< Genesis 45 >

1 And Joseph could not control himself before all them that stood by him, and he cried, Put every man out from me! And no man stood with him when Joseph made himself known to his brethren.
Nʼoge a, Josef enwekwaghị ike ijite onwe ya aka nʼihu ndị na-ejere ya ozi. O welitara olu sị, “Zipụnụ onye ọbụla site nʼebe m nọ.” Ya mere, o nweghị onye ya na Josef nọ mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya onye ọ bụ.
2 And he raised his voice in weeping; and the Egyptians heard, and the house of Pharaoh heard.
O tiri mkpu akwa nke ndị Ijipt nụrụ, na nke ndị ụlọ Fero nụkwara.
3 And Joseph said to his brethren, I am Joseph. Does my father yet live? And his brethren could not answer him, for they were troubled at his presence.
Josef gwara ụmụnne ya sị, “Mụ onwe m bụ Josef. Nna m ọ ka nọ ndụ ugbu a?” Ma ụmụnne ya enweghị ọnụ ha ji asa ya, nʼihi na oke egwu jidere ha nʼihu ya.
4 And Joseph said to his brethren, Come near to me, I pray you. And they came near. And he said, I am Joseph your brother, whom ye sold into Egypt.
Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt.
5 And now, be not grieved, and be not angry with yourselves, that ye sold me hither, for God sent me before you to preserve life.
Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a.
6 For the famine has been these two years in the land; and yet there are five years in which there will be neither ploughing nor harvest.
Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi.
7 So God sent me before you to preserve you a remnant in the earth, and to save you alive by a great deliverance.
Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu.
8 And now it was not you [that] sent me here, but God; and he has made me a father to Pharaoh, and lord of all his house, and governor over all the land of Egypt.
“Ya mere, ọ bụghị unu zitere m nʼebe a, kama ọ bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile.
9 Haste and go up to my father, and say to him, Thus says thy son Joseph: God has made me lord of all Egypt; come down to me, tarry not.
Ugbu a, meenụ ngwa lakwuru nna m, sị ya, ‘Ihe ndị a ka Josef nwa gị nwoke kwuru, Chineke emeela m onye na-achị Ijipt niile. Egbula oge ịbịakwute m.
10 And thou shalt dwell in the land of Goshen, and thou shalt be near to me, thou, and thy sons, and thy sons' sons, and thy sheep, and thy cattle, and all that thou hast.
Ị ga-ebi nʼala Goshen, ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere.
11 And there will I maintain thee; for yet there are five years of famine; in order that thou be not impoverished, thou, and thy household, and all that thou hast.
Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’
12 And behold, your eyes see, and the eyes of my brother Benjamin, that it is my mouth which speaks to you.
“Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a.
13 And tell my father of all my glory in Egypt, and of all that ye have seen, and haste and bring down my father hither.
Unu ga-akọrọ nna m maka nsọpụrụ niile a na-enye m nʼala Ijipt na ihe niile unu hụrụ. Kpọtakwanụ nna m ọsịịsọ ebe a.”
14 And he fell on his brother Benjamin's neck, and wept; and Benjamin wept on his neck.
Ugbu a, ọ dakwasịrị nʼolu Benjamin, nwanne ya, kwaa akwa. Benjamin jidekwara ya nʼolu kwaa akwa.
15 And he kissed all his brethren, and wept upon them; and after that his brethren talked with him.
Emesịa, o suturu ụmụnne ya niile ọnụ, bekwasịkwa ha akwa. Nʼikpeazụ, ụmụnne ya kpanyeere ya ụka.
16 And the report was heard in Pharaoh's house, saying, Joseph's brethren are come. And it was good in the eyes of Pharaoh, and in the eyes of his bondmen.
Mgbe akụkọ a ruru ụlọ Fero na ụmụnne Josef bịara, ọ tọrọ Fero na ndịisi ozi niile ya ụtọ.
17 And Pharaoh said to Joseph, Say to thy brethren, Do this: load your beasts and depart, go into the land of Canaan,
Fero gwara Josef sị ya, “Gwa ụmụnne gị, ka ha mee ihe otu a, ha bokwasị ịnyịnya ibu unu ibu laghachikwa nʼala Kenan.
18 and take your father and your households, and come to me; and I will give you the good of the land of Egypt, and ye shall eat the fat of the land.
Ha ruo, ha kpọta nna gị, na ezinaụlọ ha, ka ha lọghachikwute m nʼala Ijipt. Nʼihi na aga m enye ha ala kachasị mma nʼIjipt. Ha onwe ha ga-erikwa uru ala ahụ.
19 And thou art commanded — this do: take waggons out of the land of Egypt for your little ones and for your wives, and take up your father, and come.
“Gwakwa ụmụnne gị okwu sị ha, ‘Sitenụ nʼala Ijipt were ụgbọala, nke unu ga-eji budata ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu. Dutekwanụ nna unu.
20 And let not your eye regret your stuff; for the good of all the land of Egypt shall be yours.
Unu esogbula onwe unu banyere ngwa ụlọ unu, nʼihi na ihe niile dị mma nʼala Ijipt bụ nke unu.’”
21 And the sons of Israel did so; and Joseph gave them waggons, according to the commandment of Pharaoh, and gave them provision for the way.
Ya mere ụmụ Izrel mere ihe ndị a. Josef nyere ha ụgbọala dịka Fero nyere nʼiwu. O nyekwara ha nri ha ga-eri nʼụzọ.
22 To each one of them all he gave changes of clothing; but to Benjamin he gave three hundred [pieces] of silver and five changes of clothing.
O nyere onye ọ bụla nʼime ha uwe mgbanwe ọhụrụ, ma o nyere Benjamin narị shekel ọlaọcha atọ, na uwe mgbanwe ise.
23 And to his father he sent this: ten asses laden with the good things of Egypt, and ten she-asses laden with corn and bread, and food for his father by the way.
O zipụụrụ nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ihe mara mma niile si nʼala Ijipt, na nne ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ọka na achịcha, na ihe ndị ọzọ dị iche iche, nʼihi ije ya.
24 And he sent his brethren away, and they departed. And he said to them, Do not quarrel on the way.
O zipụrụ ụmụnne ya. Ma oge ha na-achọ ịhapụ ya, ọ gwara ha sị, “Unu esekwala okwu nʼụzọ.”
25 And they went up out of Egypt, and came into the land of Canaan to Jacob their father.
Mgbe ahụ, ha hapụrụ ala Ijipt mechaa rute ala Kenan, bịakwute Jekọb nna ha.
26 And they told him, saying, Joseph is still alive, and he is governor over all the land of Egypt. And his heart fainted, for he did not believe them.
Ha gwara ya sị, “Josef ka nọ ndụ. Nʼezie, ọ bụ ya na-achị ala Ijipt niile.” Ma o siiri Jekọb ike ịnabata akụkọ a. O kwenyeghị na ọ bụ eziokwu.
27 And they spoke to him all the words of Joseph, which he had spoken to them. And he saw the waggons that Joseph had sent to carry him. And the spirit of Jacob their father revived.
Ma mgbe ha gwasịrị ya ihe niile Josef gwara ha, mgbe ọ hụkwara ụgbọala niile Josef zitere ka e jiri bute ya, mmụọ nna ha Jekọb lọghachiri.
28 And Israel said, It is enough: Joseph my son is yet alive; I will go and see him before I die.
Mgbe ahụ Izrel kwuru sị, “Ekwetala m! Josef nwa m ka dị ndụ. Aga m aga hụ ya anya tupu m nwụọ.”

< Genesis 45 >