< 列王紀上 2 >

1 [達味王的遺囑]達味死的日子已經近了,便囑咐自己的兒子撒羅滿說:「
Mgbe ụbọchị ọnwụ eze Devid na-abịaru nso, o nyere nwa ya Solomọn iwu sị ya,
2 我現在要走世人應走的路,你要作英勇有為的大丈夫,
“Oge ọnwụ m eruola,” ka ọ sịrị, “Ya mere, dị ike, meekwa dịka nwoke.
3 恪守上主你天主的典章,履行他的道路,遵守他的規律、誡命、法令和制度,如梅瑟法律上所記載的:這樣無論你做什麼,無論你往何處去,必然順利;
Debe iwu niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ị ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile ị na-eme, nʼebe ọbụla ị na-eche ihu gị.
4 上主也必履行他關於我所說的話,說:如果你的子孫固守他們的道路,真能全心全意在我面前行走,那麼,你的後代就決不缺坐上以色列寶座的人。
Ka Onyenwe anyị mezuo nkwa o kwere banyere m, sị ‘Ọ bụrụ na ụmụ gị na ụmụ ụmụ ha elezie anya nʼotu ha si ebi ndụ, ọ bụrụ na ha ejegharịa nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi nʼihu m, jiri obi ha niile na mkpụrụobi ha mee nke a, ị gaghị achọ onye ga-anọkwasị nʼoche eze Izrel achọ.’
5 此外,你也知道責魯雅的兒子約阿布對我所做的事,對以色列軍隊的兩個統帥,乃爾的兒子阿貝乃爾和耶特爾的兒子阿瑪撒所做的事;他在昇平時,殺了他們,像在戰爭時殺人,使我腰間的帶子和腳上的鞋染了無辜的血。
“Ugbu a, gị onwe gị maara ihe Joab nwa Zeruaya mere m, ya bụ ihe o mere mmadụ abụọ bụ ndịisi agha Izrel, Abna nwa Nea, na Amasa nwa Jeta. O gburu ha, wufuo ọbara ha nʼoge udo, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe e mere nʼagha. O jikwa ọbara ahụ merụọ ihe okike o kere nʼukwu na akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ.
6 你要憑你的明智行事,不要讓他平安無事,白頭下入陰府。 (Sheol h7585)
Ị bụ nwoke maara ihe, ị makwaara ihe ị ga-eme. Ekwela ka Joab, nʼagbanyeghị isi awọ ya, nwụọ nʼudo. (Sheol h7585)
7 至於基肋阿得人巴爾齊來人的子孫,你卻應該厚待他們,使他們列入你席上的食客,因為當我逃避你哥哥阿貝沙隆時,他們是怎樣的照顧了我。
“Ma meere ụmụ Bazilai onye Gilead ebere. Meekwa ka ha bụrụ ndị na-eso gị rie ihe na tebul gị nʼihi na ha ji obi ha zute m mgbe m na-agba ọsọ ndụ nʼihi nwanne gị Absalọm.
8 看,在你身旁還有巴胡陵地的本雅明人革辣的兒子史米,在我去瑪哈納殷那一天,他惡毒地咒罵了我;但是,後來他又下到約旦河來迎接我,當時我指著上主對他起誓說:我決不用刀處決你。
“Cheta Shimei, nwa Gera, onye Benjamin ahụ bi nʼobodo Bahurim, onye kọchara m nkọcha jọgburu onwe ya nʼụbọchị ahụ m jere Mahanaim. Mgbe ọ bịara izute m na Jọdan, eji m aha Onyenwe anyị ṅụọrọ ya iyi sị ya, ‘Agaghị m eji mma agha gbuo gị.’
9 現在,你可不要把他看作無罪的人,你既然明智,就該知道怎樣對付他,使他白髮染血,下入陰府。」達味逝世撒羅滿即位 (Sheol h7585)
Ma achọghị m ka ị hapụ ya dịka onye ikpe na-amaghị. Ị bụ nwoke maara ihe. Ị makwaara ihe ị ga-eme ya. Mee ka o jiri isi awọ ọbara juru baa nʼili.” (Sheol h7585)
10 達味與自己的列祖同眠,葬在達味城。
Emesịa, Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E liri ya na obodo Devid.
11 達味作以色列王四十年:在赫貝龍作王七年,在耶路撒冷作王三十三年。
Ma ọ chịrị Izrel iri afọ anọ; ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.
12 撒羅滿於是坐上了他父親達味的寶座,他的王國恨是鞏固。阿多尼雅自招殺身之禍
Solomọn nọdụrụ nʼocheeze nna ya Devid dịka eze. Alaeze ya guzosiri ike nke ukwuu. Ọchịchị ya gakwara nke ọma.
13 哈基特的兒子阿多尼雅來見撒羅滿的母親巴特舍巴,她問說:「你來這裏平安嗎﹖」阿多尼雅回答說:「平安。」
Otu ụbọchị, Adonaịja nwa Hagit, bịakwutere Batsheba, nne Solomọn. Mgbe Batsheba hụrụ ya, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụkwa ọbịbịa udo ka ị bịara?” Adonaịja zara sị ya, “E, abịara m nʼudo.”
14 繼而又說:「我有句話對你說。」巴特舍巴說:「請說罷!」
O kwuru sị, “O nwere ihe m nwere ịgwa gị.” Nne Solomọn zara sị ya, “Kwuo.”
15 他說:「你知道王國原該歸於我,全以色列都期待我為王。無奈王國反而歸於我的弟弟;當然,歸他是由於上主。
Ọ zara sị, “Dịka ị maara, ọ bụ m nwe alaeze a. Ndị Izrel niile lekwara anya na m ga-abụ eze ha. Ma otu ọ dị, ihe niile adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, alaeze a aghọọla nke nwanne m, nʼihi na o si nʼaka Onyenwe anyị rute ya aka.
16 現在,我要求你一件事,請你不要拒絕我! 」巴特舍巴對他說:「說罷! 」
Ugbu a, enwere m otu ihe m na-arịọ nʼaka gị. Biko ajụkwala imere m ya.” Batsheba sịrị ya, “Gịnị bụ arịrịọ gị? Kwuo ihe ọ bụ.”
17 阿多尼雅說:「我求你向撒羅滿說:將叔能的女子阿彼沙格給我為妻,因為他決不會拒絕你的請求。」
Ọ zaghachiri ya sị, “Biko rịọrọ m Solomọn eze, nʼihi na amaara m na ọ ga-eme ihe ọbụla ị rịọrọ ya, ka ọ kpọnye m Abishag, nwanyị Shunem ahụ, ka ọ bụrụ nwunye m.”
18 巴特舍巴說:「好! 我要為你請求君王。」
Batsheba zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m agwara gị eze okwu.”
19 巴特舍巴於是去見撒羅滿王,為阿多尼雅請求。君王遂起身迎接她,向她俯首致敬,然後坐在寶座上;又叫人為君王的母親另預備了一個座位,她便坐在君王的右邊。
Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya.
20 巴特舍巴說:「我要求你一件小事,請你不要拒絕我! 」君王對她說:「母親! 你求罷! 我決不拒絕。」
Ọ sịrị, “Enwere m arịrịọ nta m chọrọ ịrịọ gị. Ajụkwala i mere m ya.” Eze zaghachiri, “Rịọọ ya nne m. Agaghị m ajụ i mere gị ya.”
21 巴特舍巴說:「請你將叔能的女子給你哥哥阿多尼雅為妻。」
Ya mere ọ sịrị, “Biko, kwere ka enye nwanne gị nwoke Adonaịja Abishag nwanyị Shunem, ka ọ bụrụ nwunye ya.”
22 撒羅滿回答母親說:「你為什麼為阿多尼雅要求叔能的女子阿彼沙格呢﹖你為他要求王國罷! 因為他是我的哥哥,何況厄貝雅塔爾司祭和責魯雅的兒子約阿布又都擁護他。」
Eze Solomọn zara nne ya sị, “Gịnị mere i ji rịọọ m ka m nye Adonaịja naanị Abishag nwanyị Shunem ka ọ bụrụ nwunye ya? Ị gaara arịọkwa m sị m nye ya alaeze m. Nʼihi na ọ bụ ya tọrọ m” Ị gaara arịọkwa nʼihi Abịata onye nchụaja ma Joab nwa Zeruaya.
23 撒羅滿王便指著上主起誓說:「如果阿多尼雅說了這話,而不喪失性命,願上主嚴厲懲罰我,並加倍地懲罰我!
Mgbe ahụ, eze Solomọn ji Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na Adonaịja ejighị ndụ ya kwụọ ụgwọ nʼihi arịrịọ a.
24 上主支持我,使我坐上了我父親達味的寶座,照他所應許的,給我建立了王室,現在,我指著永生的上主起誓:阿多尼雅今天必該處死! 」
Ugbu a, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ mere ka m nọgidesie ike nʼocheeze nna m Devid, onye mere ka ọchịchị eze m malite dịka o kwere na nkwa, a ga-eme ka Adonaịja nwụọ taa.”
25 撒羅滿王便派約雅達的兒子貝納雅去殺了阿多尼雅;阿多尼雅便死了。厄貝雅塔爾被革職
Eze Solomọn zigara Benaya nwa Jehoiada ka ọ gaa gbuo Adonaịja. Benaya gakwara tigbuo Adonaịja.
26 此後,君王對於厄貝雅塔爾司祭說:「你回阿納托特,往你的莊田去罷! 你原是該死的人,但今天我不殺你,因為你曾在我父親達味面前,抬過吾主上主的約櫃,與我父親同受過一切艱苦。」
Eze kpọkwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Laghachi azụ nʼubi gị nʼAnatot. I kwesiri ịnwụ ọnwụ ma ọ bụghị ugbu a ka a ga-egbu gị nʼihi na i buru igbe ọgbụgba ndụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼoge nna m Devid dị ndụ. I sokwa ya hụọ ahụhụ nʼoge ahụ niile o nwere nsogbu.”
27 這樣,撒羅滿罷免了厄貝雅塔爾作上主的司祭,應驗了上主昔日在史羅指著厄里家族所說的話。約阿布被處決
Ya mere, Solomọn chụpụrụ Abịata ka ọ ghara ịbụ onye nchụaja Onyenwe anyị ọzọ. Otu a ka o si mezuo bụ okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru banyere ezinaụlọ Elayị na Shaịlo.
28 約阿布既然支持阿多尼雅,而沒有支持撒羅滿,他聽到了這消息,便跑到上主的會幕裏,抱住祭壇的角。
Ma mgbe Joab nụrụ na Adonaịja anwụọla, ọ gbaara ọsọ gaa nʼụlọ nzute Onyenwe anyị jigide mpi dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja aka. Ọ bụ ezie na Joab so Adonaịja gbaa izu imegide Solomọn, ma o soghị Absalọm gbaa izu imegide Devid.
29 有人報告撒羅滿王說:「約阿布逃到上主的會幕裏,站在祭壇旁。」撒羅滿就吩咐約雅達的兒子貝納雅說:「你去,將他殺死! 」
Mgbe a gwara eze Solomọn, na Joab a gbabala nʼụlọ ikwu Onyenwe anyị, nọdụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja. Solomọn nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu sị, “Gaa, tituo ya nʼala.”
30 貝納雅便到上主的會幕內,對約阿布說:「君王這樣吩咐:你出來罷! 」他回答說:「我不出去,我寧願死在這裏。」貝納雅回來向君王覆命說:「約阿布這樣說了,這樣回答了我。」
Benaya banyere nʼime ụlọ nzute Onyenwe anyị, sị Joab, “Eze sị gị, ‘pụta ezi!’” Ma ọ zara, “Mba, aga m anwụ nʼebe a.” Nʼihi nke a, Benaya jekwuru eze gwa ya ihe Joab kwuru.
31 君王對他說:「你就照他所說的去做:將他殺死埋掉,今天你即應從我身上,由我父家除去約阿布所流的無辜之血。
Mgbe ahụ, eze nyere Benaya iwu sị ya, “Gaa mee dịka o kwuru. Gbuo ya, liekwa ya. Nke a ga-eme ka ikpe ọmụma ghara ịdịrị mụ na ezinaụlọ nna m Devid nʼihi ikpe ọmụma dịrị Joab maka ọbara ndị aka ha dị ọcha ọ wụsiri.
32 上主必要使他所流的血歸到他頭上,因為他曾殺死了兩個比他更正義,更慈善的人。他用刀殺死了乃爾的兒子,以色列軍隊的統帥阿貝乃爾,和耶特爾的兒子,猶大軍隊的統帥阿瑪撒,這事我父親一點都不知道。
Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya.
33 他們的血要永歸在約阿布和他子孫的頭上;至於達味,他的後裔,他的家族,他的王位,必永遠享受遺上主而來的平安! 」
Ka ikpe ọmụma dị nʼihi igbu ọchụ ndị a dịkwasị Joab na ụmụ ụmụ ya nʼisi ruo mgbe ebighị ebi. Ma nʼebe Devid na ụmụ ụmụ ya, na ụlọ ya, na ocheeze ya dị, ka udo Onyenwe anyị dịkwasị ha ruo mgbe ebighị ebi.”
34 約雅達的兒子貝納雅就上去,殺了他,把他葬在他曠野中的家園。
Benaya nwa Jehoiada gara gbuo Joab. E liri ya nʼala nke ya dị nʼọzara.
35 君王遂委任約雅達的兒子貝納雅,代替約阿布統率軍隊,又委任匝多克司祭,代替厄貝雅塔爾。史米違命處死
Mgbe ahụ, eze họpụtara Benaya, nwa Jehoiada ka ọ bụrụ onyeisi ndị agha ya niile, ma mee Zadọk onye nchụaja nʼọnọdụ Abịata.
36 君王派人將史米召來,對他說:「你要在耶路撒冷為你建築一座房屋,住在那裏,不可從那裏出來,到任何地方去。
Emesịa, eze ziri Shimei ozi sị ya, “wuoro onwe gị ụlọ na Jerusalem, biri nʼebe ahụ, esitekwala nʼebe ahụ pụọ jee ebe ọbụla.
37 你應當知道:你那一天出來,渡過克德龍溪,你那一天就一定要死;你的血必歸在你頭上。」
Nʼihi na ụbọchị ị ga-apụ gafee iyi dị na Ndagwurugwu Kidrọn, mara nke ọma na ị ghaghị ịnwụ. Ọbara gị ga-adịkwa gị nʼisi.”
38 史米對君王說:「這話很好! 我主大王怎樣說,你的僕人就怎樣做。」史米於是常住在耶路撒冷。
Shimei zara eze, “Okwu gị dị mma. Ohu gị ga-eme dịka onyenwe m bụ eze kwuru.” Shimei biiri nʼime Jerusalem, nọọkwa ọtụtụ ụbọchị.
39 三年以後,史米的兩個僕人逃到瑪敖客的兒子,加特的君王阿基士那裏去了。有人告訴史米說:「你的僕人在加特。」
Ma nʼọgwụgwụ afọ atọ, ndị ohu abụọ Shimei nwere gbapụrụ ọsọ gbakwuru Akish, nwa Maaka, eze Gat. Ndị mmadụ bịara gwa Shimei sị ya, “Lee, ndị ohu gị nọ na Gat.”
40 史米便起來,備好自己的驢,往加特阿基士那裏,找他的僕人。史米去了,從加特帶回了自己的僕人。
Nke a mere ka o bilie, rịkwasị nʼelu ịnyịnya ibu ya, gaa Gat, jekwuru Akish nʼihi ịchọ ndị ohu ya. Shimei gara mee ka ndị ohu ya soro ya laghachite azụ.
41 有人告訴撒羅滿說:「史米從耶路撒冷去了加特,意回來了。」
Mgbe a gwara Solomọn na Shimei hapụrụ Jerusalem gaa Gat ma lọghachikwa azụ,
42 君王便派人將史米召來,對他說:「難道我沒有叫你指著上主起誓,預先警告你說:你應當知道:你那一天出去,不論到任何地方,你那一天就一定要死麼﹖你不是也對我說過:這話很好,我聽見了麼﹖
eze ziri ozi kpọọ Shimei sị ya, “Ọ bụ na m adọghị gị aka na ntị, jiri aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, ‘Mara nke ọma nʼụbọchị ọbụla ị ga-esi nʼebe a pụọ gaa nʼebe ọbụla ọzọ, na ị ga-anwụ?’ Nʼoge ahụ, ị zara m sị m, ‘Okwu gị dị mma. Aga m emekwa ya.’
43 為什麼你沒有遵守對上主的誓言和我吩咐你的命令﹖」
Ọ bụ gịnị mere i ji mebie iyi ị ṅụrụ nye Onyenwe anyị, jụkwa idebe ihe m nyere gị nʼiwu?”
44 君王又對史米說:「你心裏明白你對我父親達味所做的一切惡事,所以上主要將你的邪惡都歸在你頭上。
Eze gwakwara Shimei okwu sị ya, “I maara ihe ọjọọ niile i mere megide nna m Devid. Ugbu a Onyenwe anyị ga-akwụghachi gị ụgwọ nʼihi omume ọjọọ gị.
45 而撒羅滿王卻要蒙受祝福,達味的王權要在上主面前,永遠堅定不移! 」
Ma eze Solomọn ga-abụ onye a gọziri agọzi. Ocheeze Devid ga-eguzosikwa ike nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”
46 於是君王命令約雅達的兒子貝納雅出去,擊殺了史米,史米就死了。於是王國在撒羅滿治下纔算鞏固了。
Mgbe ahụ, eze nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu ka o gbuo Shimei. Ọ pụkwara tituo ya, ọ nwụọ. Sitekwa nʼoge ahụ, alaeze Solomọn guzosiri ike nʼaka ya.

< 列王紀上 2 >