< 2 Sarakuna 17 >

1 A shekara ta goma sha biyu ta mulkin Ahaz sarkin Yahuda, Hosheya ɗan Ela ya zama sarkin Isra’ila a Samariya, ya kuma yi mulki na shekara tara.
Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Ehaz, bụ eze Juda, ka Hoshea nwa Elaa ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze afọ itoolu.
2 Ya aikata mugunta a gaban Ubangiji, amma ba kamar na sarakunan Isra’ilan da suka riga shi ba.
O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị mgbe ọ bụ eze. Ma ọ bụghị dịka ndị eze Izrel ndị ọzọ bu ya ụzọ.
3 Shalmaneser sarkin Assuriya ya kawo wa Hosheya wanda dā abokin tarayyarsa ne, hari har Hosheya ya biya shi haraji.
Shalmanesa eze Asịrịa bịara buso Hoshea agha, nʼihi na Hoshea nọ nʼokpuru ọchịchị eze Asịrịa, bụrụkwa onye na-atụ ụtụ nye ya kwa afọ.
4 Amma sarkin Assuriya ya gane cewa Hosheya mai cin amana ne, gama ya aika da wakilai wurin So sarkin Masar, ya kuma daina aika wa sarkin Assuriya haraji yadda ya saba yi kowace shekara. Saboda haka Shalmaneser ya kama shi ya sa a kurkuku.
Ma eze Asịrịa chọpụtara na Hoshea abụghị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihi na Hoshea eze Izrel zipụrụ ndị ozi ya ka ha jekwuru So, eze Ijipt, maka enyemaka. Ọzọkwa, Hoshea kwụsịrị ịtụ ụtụ nye eze Asịrịa dịka ọ na-eme kwa afọ. Nʼihi ya Shalmanesa nwụchiri ya, tinye ya nʼụlọ mkpọrọ.
5 Sarkin Assuriya ya kai wa ƙasar Hosheya gaba ɗaya farmaki, ya kewaye Samariya na tsawon shekara uku.
Eze Asịrịa wakporo ala ahụ niile nʼagha, gbagoo imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu, afọ atọ.
6 A shekara ta tara ta sarautar Hosheya, sarkin Assuriya ya ci Samariya da yaƙi ya kuma kwashe Isra’ilawa zuwa Assuriya. Ya tsugunar da su a Hala, da a Gozan a bakin Kogin Habor da kuma a garuruwan Medes.
Nʼafọ itoolu nke ọchịchị Hoshea, eze Asịrịa dọtara Sameria nʼagha, dọkpụrụ ndị Izrel niile buga ha nʼala Asịrịa. O mere ka ha biri nʼobodo Hala, nʼime Gozan nke dị nʼosimiri Hoboa, na nʼime obodo ndị Midia.
7 Duk wannan ya faru ne saboda Isra’ilawa sun yi wa Ubangiji Allahnsu zunubi, shi wanda ya fitar da su daga Masar daga ƙarƙashin ikon Fir’auna sarkin Masar. Sun yi wa waɗansu alloli sujada
Ihe ndị a niile mere nʼihi na ndị Izrel mehiere megide Onyenwe anyị, bụ Chineke ha, onye ahụ mere ka ha site nʼokpuru ike Fero, eze Ijipt pụta. Ha kpọrọ isiala nye chi ndị ọzọ
8 suka kuma bi gurbin al’umman da Ubangiji ya kora a gabansu, da kuma ayyukan da sarakuna Isra’ila suka gabatar.
gbasoro omenaala niile nke ndị mba ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha. Ha gbasokwara omenaala ọjọọ ndị ahụ niile ndị eze ha webatara.
9 Isra’ilawa a ɓoye sun aikata abubuwan da ba daidai ba ga Ubangiji Allahnsu. Tun daga hasumiyoyi har zuwa birane masu katanga, sun gina wa kansu wuraren sujada na tudu a dukan garuruwansu.
Ndị Izrel mere ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị Chineke ha na-adịghị anabata na nzuzo. Ha wuru ebe ịchụ aja nye chi dị iche iche nʼobodo ha niile, e, nʼobodo ukwu ma nʼobodo nta ọbụla.
10 Suka kafa keɓaɓɓun duwatsu da kuma ginshiƙan Ashera a kowane tudu mai tsayi da kuma a ƙarƙashin kowane babban itace.
Ha manyeere onwe ha ogidi nkume, na ogidi chi Ashera nʼelu ugwu ọbụla, na nʼokpuru osisi ọbụla nwere ndo.
11 Suka ƙona turare a kan kowane tudu, kamar dai yadda al’umman da Ubangiji ya kora daga gabansu suka yi. Suka yi muguntan da ya sa Ubangiji ya yi fushi.
Ha chụrụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ọbụla dịka mba ndị naara ebi nʼala ahụ si eme, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha, mgbe Izrel bịara biri nʼebe ahụ. Ha mere ihe ọjọọ dị iche iche, nke mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu.
12 Suka bauta wa gumaka, ko da yake Ubangiji ya ce, “Ba za ku yi wannan ba.”
E, ha fere arụsị dị iche iche ofufe, lefuo anya na Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Unu emela ihe dị otu a.”
13 Ubangiji ya yi wa Isra’ila da Yahuda kashedi ta bakin dukan annabawansa da kuma masu duba, cewa, “Ku juyo daga mugayen ayyukanku. Ku yi biyayya da umarnai da farillaina, bisa ga dukan Dokar da na dokaci kakanninku su bi, waɗanda na kuma bayar ta wurin bayina, annabawa.”
Mgbe niile ka Onyenwe anyị na-eziga ndị amụma ya, na ndị ọhụ ụzọ, ịdọ Izrel na Juda aka na ntị, sị ha, “Sitenụ nʼajọ ihe unu na-eme chegharịa. Debenụ iwu na ụkpụrụ m, dịka iwu ahụ niile m nyere nna unu ha ka ha debe si dị, nke m sikwa nʼọnụ ndị ozi m bụ ndị amụma nye unu.”
14 Amma ba su saurare ni ba don sun kangare kamar kakanninsu, waɗanda ba su amince da Ubangiji Allahnsu ba.
Ma ndị Izrel jụrụ ige ntị. Kama ha kpachara anya kwesie olu ha ike dịka nna nna ha mere, bụ ndị na-ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke ha.
15 Suka yi watsi da farillansa da yarjejjeniyar da ya ƙulla da kakanninsu, da kuma kashedin da ya yi musu. Suka bi gumaka marasa amfani, wannan ya sa su ma kansu suka zama marasa amfani. Suka kwaikwayi sauran ƙasashen da suke kewaye da su, ko da yake Ubangiji ya umarce su cewa, “Kada ku yi rayuwa irin tasu,” suka kuwa yi abin da Ubangiji ya hana su.
Ha jụrụ ụkpụrụ ya niile na ọgbụgba ndụ ya, nke ya na ndị bụ nna nna ha gbara na iwu nke ọ dọrọ ha aka na ntị ka ha debe. Ha gbasooro chi arụsị bụ ihe efu, ha onwe ha ghọkwara ihe efu. Ha ṅomiri mba dị iche iche ndị ahụ bi ha gburugburu, nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị nyere ha iwu sị, “Unu emela dịka ha.”
16 Suka wofinta dukan umarnan Ubangiji Allahnsu, suka yi wa kansu gumakan zubi na siffar’yan maruƙa biyu, da kuma ginshiƙin Ashera. Suka rusuna wa rundunan taurari, suka kuma yi wa Ba’al sujada.
Ha jụrụ idebe iwu niile Onyenwe anyị Chineke ha nyere ha. Ha meere onwe ha ogidi arụsị Ashera, kpụọrọ onwe ha oyiyi ụmụ ehi abụọ. Ha kpọrọ isiala nye Baal, na anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando.
17 Suka miƙa’ya’yansu maza da mata hadaya ta wuta. Suka yi duba, suka yi sihiri suka kuma ba da kansu ga mugunta a gaban Ubangiji; suka sa ya yi fushi.
Ha jiri ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom chụọ aja nsure ọkụ nye chi ndị mba ọzọ. Ha gakwara nʼaja ịjụ ase, na ịgba aja, si otu a nyefee onwe ha nʼaka ime ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.
18 Saboda haka Ubangiji ya yi fushi ƙwarai da Isra’ila, ya kuma kawar da su daga gabansa. Kabilar Yahuda kaɗai aka bari,
Ya mere, Onyenwe anyị wesoro Izrel iwe nke ukwuu, wezuga ha site nʼihu ya. Ọ dịkwaghị onye o kwere ka ọ fọdụ, karịakwa naanị ebo Juda.
19 ko Yahuda ma ba su kiyaye umarnan Ubangiji Allahnsu ba. Sun bi gurbin da Isra’ila ta kawo.
Ma ndị Juda jụkwara idebe ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke ha nyere ha nʼiwu. Ha sooro omume ọjọọ ndị Izrel webatara.
20 Saboda haka Ubangiji ya wofinta mutanen Isra’ila; ya azabtar da su, ya kuma ba da su a hannun masu kwasar ganima, sai da ya shafe su ƙaƙaf daga gabansa.
Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ ndị Izrel niile. Ọ tara ha ahụhụ site nʼinyefe ha nʼaka ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike tutu ruo mgbe o mere ka e site nʼihu ya wezuga ha.
21 Sa’ad da ya ware Isra’ila daga gidan Dawuda, sai suka naɗa Yerobowam ɗan Nebat sarki a kansu. Yerobowam ya rinjayi Isra’ila daga ƙin Ubangiji, ya sa suka aikata babban zunubi.
Mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel dọwapụ onwe ha site nʼalaeze Devid, ha mere Jeroboam nwa Nebat, eze ha. Ma Jeroboam mere ka Izrel site nʼiso Onyenwe anyị wezuga onwe ha. O mere ka ha mee mmehie dị ukwuu.
22 Isra’ila suka nace cikin dukan zunuban Yerobowam, ba su kuwa rabu da su ba
Ọ dịkwaghị mgbe ụmụ Izrel sitere nʼime mmehie ahụ Jeroboam dubara ha pụta,
23 har Ubangiji ya kawar da su daga gabansa, kamar yadda ya gargaɗe su ta bakin bayinsa annabawa. Saboda haka aka kwashi mutanen Isra’ila daga ƙasarsu zuwa bauta a Assuriya, har wa yau kuwa suna can.
tutu ruo mgbe Onyenwe anyị kpochapụrụ Izrel niile site nʼihu ya, dịka o kwuru na ọ ga-eme, site nʼọnụ ndị amụma na-ejere ya ozi. Ọ bụ nke a mere ndị Izrel ji gaa biri nʼAsịrịa dịka ndị a dọtara nʼagha ruo taa.
24 Sarkin Assuriya ya kawo mutane daga Babilon, Kuta, Afa, Hamat da Sefarfayim ya zaunar da su a garuruwan Samariya don su maya gurbin Isra’ilawa. Suka mallaki Samariya suka kuma zauna a garuruwansu.
Eze Asịrịa sitere nʼala Babilọn, Kuta, Ava, Hamat na Sefavaim kpọta ndị mmadụ bịara biri nʼobodo Sameria ịnọchi anya ndị Izrel niile e sitere nʼebe ahụ bupụ. Nʼụzọ dị otu a, ha nwetara Sameria birikwa nʼobodo ya niile.
25 Sa’ad da suka fara zama a can, ba su bauta wa Ubangiji ba; saboda haka ya aika da zakoki a tsakaninsu suka karkashe waɗansu mutane.
Ma mgbe ndị Asịrịa malitere ibi nʼebe ahụ, ha atụghị egwu Onyenwe anyị, maọbụ fee ya ofufe. Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ọdụm ndị batara nʼetiti ha gbuo ụfọdụ mmadụ nʼime ha.
26 Sai aka faɗa wa sarkin Assuriya cewa, “Mutanen da ka kwashe ka zaunar a garuruwan Samariya fa ba su san abin da allahn ƙasar yake bukata ba. Saboda haka allahn ƙasar ya tura zakoki a cikinsu, waɗanda suke karkashe su, domin mutanen ba su san abin da yake bukata ba.”
Ya mere, e zigara eze Asịrịa ozi sị ya, “Ndị ahụ i dọtara nʼagha mee ka ha bịa biri nʼobodo Sameria amaghị ihe chi nwe ala ahụ chọrọ. O zitere ọdụm nʼetiti ha, nke na-egbu ha, nʼihi na ndị ahụ amaghị ihe ọ chọrọ.”
27 Sai sarkin Assuriya ya ba da umarni cewa, “A sami wani daga cikin firistocin da aka kwaso zuwa bauta daga Samariya, yă koma yă zauna a can, yă koya wa mutanen abin da allahn ƙasar yake bukata.”
Eze Asịrịa nyere iwu sị: “Ka otu onye nʼime ndị nchụaja e si na Sameria dọta nʼagha laghachi gaa biri nʼebe ahụ, izi ndị bi nʼobodo ahụ ihe chi ala ahụ chọrọ.”
28 Saboda haka ɗaya daga cikin firistocin da aka kawo bauta daga Samariya ya dawo ya zauna a Betel, ya koya musu yadda za su yi sujada ga Ubangiji.
Ya mere, otu nʼime ndị nchụaja ebuuru site na Sameria gaa ala ọzọ, bịara biri na Betel, kuziere ha otu ha ga-esi na-atụ egwu Onyenwe anyị.
29 Duk da haka, jama’ar kowace ƙasa, suka ƙera tasu alloli a garuruwa masu yawa inda suke zaune, suka sa su a masujadan da mutanen Samariya suka gina a kan tuddai.
Nʼagbanyeghị nke a, ndị mba ọbụla meere onwe ha chi nke aka ha nʼobodo ahụ niile ebe ha bi nʼime ya. Ha guzobere chi ndị a nʼụlọ arụsị nke ndị Sameria wuru nʼebe niile dị elu.
30 Mutane daga Babilon suka ƙera Sukkot Benot, mutane daga Kut suka ƙera Nergal, mutane daga Hamat suka ƙera Ashima;
Ndị si Babilọn mere chi ha a na-akpọ Sukọt Benot; ndị si Kut emee Neagal, ebe ndị si Hamat mekwara Ashima.
31 Awwiyawa suka ƙera Nibhaz da Tartak, Sefarfayawa kuwa suka ƙone’ya’yansu a wuta a matsayi hadayu ga Adrammelek da Anammelek allolin Sefarfayim.
Ndị si Ava mekwara Nibaz, na Tatak, ma ndị si Sefavaim na-esure ụmụ ha nʼọkụ dịka aja nye Adramelek na Anamelek, bụ chi ndị Sefavaim.
32 Sun yi wa Ubangiji sujada, amma kuma suka zaɓi mutanensu su yi musu hidima a matsayin firistoci a masujadan da suke kan tuddai.
Ha tụrụ egwuOnyenwe anyị, ma ha họpụtara ụdị mmadụ dị iche iche site nʼetiti onwe ha, ndị na-ejere ha ozi dịka ndị nchụaja nʼụlọ chi ha dị nʼebe niile dị elu.
33 Sun yi wa Ubangiji sujada, amma kuma sun bauta wa allolinsu bisa ga al’adun ƙasashen da suka fito.
Ha na-atụ egwu Onyenwe anyị ma ha gara nʼihu na-efe chi nke aka ha dịka omenaala mba ebe ndị e si dọta ha nʼagha si dị.
34 Har yă zuwa yau, sun nace da ayyukansu na dā. Ba sa yin wa Ubangiji sujada, ba sa kuma bin dokoki da farillansa, dokoki da umarnan da Ubangiji ya ba wa zuriyar Yaƙub, wadda ya ba wa suna Isra’ila.
Ruo taa, ha na-anọgidesi ike nʼife ofufe dịka ụzọ ochie ha si dị. Ha adịghị atụ egwu Onyenwe anyị, maọbụ mee dịka ụkpụrụ na iwu niile, maọbụ dịka ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu si dị, bụ nke Onyenwe anyị nyere ụmụ Jekọb, onye ọ kpọrọ Izrel.
35 Da Ubangiji ya ƙulla alkawari da Isra’ilawa, ya dokace su cewa, “Kada ku yi wa waɗansu alloli sujada ko ku durƙusa a gabansu ku bauta musu, ko ku miƙa musu hadaya.
Mgbe Onyenwe anyị na ndị Izrel gbara ndụ, o nyere ha iwu sị, “Unu atụkwala chi ọzọ ọbụla egwu, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Unu efela ha ofufe maọbụ chụọ aja nye ha.
36 Amma Ubangiji wanda ya fito da ku daga Masar da iko mai girma da hannu mai ƙarfi, shi ne za ku yi masa sujada. Gare shi za ku durƙusa ku kuma miƙa masa hadayu.
Ma Onyenwe anyị, onye ji ike dị ukwuu, na aka dị ike e setịpụrụ esetipụ kpọpụta unu site nʼala Ijipt, bụ naanị onye unu ga-atụ egwu. Ya ka unu ga-akpọ isiala nye, ya ka unu ga-achụrụ aja.
37 Dole kullum ku mai da hankali ga kiyaye ƙa’idodi da farillan, dokoki da umarnan da ya rubuta muku. Kada ku yi wa waɗansu alloli sujada.
Unu ga-elezi anya hụ na unu debere ụkpụrụ na iwu niile, ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu ndị a e depụtara nʼakwụkwọ nye unu. Unu atụkwala egwu chi ndị ọzọ.
38 Kada ku manta da alkawarin da na ƙulla da ku, kada ku yi sujada ga waɗansu alloli.
Unu echefula ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. Unu akpọkwala isiala nye chi ndị ọzọ nʼihi egwu.
39 Maimakon haka, ku yi wa Ubangiji Allahnku sujada; shi ne zai cece ku daga hannun abokan gābanku.”
Kama, tụọnụ egwu ma fee Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ ya ga-anapụta unu site nʼaka ndị iro unu niile.”
40 Amma ba su saurara ba, suka nace da ayyukansu na dā.
Ma ndị Izrel egeghị ntị, kama, dịka ụzọ ọjọọ ha si dị, ha fere chi ọzọ ofufe.
41 Ko ma yayinda mutanen nan suke yi wa Ubangiji sujada, ba su daina bauta wa gumakansu ba. Har yă zuwa yau,’ya’yansu da jikokinsu sun ci gaba da bin gurbin kakanninsu.
Ọ bụ ezie na ndị a na-efe Onyenwe anyị ofufe, ma ha nọgidekwara na-ejere arụsị niile ha ozi. Ruo taa, ụmụ ha, na ụmụ ụmụ ha, gara nʼihu na-emekwa ihe nna nna ha mere.

< 2 Sarakuna 17 >