanshe kowane ɗan farin daga cikin’ya’yanku.
Jiri nwa atụrụ gbapụta nwa ịnyịnya ibu mbụ e bụ ụzọ mụọ. Ọ bụrụ na unu achọghị ịgbara nwa ịnyịnya ibu ahụ, unu aghaghị ịgbaji ya olu. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ.
14 “A kwanaki masu zuwa, in ɗanka ya tambaye ka, ‘Mene ne manufar wannan?’ Ka faɗa masa cewa, ‘Da hannu mai iko Ubangiji ya fito da mu daga Masar, daga ƙasar bauta.
“Nʼoge dị nʼihu, mgbe nwa gị nwoke ga-ajụ gị sị, ‘Gịnị ka ihe ndị a pụtara?’ Ị ga-azaghachi ya sị, ‘Onyenwe anyị jiri aka ike dị ukwu dupụta anyị site nʼIjipt, site nʼala nke ohu.
15 Sa’ad da Fir’auna ya taurare zuciyarsa, bai yarda ya sallame mu ba, sai Ubangiji ya kashe dukan’ya’yan farin ƙasar Masar, na mutum da na dabba, gaba ɗaya. Domin haka nake yin hadaya ga Ubangiji da’ya’yan fari, maza, da suka fara buɗe mahaifa, amma nakan fanshi dukan’ya’yan farina maza.’
Mgbe Fero mesiri obi ya ike, jụ ka anyị si nʼala ya pụọ, Onyenwe anyị gburu ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ ma anụ ụlọ. Nʼihi ya, ana m eji ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ achụ aja nye Onyenwe anyị. Ma ụmụ m ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ ka m na-agbapụta.’
16 Za tă kuma zama alama a hannunku da kuma shaida a goshinku cewa Ubangiji ya fito da mu daga Masar da hannunsa mai iko.”
Mmemme a ga-adị ka ihe ịrịbama nʼanya unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.”
17 Sa’ad da Fir’auna ya bar mutane su tafi, Allah bai bi da su a hanyar da ta bi ta iyakar Filistiyawa ba, ko da yake wannan hanya ce ta fi kusa. Gama Allah ya ce, “In suka fuskanci yaƙi, wataƙila su canja ra’ayinsu su koma Masar.”
Mgbe Fero mesịrị kwere ka ụmụ Izrel laa, Chineke edughị ha site nʼụzọ ahụ gafere ala ndị Filistia. Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ dị nso karịa. Chineke mere nke a nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na ndị a ezute agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha tụgharịa ịlaghachi azụ nʼIjipt.”
18 Saboda haka Allah ya kewaye da mutanen ta hamada zuwa Jan Teku. Isra’ilawa kuwa suka fita daga Masar da shirin yaƙi.
Ya mere, Chineke duuru ha ga nʼụzọ Osimiri Uhie, nke gara nʼụzọ nke ọzara. Ụmụ Izrel kwadokwara akwado ibu agha mgbe ha si nʼala Ijipt pụọ.
19 Musa ya ɗauki ƙasusuwan Yusuf tare da shi, gama Yusuf ya sa Isra’ilawa su rantse masa. Ya ce, “Tabbatacce Allah zai taimake ku, sai ku ɗibi ƙasusuwana tare da ku daga wannan wuri.”
Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.”
20 Bayan sun bar Sukkot sai suka kafa sansani a Etam a bakin hamada.
Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara.
21 Da rana Ubangiji yakan ja gabansu a cikin al’amudin girgije domin yă bishe su a kan hanyarsu, da dare kuma a cikin al’amudin wuta domin yă ba su haske, domin su iya tafiya dare da rana.
Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị.
22 Al’amudan nan biyu, na girgije da na wuta, ba su daina yi wa jama’a jagora ba.
Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha.

< Fitowa 13 >