< Exodus 25 >

1 And Jehovah spoke to Moses, saying,
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 Speak unto the children of Israel, that they bring me a heave-offering: of every one whose heart prompteth him, ye shall take my heave-offering.
“Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara m onyinye. Ị ga-anabatara m onyinye ahụ site nʼaka nwoke ọbụla onye o metụrụ nʼobi inye onyinye a.
3 And this is the heave-offering that ye shall take of them: gold, and silver, and copper,
“Ndị a bụ Onyinye ị ga-anata nʼaka ha: “ọlaọcha, ọlaedo na bronz.
4 and blue, and purple, and scarlet, and byssus, and goats' [hair],
Ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie, nke ezi akwa ọcha, na nke ajị ewu;
5 and rams' skins dyed red, and badgers' skins; and acacia-wood;
akpụkpọ anụ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;
6 oil for the light; spices for the anointing oil, and for the incense of fragrant drugs;
mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;
7 onyx stones, and stones to be set in the ephod, and in the breastplate.
nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.
8 And they shall make me a sanctuary, that I may dwell among them.
“Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha.
9 According to all that I shall shew thee, the pattern of the tabernacle, and the pattern of all the utensils thereof, even so shall ye make [it].
Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị.
10 And they shall make an ark of acacia-wood; two cubits and a half the length thereof, and a cubit and a half the breadth thereof, and a cubit and a half the height thereof.
“Ha ga-eji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya ga-abụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya bụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ.
11 And thou shalt overlay it with pure gold: inside and outside shalt thou overlay it; and shalt make upon it a border of gold round about.
Machie ọlaedo a nụchara anụcha nʼime na azụ ya niile, jiri ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.
12 And cast four rings of gold for it, and put [them] at the four corners thereof, that two rings may be upon the one side thereof and two rings upon the other side thereof.
Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnye ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya
13 And make staves of acacia-wood and overlay them with gold.
Jirikwa osisi akashia mee mkpara ogologo. Emesịa, were ọlaedo machie mkpara ndị a.
14 And put the staves into the rings upon the sides of the ark, that the ark may be borne with them.
Ị ga-etinye mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ, ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
15 The staves shall be in the rings of the ark: they shall not come out from it.
Nʼihi nke a, mkpara ọlaedo ndị ahụ ga-adịgide nʼime mgbaaka ọlaedo igbe a oge niile.
16 And thou shalt put into the ark the testimony that I shall give thee.
Ya mere, mgbe a rụsịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ, tinye Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime ya.
17 And thou shalt make a mercy-seat of pure gold: two cubits and a half the length thereof, and a cubit and a half the breadth thereof.
“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ogologo ya ga-adị nzọ ụkwụ anọ. Obosara ya ga-abụ nzọ ụkwụ abụọ na ọkara.
18 And thou shalt make two cherubim of gold; [of] beaten work shalt thou make them, at the two ends of the mercy-seat.
Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.
19 And make one cherub at the end of the one side, and one cherub at the end of the other side; out of the mercy-seat shall ye make the cherubim at the two ends thereof.
Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka cherubim ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ.
20 And the cherubim shall stretch out [their] wings over it, covering over with their wings the mercy-seat, and their faces opposite to one another: toward the mercy-seat shall the faces of the cherubim be [turned].
Cherubim ndị a ga-agbasa nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ ga-eche onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị.
21 And thou shalt put the mercy-seat above on the ark, and shalt put in the ark the testimony that I shall give thee.
Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ.
22 And there will I meet with thee, and will speak with thee from above the mercy-seat, from between the two cherubim which are upon the ark of the testimony, everything that I will give thee in commandment unto the children of Israel.
Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị Izrel.
23 And thou shalt make a table of acacia-wood, two cubits the length thereof, and a cubit the breadth thereof, and a cubit and a half the height thereof.
“Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa.
24 And thou shalt overlay it with pure gold, and make upon it a border of gold round about.
Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu.
25 And thou shalt make for it a margin of a handbreadth round about, and shalt make a border of gold for the margin thereof round about.
Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu.
26 And thou shalt make for it four rings of gold, and put the rings at the four corners that are on the four feet thereof.
Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya.
27 Close to the margin shall the rings be, as receptacles of the staves to carry the table.
Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ.
28 And thou shalt make the staves of acacia-wood, and overlay them with gold; and the table shall be carried upon them.
Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha.
29 And thou shalt make the dishes thereof, and cups thereof, and goblets thereof, and bowls thereof, with which to pour out: of pure gold shalt thou make them.
Ọzọkwa, jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ efere dị iche iche, na iko dị iche iche, na ọkwa dị iche iche, nke e ji awụpụ onyinye.
30 And thou shalt set upon the table shewbread before me continually.
Dọkwasị achịcha nke iche nʼIhu nʼelu tebul ahụ, nʼihu m, oge niile.
31 And thou shalt make a lamp-stand of pure gold; [of] beaten work shall the lamp-stand be made: its base and its shaft, its cups, its knobs, and its flowers shall be of the same.
“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.
32 And six branches shall come out of the sides thereof — three branches of the lamp-stand out of one side thereof, and three branches of the lamp-stand out of the other side thereof;
Alaka isii ga-esite nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.
33 three cups shaped like almonds in the one branch, a knob and a flower: and three cups shaped like almonds in the other branch, a knob and a flower: so in the six branches that come out of the lamp-stand.
Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile ga-adị nʼotu alaka, iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ.
34 And in the lamp-stand four cups shaped like almonds, its knobs and its flowers;
Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, ọ ga-adị iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya.
35 and a knob under two branches of it, and [again] a knob under two branches of it, and [again] a knob under two branches of it, for the six branches that proceed out of the lamp-stand.
Otu isi ga-adịkwa nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta. Isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ. Isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii.
36 Their knobs and their branches shall be of itself — all of one beaten work of pure gold.
Isi nwapụta ya na alaka ya niile ga-adịkọtakwa ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ.
37 And thou shalt make the seven lamps thereof, and they shall light the lamps thereof, that they may shine out before it;
“Ị ga-eme oriọna asaa, dọba ha nʼelu ihe ịdọkwasị iheọkụ ahụ, ka ha na-enye ìhè naanị nʼebe ihu ya.
38 and the snuffers thereof, and the snuff-trays thereof, of pure gold.
Mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile, ga-abụ ọlaedo a nụchara anụcha.
39 Of a talent of pure gold shall they make it, with all these utensils.
Ọlaedo a nụchara anụcha nke dị iri kilogram atọ na anọ ka a ga-eji kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ndị a niile.
40 And see that thou make [them] according to their pattern, which hath been shewn to thee in the mountain.
Lezie anya hụ na i mere ihe ndị a niile nʼusoro ihe atụ nke e gosiri gị nʼelu ugwu.

< Exodus 25 >