< Psalmi 126 >

1 Hodočasnička pjesma. Kad Jahve vraćaše sužnjeve sionske, bilo nam je k'o da snivamo.
Abụ nrigo. Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn, anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.
2 Usta nam bjehu puna smijeha, a jezik klicanja. Među poganima tad se govorilo: “Velika im djela Jahve učini!”
Ọchị juru anyị ọnụ, abụ ọṅụ jukwara anyị ire. Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị, “Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.”
3 Velika nam djela učini Jahve: opet smo radosni!
Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ.
4 Vrati, o Jahve, sužnjeve naše k'o potoke negepske!
Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị, dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev.
5 Oni koji siju u suzama, žanju u pjesmi.
Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.
6 Išli su plačući noseći sjeme sjetveno: vraćat će se s pjesmom, noseći snoplje svoje.
Onye ji ịkwa akwa buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga, ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ, mgbe ha bu ukwu ọka ha.

< Psalmi 126 >