< Numbers 22 >

1 And the children of Israel moved forward, and pitched in the plains of Moab on this side of Jordan [by] Jericho.
Ndị Izrel biliri njem bịarute nʼobosara ala Moab. Manye ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Jọdan ebe chere ihu nʼobodo Jeriko.
2 And Balak the son of Zippor saw all that Israel had done to the Amorites.
Ma Balak nwa Zipoa ahụlarị ihe niile Izrel mere ndị Amọrait.
3 And Moab was greatly afraid of the people, because they [were] many: and Moab was distressed because of the children of Israel.
Oke ụjọ jidere ndị Moab nʼihi na ndị Izrel dị ọtụtụ. Nʼezie, oke ụjọ dị ukwuu jidere ndị Moab nʼihi ụmụ Izrel.
4 And Moab said to the elders of Midian, Now shall this company lick up all [that are] around us, as the ox licketh up the grass of the field. And Balak the son of Zippor [was] king of the Moabites at that time.
Ndị Moab jekwuru ndị okenye Midia sị ha, “Igwe mmadụ ndị a ga-erichapụ ihe niile gbara anyị gburugburu. Ha ga-eripịa ha dịka ehi si erichapụ ahịhịa ndụ dị nʼala.” Ya mere, Balak nwa Zipoa, onye bụ eze ndị Moab nʼoge ahụ,
5 He sent messengers therefore to Balaam the son of Beor to Pethor, which [is] by the river of the land of the children of his people, to call him, saying, Behold, there has a people come out from Egypt: behold, they cover the face of the earth, and they abide over against me:
zigara ndị ozi ya ka ha jekwuru Belam, nwa Beoa onye bi nʼobodo ya bụ Petoa, nke dị nso nʼiyi ukwu Yufretis. O ziri ya sị, “Lee otu ndị sitere nʼIjipt pụta. Lee ka ha si kpuchie elu ala a; ugbu a, ha bi nʼakụkụ m.
6 Come now therefore, I pray thee, Curse for me this people; for they [are] too mighty for me: it may be I shall prevail, [that] we may smite them, and [that] I may drive them out of the land: for I know that he whom thou blessest [is] blessed, and he whom thou cursest is cursed.
Ugbu a, bịa ka ị bụọrọ m ha ọnụ, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ma eleghị anya aga m enwe ike merie ha, ma chụpụkwa ha site nʼala m. Nʼihi na amaara m na ndị ọbụla ị gọziri bụ ndị a gọziri agọzi, ndị ọbụla ị bụrụ ọnụ ga-anọgide bụrụ ndị a bụrụ ọnụ.”
7 And the elders of Moab and the elders of Midian departed with the rewards of divination in their hand; and they came to Balaam, and spoke to him the words of Balak.
Ndị ozi o zigara bụ ndị okenye obodo Moab na Midia. Ha ji ego ịjụta ase nʼaka ha. Mgbe ha ruru, ha ziri Belam ozi Balak ziri.
8 And he said to them, Lodge here this night, and I will bring you word again, as the LORD shall speak to me: and the princes of Moab abode with Balaam.
Belam gwara ha okwu sị, “Nọdụnụ nʼebe a nʼabalị a. Aga m ewetara unu ọsịsa ọbụla Onyenwe anyị nyere m.” Ya mere, ndị ozi ahụ si Moab nọnyeere ya.
9 And God came to Balaam, and said, What men [are] these with thee?
Nʼabalị ahụ, Chineke bịakwutere Belam jụọ ya sị, “Ndị ikom ndị a bịara ileta gị, ha bụ ndị ole?”
10 And Balaam said to God, Balak the son of Zippor, king of Moab, hath sent to me, [saying],
Belam sịrị Chineke, “Balak nwa Zipoa eze Moab zitere m ozi sị m,
11 Behold, [there has] a people come out of Egypt, which covereth the face of the earth: come now, curse them for me: it may be I shall be able to overcome them, and drive them out.
‘Otu ndị esitela nʼala Ijipt pụta, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Achọrọ m ka ị bịa bụọrọ m ha ọnụ. Ma eleghị anya aga m enwe ike lụso ha agha, ma chụpụkwa ha.’”
12 And God said to Balaam, Thou shalt not go with them; thou shalt not curse the people: for they [are] blessed.
Ma Chineke sịrị Belam, “Esola ha aga! Ị gaghị abụ ndị a ọnụ, nʼihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.”
13 And Balaam rose in the morning, and said to the princes of Balak, Depart into your land: for the LORD refuseth to give me leave to go with you.
Mgbe chi bọrọ, Belam biliri gwa ndị ozi Balak sị ha, “Laghachinụ nʼobodo unu nʼihi na Onyenwe anyị ekweghị ka m soro unu.”
14 And the princes of Moab rose up, and they went to Balak, and said, Balaam refuseth to come with us.
Ya mere, ndị ozi Moab laghachikwuru Balak gwa ya sị, “Belam jụrụ iso anyị lọghachi.”
15 And Balak sent yet again princes, more, and more honorable than they.
Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ.
16 And they came to Balaam, and said to him, Thus saith Balak the son of Zippor, Let nothing, I pray thee, hinder thee from coming to me:
Ha jiri ozi a bịakwute Belam sị ya, “Ihe a ka Balak nwa Zipoa sị anyị zie gị, Ọ sị gị ekwela ka ihe ọbụla gbochie gị ịbịakwute m.
17 For I will promote thee to very great honor, and I will do whatever thou sayest to me: come therefore, I pray thee, curse this people for me.
Nʼihi na aghaghị ịsọpụrụ gị nʼebe ọ dị ukwuu m, mekwaa ihe ọbụla ị sị m mee. Naanị bịa ka ị bụọrọ m ndị a ọnụ.”
18 And Balaam answered and said to the servants of Balak, If Balak would give me his house full of silver and gold, I could not go beyond the word of the LORD my God, to do less or more.
Ma Belam zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na Balak enye m ụlọeze ya nke juputara nʼọlaọcha na ọlaedo, apụghị m ime ihe ọbụla dị ukwuu maọbụ nke nta ịgabiga iwu Onyenwe anyị bụ Chineke m.
19 Now therefore, I pray you, tarry ye also here this night, that I may know what the LORD will say to me more.
Ma otu ọ dị, nọọnụ ka chị bọọ dịka ndị ọzọ ahụ mere ka m nwee ike chọpụta ma ọ dị ihe Onyenwe anyị ga-atụkwasị nʼihe o kwuru na mbụ.”
20 And God came to Balaam at night, and said to him, If the men come to call thee, rise [and] go with them; but yet the word which I shall say to thee, that shalt thou perform.
Nʼabalị ahụ, Chineke gwara Belam okwu sị ya, “Ebe ọ bụ na ndị a bịara ịkpọ gị oku, bilie soro ha gaa, kama jikere ikwu naanị okwu m ga-etinye gị nʼọnụ.”
21 And Balaam rose in the morning, and saddled his ass, and went with the princes of Moab.
Ya mere, mgbe chi echi ya bọrọ, Belam rigooro nʼelu ịnyịnya ibu ya soro ụmụ eze Moab gaa.
22 And God's anger was kindled because he went: and the angel of the LORD stood in the way for an adversary against him. Now he was riding upon his ass, and his two servants [were] with him.
Ma iwe were Chineke nʼihi na ọ na-aga, ma mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri ụzọ igbochi ya. Belam na ndị odibo ya abụọ nọ na-elu ịnyịnya ibu ya.
23 And the ass saw the angel of the LORD standing in the way, and his sword drawn in his hand: and the ass turned aside out of the way, and went into the field: and Balaam smote the ass, to turn her into the way.
Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzochiri nʼụzọ, jide mma a mịpụtara amịpụta nʼaka ya, ịnyịnya ibu ahụ chigharịrị onwe ya hapụ okporoụzọ, tinye isi nʼọhịa. Ma Belam tiri ya ihe ịchụghachi ya nʼụzọ.
24 But the angel of the LORD stood in a path of the vineyards, a wall [being] on this side, and a wall on that side.
Nʼoge a, mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri nʼụzọ dị warawara, nke dị nʼetiti mgbidi ogige ubi vaịnị abụọ.
25 And when the ass saw the angel of the LORD, she thrust herself against the wall, and crushed Balaam's foot against the wall: and he smote her again.
Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị, o tinyere isi nʼahụ mgbidi ogige ubi ahụ, chọọ isite nʼebe ahụ gafee. Mgbe ọ na-eme nke a, o mere ka mgbidi ahụ chihịapụ Belam ụkwụ. Ya mere Belam tiri ịnyịnya ibu ahụ ihe ọzọ.
26 And the angel of the LORD went further, and stood in a narrow place, where [was] no way to turn either to the right hand or to the left.
Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gakwara nʼihu nʼokporoụzọ ahụ nọchie ụzọ ahụ ebe dị nnọọ mkpakọta, ebe ịnyịnya ibu ahụ na-agaghị enwe ike gafee, maọbụ ichigharị aka nri maọbụ aka ekpe.
27 And when the ass saw the angel of the LORD, she fell down under Balaam: and Balaam's anger was kindled, and he smote the ass with a staff.
Nʼihi nke a, mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị o dinara ala nʼokporoụzọ. Nʼoke iwe, Belam ji mkpara dị ya nʼaka tie ya ihe ọzọ.
28 And the LORD opened the mouth of the ass, and she said to Balaam, What have I done to thee, that thou hast smitten me these three times?
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka ịnyịnya ibu ahụ kwuo okwu. Ọ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị ka m mere gị i ji tie m ihe ugboro atọ?”
29 And Balaam said to the ass, Because thou hast mocked me: I would there were a sword in my hand, for now would I kill thee.
Belam zara ịnyịnya ibu ahụ sị, “Ọ bụ nʼihi na i meela ka m dị ka onye nzuzu! Nʼezie, a sị na m ji mma agha nʼaka m, agaara m egbu gị.”
30 And the ass said to Balaam, [Am] not I thy ass, upon which thou hast rid ever since [I was] thine to this day? was I ever wont to do so to thee? And he said, Nay.
Ịnyịnya ibu ahụ gwara Balam okwu ọzọ sị ya, “Ọ bụ na mụ onwe m abụghị ịnyịnya ibu gị nke ị na-anọ nʼelu ya ogologo oge ndị a niile? Ọ dịla mgbe m si otu a meso gị omume nʼime ndụ m niile?” Belam zara sị ya, “Ee.”
31 Then the LORD opened the eyes of Balaam, and he saw the angel of the LORD standing in the way, and his sword drawn in his hand: and he bowed down his head, and fell flat on his face.
Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị meghere anya Belam. Ọ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o ji mma agha ya guzochie ụzọ. Belam dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼala nʼihu ya.
32 And the angel of the LORD said to him, Why hast thou smitten thy ass these three times? behold, I went out to withstand thee, because [thy] way is perverse before me:
Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị mere i ji tie ịnyịnya ibu gị ihe ugboro atọ? Abịara m igbochi gị ka ịla nʼiyi dị na-eche gị ghara irute gị.
33 And the ass saw me, and turned from me these three times: unless she had turned from me, surely now also I had slain thee, and saved her alive.
Ugboro atọ ka ịnyịnya ibu a hụrụ m, ma site nʼihu m wezuga onwe ya. A sị na ọ bụghị ntụgharị ọ tụgharịrị site nʼebe m nọ, nʼezie, ugbu a, a gara m egbu gị ma hapụ ịnyịnya ibu gị ndụ.”
34 And Balaam said to the angel of the LORD, I have sinned; for I knew not that thou stoodest in the way against me: now therefore, if it displeaseth thee, I will return again.
Nʼoge a, Belam sịrị mmụọ ozi Onyenwe anyị, “Emehiela m. Amaghị m na i guzo nʼụzọ igbochi m. Ọ bụrụ iwe na-ewe gị, ejikeere m ịlaghachi azụ.”
35 And the angel of the LORD said to Balaam, Go with the men: but only the word that I shall speak to thee, that thou shalt speak: So Balaam went with the princes of Balak.
Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị Belam, “Soro ndị ikom a gaa, ma kwuo naanị ihe m sị gị kwuo.” Ya mere, Belam soro ndị ozi eze Balak gaa.
36 And when Balak heard that Balaam had come, he went out to meet him to a city of Moab, which [is] in the border of Arnon, which [is] in the utmost limit.
Mgbe Balak nụrụ na Belam nọ nʼụzọ na-abịa, ọ pụrụ gaa izute Belam nʼotu obodo Moab nke dị nʼọnụ mmiri Anọn, nke dị na ngwụcha oke ala ya.
37 And Balak said to Balaam, Did I not earnestly send to thee to call thee? why camest thou not to me? am I not able indeed to promote thee to honor?
Mgbe ọ bịarutere, Balak jụrụ Belam ajụjụ sị ya, “Eziri m gị ozi ka ị bịa ngwangwa, gịnị mere ị bịaghị? Ọ bụ na m enweghị ike ịsọpụrụ gị?”
38 And Balaam said to Balak, Lo, I have come to thee: have I now any power at all to say any thing? the word that God putteth in my mouth, that shall I speak.
Belam zaghachiri, “Lee, Abịakwutelam gị ugbu a, ma enweghị m ike ikwu ihe ọbụla dị m mma. Ọ bụ naanị ihe Chineke tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu.”
39 And Balaam went with Balak, and they came to Kirjath-huzoth.
Belam sooro Balak gaa Kiriat Huzot.
40 And Balak offered oxen and sheep, and sent to Balaam, and to the princes that [were] with him.
Balak jiri ehi na atụrụ chụọ aja. O nyere Belam ụfọdụ, nyekwa ma ndị ozi eze ndị ya na ha nọ nʼebe ahụ.
41 And it came to pass on the morrow, that Balak took Balaam, and conducted him to the high places of Baal, that thence he might see the utmost [part] of the people.
Nʼụtụtụ echi ya, Balak kpọọrọ Belam, duru ya rigoo Bamot Baal. O sitere nʼebe ahụ hụ nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.

< Numbers 22 >