< Psalmi 20 >

1 Zborovođi. Psalam. Davidov. Uslišio te Jahve u dan nevolje, štitilo te ime Boga Jakovljeva!
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị; ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.
2 Poslao ti pomoć iz Svetišta, branio te sa Siona!
Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka, ma site na Zayọn kwagide gị.
3 Spomenuo se svih ti prinosnica, bila mu mila paljenica tvoja!
Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. (Sela)
4 Udijelio ti što ti srce želi, ispunio sve namisli tvoje!
Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.
5 Radovali se tvojoj pobjedi, u ime Boga svoga dizali stjegove! Ispunio Jahve svaku molbu tvoju!
Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile.
6 Znam evo: Jahve će pobjedu dati svom pomazaniku, uslišit ga iz svetih nebesa snagom pobjedne desnice svoje.
Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ; ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya, zọpụta ma zakwaa ya.
7 Jedni se hvale kolima bojnim, drugi konjima, mi imenom Jahve, Boga našega!
Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha; ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi.
8 Oni posrću i padaju, mi se držimo i stojimo.
Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa, ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm.
9 Jahve, daruj pobjedu kralju, usliši nas u dan kad te zazovemo!
O Onyenwe anyị, zọpụta eze! Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!

< Psalmi 20 >